Jump to content

Gertrude Webster Kamkwatira

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Gertrude Webster Kamkwatira
mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
aha enyereGertrude Dezie
ụbọchị ọmụmụ ya1966 Dezie
Ebe ọmụmụMalawi Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya2006 Dezie
ọrụ ọ na-arụomee Dezie

Gertrude Webster Kamkwatira (c. 1966), bụ onye Malawi na-ede egwuregwu, onye nduzi na onye na-eme ihe nkiri.

A mụrụ Kamkwatira n'ihe dịka afọ 1966. Ọ ghọrọ onye nduzi nke Wakhumbata Ensemble Theatre n'afọ 1999 mgbe onye guzobere ya, Du Chisiza nwụsịrị.[1] O mechara "gbapụ" n'òtù ahụ wee guzobe otu ihe nkiri Wanna-Do. Ọnọdụ ndị o nwere gụnyere Onye isi oche nke National Theatre Association of Malawi na Onye isi oche of the Copyright Society of Malawi.[2][3]

Kamkwatira dere ihe dịka egwuregwu iri na atọ n'asụsụ Bekee, gụnyere It's My Fault, nke na-ekwu maka ime ihe ike n'ụlọ na mmegbu mmekọahụ, Jesus' Retrial na Breaking the News, egwuregwu gbasara ịlụso ọrịa AIDS ọgụ.[4][5][6][7] N'ajụjụ ọnụ a gbara ya n'afọ 2003, o kwuru na ọ ga-anọkarị otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ na-ede egwuregwu, wee gaa n'ihu na-arụ ọrụ na ya ruo izu atọ ọzọ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ya na onye nchịkọta akụkọ ga-ekwurịta ya tupu ọ gosi ya ndị na-eme ihe nkiri. Onye ọ bụla na-eme ihe nkiri ga-agụ ma ghọta egwuregwu ahụ dịka nzọụkwụ mbụ na usoro mmega ahụ.[8]

Ọrụ ime ihe nkiri ya malitere mgbe e nwere ọtụtụ ụmụ nwanyị na-eme ihe nkiri na Malawi. N'afọ 1987, ọ ga-arụ ọrụ n'egwuregwu atọ n'otu oge n'ihi na W makhata nwere ụmụ nwanyị ole na ole na-eme ihe nkiri.[8]

Ọ nwụrụ n'afọ 2006 mgbe ọ dị afọ iri anọ. E liri ya n'ụlọ ya na Lisungwi, mpaghara Neno.[7]

Edemsibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Martin Banham (13 May 2004). A History of Theatre in Africa. Cambridge University Press. ISBN 978-1-139-45149-9. 
  2. John Chirwa, Tracing Du Chisiza's children, The Nation (Malawi), 29 December 2015. Archived from the original on 20 October 2020. Retrieved on 27 June 2022.
  3. Sam Banda, Cosoma AGM, The Times of Malawi, 11 August 2015
  4. African Books Collective: Beyond the Barricades. www.africanbookscollective.com. Archived from the original on 2018-05-06. Retrieved on 2018-05-05.
  5. Martin Banham (2013). Shakespeare in and Out of Africa. Boydell & Brewer Ltd. ISBN 978-1-84701-080-3. 
  6. Mufunanji Magalasi (2001). Beyond the barricades: a collection of contemporary Malawian plays. Chancellor College Publications. 
  7. 7.0 7.1 Die Welt, 6 April 2012, Theater Konstanz zeigt malawisches Stück
  8. 8.0 8.1 Magalasi (2008). "Malawian Popular Commercial Stage Drama: Origins, Challenges and Growth". Journal of Southern African Studies 34 (1): 161–177.