Folake Akinyemi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Folake Akinyemi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNorway Dezie
aha ezinụlọ yaAkinyemi Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya31 Maachị 1990 Dezie
Ebe ọmụmụLagos Dezie
Ọrụ ọ na-arụasọmpi egwuregwu Dezie
ụdị egwuregwuegwuregwu Dezie

Folake Akinyemi (a muru n'ụbọchị nke 31 n’ime onwa Maachị nke afọ 1990) bu onye Naijiria na 0nye Nọọwe na-eme egwuregwu ị gba ọsọ mita 100 na 200 nke lagoro ezumike nka.

A muru ya na Legọs . Nwa nke kwere nkwa, o mechara n'ọkwa nke anọ n'ọsọmita 100 na 2007 European Youth Olympic Festival, na 2009 European Junior Championship, o meriri ma rite ọla ọcha n'ọsọ mita 100 were mechaa n'ọkwa nke isii n'ọsọ mita 200. O sonyekwara na 2006 World Junior Championship (relay only), 2007 European Junior Championship (naanị 100) na 2008 World Junior Championship (mita 100 na 200) na 2011 European U23 Championship (mita 100 na 200 ) na-erughị na njedebe .

N'ime egwuregwu ndị megoro agadi, ọ gbara asọmpi nke European European Indoor Championship n'afọ 2009, 2010 World Indoor Championship, 2010 European Championship, 2012 European Championship na 2013 European Indoor Championship na -erughị na njedebe. [1] Na njem ikpeazụ ya na mba ụwa, o ruru ọkara ikpeazụ nke mita 100 na 2013 Summer Universiade. Kemgbe, ọ lara ezumike nká n'ihi mmerụ ahụ.

Oge kachasị mma ya bụ 7.36 sekọnsụ n'ọsọ mita 60 (n'ime ụlọ), ọ rụzuru n'ọnwa Febụwarị nke afọ 2009 na Florø ; 11.46 sekọnsụ n'ọsọ mita 100, o nwetara n'ọnwa Juun nke afọ 2012 na Florø; na 23,61 sekọnsụ n'ọsọ mita 200, o nwetara n'ọnwa Julaị nke afọ 2010 na Donnas,dị na Ịtali . [2] Ọ nọchitere anya klọb IL na BUL na SK Vidar tupu ọ banye na IK Tjalve tupu oge afọ 2014, [3] oge mgbe o riteghị ihe ọ bụla.

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. A. Norwegian Athletics. Retrieved on 7 August 2017.
  2. All-Athletics.com profile. Archived from the original on 2017-08-07. Retrieved on 2020-11-18.
  3. "Folake Akinyemi til Tjalve" (PDF), Tjalvisten, p. 17. Retrieved on 7 August 2017. (in Norwegian)