Gerson Gu-Konu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Gerson Gu-Konu

Gerson Gu-Konu, nke a na-akpọkwa Gerson Konu, ezigbo aha ya bụ Kwadzo Gaglo Gù-Konu (1932−2006), bụ onye na-ahụ maka udo na ikike mmadụ na onye otu ndị omeiwu nke Togo.[1][2]

Amụrụ Gerson Gu-Konu n'afọ 1932 na Kuma-Adame, na Southwest nke Togo. Ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị na Kpalime. Ọ gara n'ihu na agụmakwụkwọ sekọndrị ya ruo afọ 1949 na Collège moderne de Lomé (nke a maara dị ka Petit Dakar n'oge ahụ). Ọ malitere ndụ ọrụ ya dị ka onye nkuzi maka Evangelical Mission, nke mbụ na Kpalime, mgbe ahụ na Lomé ruo afọ 1954 tupu ọ laghachi Kpalime ebe ọ gara n'ihu na-akụzi na Collège Espoir ruo afọ 1956.[3]

N'afọ 1955, o guzobere otu a na-akpọ na French Les Volontaires au travail (LVT) - Ndị ọrụ afọ ofufo na-arụ ọrụ. N'afọ 1957, ọ chọpụtara ogige ọrụ afọ ofufu mba ụwa na Ghana, ma nụ oge mbụ banyere Service Civil International (SCI).[4]

N'afọ 1960, Togo nwere onwe ya ma họpụta Gerson Gu-Konu ka ọ bụrụ onye omeiwu maka mpaghara Kpalimé. Ọ kwadoro onye isi ala mbụ Sylvanus Olympio.[5] Mgbe nnupụisi nke afọ 1963 gasịrị, na ogbugbu nke Onye isi ala Olympio, e jidere Gerson Gu-Konu ma mekpọọ ya ọnụ. A tọhapụrụ ya afọ anọ ka e mesịrị n'ihi arịrịọ nke Amnesty International (AI) na International Voluntary Service (IVS), alaka Britain nke SCI. Ọ gbagara France ebe ọ chọtara ọrụ n'ọfịs SCI Paris, wee bụrụ onye otu ndị ọrụ. Site n'afọ 1970 ruo afọ 1978 ọ bụ SCI International Secretary maka West Africa.[4]

N'afọ 1978, ọ gara rụọ ọrụ na International Secretariat nke Amnesty International na London. Ọ bụ onye na-ahụ maka mmepe na nkwado nke alaka AI na Africa. N'oge niile ọ chụgara ya, ndị ọchịchị na Togo yiri ya egwu, ọ pụghị ọbụna ileta ala nna ya. Ọ dara ezigbo ọrịa, mgbe ọ lara ezumike nká, ọ na-eke oge ya n'etiti London na Ho, obere obodo dị na Ghana na-adịghị anya site na ókèala Togo.[4]

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. Watt (2006-08-30). Obituary: Gerson Gu-Konu (en). the Guardian. Retrieved on 2021-04-03.
  2. Terretta (2016-02-01). "Gregory Mann. From Empires to NGOs in the West African Sahel: The Road to Nongovernmentality.". The American Historical Review 121 (1): 341–342. DOI:10.1093/ahr/121.1.341. ISSN 0002-8762. 
  3. Boccovi (2006-11-26). Togo: Hommage à Gerson Kadzo Gu-Konu (fr). www.letogolais.com. Retrieved on 2021-04-04.
  4. 4.0 4.1 4.2 Gerson Konu - Archives of Service Civil International. archives.sci.ngo. Retrieved on 2021-04-03. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  5. Max Hildesheim - Archives of Service Civil International. archives.sci.ngo. Retrieved on 2021-04-03.