Gabros Stadium

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Gabros Stadium
ama-egwuregwu
mba/obodoNaijiria Dezie
nhazi ọnọdụ5°58′49″N 6°54′7″E Dezie
Map

 

Ama egwuregwu Gabros bụ ámá egwuregwu nwere ike ịnabata puku mmadụ atọ. Ọ dị na Nnewi, Nigeria, n'akụkụ ụlọ nkwari akụ Beverly Hills. Ọ bụ ebe egwuregwu nke Gabros International ma bụrụ ụlọ nwa oge mke Anambra United FC

Esemokwu[dezie | dezie ebe o si]

Ka e mesịrị Chief Gabriel Chukwuma resịrị Dr. Patrick Ifeanyi Ubah ụlọ egwuregwu bọọlụ Gabros na ámá egwuregwu ya. [1] [2] Na ama egwuregwu a ka emere egwuregwu bọọlụ NFPL Izu nke irii. [2] Agbanyeghị nke a, Chief Gabriel Chukwuma siri ọnwụ na ọ nweghị mgbe oji ree ama egwuregwu ahụ. [3] Ọ kwukwara na Dr. Patrick Ifeanyi Ubah kwụrụ ụgwọ naanị maka klọb bọọlụ ọ bụghị maka ámá egwuregwu dịka ihe dị iche. [4]

N'ọnwa Disemba n'afọ 2015, Ụlọikpe Kasị Elu nke Federal Capital Territory (FCT) gbochiri Chief Gabriel Chukwuma itinye aka na ikike Dr. Patrick Ifeanyi Ubah na FC Ifeanyi Ubah mgbe Chief Gabriel Chukwuma kwuru na ọ ga ewere kwa klọb bọọlụ ahụ iji rụọ ọrụ ma wee sonye na Njikọ Ọkachamara bọọlụ nke Nigeria (NPFL). . [5]

Ntụrụaka[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. Individuals transforming their towns without waiting for govt (en-US). Punch Newspapers. Retrieved on 2021-01-03.
  2. 2.0 2.1 I took over Gabros FC to provide employment for Nigerian youths’ (en-US). guardian.ng. Retrieved on 2021-01-03.
  3. Stop calling my property Ifeanyi Ubah stadium, says Gabros (en-US). Vanguard News (2021-06-26). Retrieved on 2021-08-02.
  4. Awka_media (2021-07-29). Senator Ifeanyi Ubah And Chief Gabros Chukwuma Bicker Over Ownership Of Stadium. (en-US). Awkamedia. Archived from the original on 2021-08-02. Retrieved on 2021-08-02.
  5. Blueprint (2015-12-22). Abuja Court restrains Gabros from prying with FC Ifeanyi Ubah | Blueprint Newspapers Limited (en-US). Retrieved on 2021-01-03.