Gass Forest Museam

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ


Gass Forest Museam
forestry museum
Oge/afọ mmalite1902 Dezie
mba/obodoNdia Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaCoimbatore Dezie
nhazi ọnọdụ11°0′49″N 76°56′45″E Dezie
Map

Gass Forest Museum bụ ụlọ ngosi nka nke gọọmentị na-ahụ maka akụkọ ihe mere eme nke dị na Coimbatore, Tamil Nadu, nke obodo India.

Akụkọ ihe mere eme[dezie | dezie ebe o si]

Foto nke onye guzobere ya, Horace Arichibald Gass, na ebe ngosi ihe mgbe ochie

Ka ọ na-erule ngwụcha narị afọ nke iri na itoolu, J. A. Gamble, onye na-elekọta ọhịa maka ndi Madras Presidency, mere mgbalị a kwụsịrị iji guzobe ebe ngosi nka ọhịa na mpaghara ahụ. Afọ ole na ole ka e mesịrị n’afo 1902, onye nọchiri Gamble dịka Conservator of Forests Horace Arichibald Gass nwere ihe ịga nke ọma n'ịtọlite ebe ngosi nka maka ọhịa. Baron Ampthill, Gọvanọ Madras n'oge ahụ, meghere ya maka ọha na eze na 15 Eprel 1902, n'oge a na-akpọ ya Forest Museum na Coimbatore. Mgbe Gass, onye nlekọta mbụ, lara ezumike nká n’afo 1905, onye nọchiri anya ya bù F. A. Lodge gbanwere aha ebe ngosi ihe mgbe ochie iji sọpụrụ ya. A gbasaa ya n’afo 1905 na afo 1915. N'afọ 1912, e guzobere Madras Forestry Koleeji (nke bụ Tamil Nadu Forest Academy ugbu a) n'ebe ngosi ihe mgbe ochie iji zụọ ndị na-azụ ọhịa. N'oge afo 1942-47, e mechiri ebe ngosi ihe mgbe ochie ahụ ma jiri ụlọ ndị ahụ mee ihe dị ka ebe mgbaba maka ndị si Malta na Gris gbapụ na Agha Ụwa nke Abụọ. Mgbe India nweere onwe ya na 1947, ebe ngosi ihe mgbe ochie ahụ nọ n'okpuru ọchịchị Gọọmentị Tamil Nadu. Ọ bụ Institute of Forest Genetics and Tree Breeding (IFGTB) na-achịkwa ya ugbu a, nke dị n'otu ogige ahụ.[1][2] E meghere ebe ngosi ihe mgbe ochie ahụ maka ọha na eze na 1 Mee 2015 mgbe ọ rụchara ọrụ nrụzigharị.[3] A gbakwunyere diorama 3D na-egosi anụ ọhịa na ebe obibi nke ya.

Ebe[dezie | dezie ebe o si]

Ebe ngosi nka ahụ dị na Forest Koleeji Kampus, nke dị na Cowley Brown Road n'etiti obodo Coimbatore. Ogige ahụ nwekwara ụlọ ọrụ ndị ọzọ dịka Tamil Nadu Forest Academy (TNFA), Institute of Forest Genetics and Tree Breeding, Central Academy for State Forest Service (CASFoS) ya na ulo oru ndị ọzọ nke Ngalaba Ọhịa Tamil Nadu.[4][1]

Ihe ngosi[dezie | dezie ebe o si]

Ụfọdụ n'ime ihe atụ ndị e debere na ebe ngosi ihe mgbe ochie a gunyere:

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 "The natural witness", The Hindu, 19 October 2009. Retrieved on 8 August 2010. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "hindu" defined multiple times with different content
  2. History of Gass Museum. Gass Forest Museum. Institute for Forest Genetics and Tree Breeding. Archived from the original on 9 July 2011. Retrieved on 8 August 2010.
  3. Gass Forest Museum to open again | Coimbatore News - Times of India. The Times of India.
  4. Tamil Nadu Forest Academy