Gabrielle Civil
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Aha enyere | Gabrielle |
| Aha ezinụlọ ya | Civil |
| Ebe ọmụmụ | Detroit |
| Ọrụ ọ na-arụ | performance artist, onye nkuzi, odee akwụkwọ |
| Ebe agụmakwụkwọ | University of Michigan, New York University |
| Ebe obibi | Detroit |
| Webụsaịtị | https://www.gabriellecivilartist.com/ |
Gabrielle Civil bụ ónyé America na-eme ihe nkírí, onye na-ede uri, na ónyé nkuzi.[1]
Mmalite na agụmakwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]Civil sitere na Detroit, Michigan.[2] Site na 1991 ruo 1995 ọ gàrà Mahadum nke Michigan, ébé ọ gụsịrị akwụkwọ na nsọpụrụ dị elu na ma édémédé okike na Comparative Literature.[3] Mgbe e mesịrị, Civil gara Mahadum New York maka nzere masta ya na nzèrè doctorate ya. Ọ natara M.A. ya na akwụkwọ ntụnyere n'afọ 2000.[3] Akwụkwọ edemede ya, From Body to Nation: Reading Black Women's Poetry in the United States, Haiti & Canada, lekwasịrị anya na uri nke ụmụ nwanyị ojii na United States, Canada na Haiti. Ihe ndị Civil lekwasịrị anya gụnyere Black Feminist Theory; African-American Literature; Experimental World Poetry.[3]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Civil malitere ọrụ nkụzi ya na-akụzi ógè okpomọkụ na Bard College, Annandale-on-Hudson, na New York. Ọ kụziri "atụmatụ maka ihe ọmụma a na-etinye n'ime" site na Language & Thinking 2002, 2004, 2005, 2006.[3] Mgbè ógè okpomọkụ ya na Bard College gasịrị, Civil kụziri "Women and Voice: Black Women and Performance" na Macalester College site na 2005 ruo n'oge oyi nke afọ 2006.[3] Ọ laghachiri na Bard College, wee kụzie màkà Bard College Prison Initiative, "Language & Thinking, Eastern Maximum Security Correctional Facility," n'oge ọkọchị nke afọ 2011.[3] Ọ kụziri na Mahadum St. Catherine na St. Paul, Minnesota, site na 2000 ruo 2013 dị ka prọfesọ na-arụ ọrụ na Bekee, ọmụmụ ụmụ nwanyị, na Critical Studies of Race and Ethnicity.[3] Site na 2013 ruo 2016, ọ bụ osote prọfesọ nke arụmọrụ na Antioch College na Yellow Springs, Ohio.[4] Ọ na-akụzi ugbu a dị ka ónyé ọbịa na Jack Kerouac School of Disembodied Poetics na Mahadum Naropa na Boulder, Colorado.[5]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Civil na-akọwa onwé ya dị ka ónyé ojii, onye na-ese ihe gbasara ụmụ nwanyị nke ebumnuche ya bụ "ịmeghe oghere".[6] Ọ na-arụ ọrụ n'onwe ya na mmekorita ma gosipụta ihe karịrị 40 performances na North America na mba ofesi.[7]
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- 1 2 3 4 5 6 7 Civil, Gabrielle. "CV" (PDF). Retrieved May 6, 2017.
- ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- ↑ "Naropa University, Jack Kerouac School of Disembodied Poetics | Poets & Writers". www.pw.org (in Bekee). Retrieved March 12, 2017.
- ↑ Yohannes, Neyat (February 23, 2017). "Portrait of the Artist as a Young Feminist: Gabrielle Civil". Chicago Review of Books. Retrieved March 12, 2017.
- ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).