Gizo (akụkọ ifo)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Gizo, nke a makwaara dịka Gizzo, bụ onye aghụghọ ududo nke dị n'okpukpe ọdịnala nke ndị Hausa, ndị dị na mpaghara Sahelian ma nwee ọnụ ọgụgụ buru ibu na Naijiria, Niger, Ivory Coast, na Benin.[1] Dị ka ọtụtụ ihe ngosi ọdịbendị nke ududo n'akụkọ ifo Afrịka, Gizo bụ dike n'akụkọ ifo.[2][3]

.[4]

Akụkọ ifo[dezie | dezie ebe o si]

Enyi, Enyi Mmiri, na Ududo.[dezie | dezie ebe o si]

Ụkọ nri malitere otu ugboro, Gizo, yana ezinụlọ ya, nọkwa n'agụụ nke ukwuu. Ya mere, Gizo gara n'ebe enyí nọ, onye a na-ewere dịka onye nwe ala niile. Gizo gwara enyí ahụ, na-ekwu na onye nwe mmiri, enju mmiri ahụ chọrọ ka enyinyo ahụ zitere ya otu narị nkata ọka. Na mgbanwere, enyí mmiri ga-ezigara enyi ahụ nnukwu ịnyịnya. Enyí ahụ amaghị na Gizo na-agha ụgha, ya mere o nyere ya ọka ahụ.[1]

Mgbe o nwesịrị ihe ịga nke ọma na mgbalị mbụ ya, Gizo gakwuuru enyí mmiri n'oge a. Ọ rịọrọ otu narị nkata azụ maka enyí ahụ. Na nzaghachi, enyí ga-enweta nnukwu ịnyịnya site n'aka enjyi mmiri. N'ezie, Gizo na-agha ụgha nye enyí mmiri - mana ọ bụghị onye maara ihe.[1]

N'ikpeazụ, ma enyí Ḿmírí ma enyi ahụ rịọrọ Gizo maka ịnyịnya ha. Ya mere, Gizo chepụtara aghụghọ: Ọ gwara ndị isi obodo abụọ na ọ dị mkpa ijide ịnyịnya ọhịa. Nanị ihe ha ga-eme bụ ịdọrọ eriri nke Gizo tinyere n'aka ha. N'amaghị ama ha, Gizo kwukwara otu ihe ahụ maka enyí na enyi mmiri ahụ; ya mere, ndị otu atọ ahụ mechara na-adọkpụ eriri ahụ n'akụkụ nke ha gasị, n'amagyeghị ihe merenụ.[1]

N'ezie, n'ikpeazụ, ma enyí mmiri ma enyi ahụ chọpụtara aghụghọ ahụ. Gizo gbapụrụ ma zoo n'iwe ha. Otú ọ dị, ọzọ, agụụ mere ya ihe o wee gbapụta ebe o zoro. Iji jide n'aka na a gaghị amata ya, Gizo weere akpụkpọ anụ mgbada ma mee ka ọ bụ otu. O nwekwara ihe ịga nke ọma: Ọ bụ ezie na enyí na anyị mmiri zutere ya, ọ dịghị onye nwere ike ịmata ya.[1]

Edemsibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 Lynch (2010). African Mythology, A to Z (in en). Infobase Publishing. ISBN 978-1-4381-3133-7.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  2. Tremearne (2014-01-02). Hausa Superstitions and Customs: An Introduction to the Folk-Lore and the Folk (in en). Routledge. ISBN 978-1-136-96973-7. 
  3. Skinner (2019-06-03). Hausa Tales and Traditions: An English Translation of Tatsuniyoyi Na Hausa Originally Compiled by Frank Edgar (in en). Routledge. ISBN 978-0-429-64801-4. 
  4. Tremearne (1913). Hausa superstitions and customs: an introduction to the folk-lore and the folk, Gerstein - University of Toronto, London, Bale.