Godfrey Okoye
Godfrey Mary Paul Okoye, ⓘ C.S.Sp. (Ubochi nke iri na iteghete nke onwa Disemba na afo 1913 ruo17ubochi nke iri na asaa n'onwa Machị nke afo1977)O bụ bishọp nke Chọọchị Roman Katọlik na Naịjirịa. Ọ bụ Bishọp mbụ nke obodo Port Harcourt, na-eje ozi site na ubochi nke ato n'onwa Septemba nke afo1961 ruo ubochi nke asaa n'onwa Machị nke afo 1970. Mgbe ọ hapụsịrị diocese nke Port Harcourt, ọ ghọrọ Bishọp nke abụọ nke Enugu, nọchiri Bishọb John Cross Anyogu.
Akụkọ ndụ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Okoye na ubọchi nke iri na iteghete nke onwa Disemba na afo1913 nye Okoye Nwazulu na Ada Oji na Ifitedunu na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke Nigeria, ugbu a bu Anambra Stati.[1] Most Rev. Dr. Charles Heerey, Achịbishọp nke Onitsha, na ubochi nke iri abuọ na asaa nke onwa Julaị na afo1947.[2] N'afọ 1950, ọ ghọrọ naanị onye ụkọchukwu Igbo nke abụọ a nabatara n'ime ọgbakọ nke Mmụọ Nsọ.[3] Okoye tinyere aka nke ukwuu n'ihe omume gbasara Agha Obodo Naịjirịa, nkwado ya doro anya maka Biafra mere ka ndị ụkọchukwu ibe ya nwee nchegbu na a ga-elekwasị ha anya na Naịjirị.[4] Onye na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ Adrian Hastings kọwara Okoye dị ka "onye Biafra na-anụ ọkụ n'obi".[5] N'afọ 1977, obere oge tupu ya enwee Iwa ahu hainia, Okoye bibiri faịlụ nke onwe ya na-akọwapụta itinye aka ya n'agha ahụ. Ọ nwụrụ obere oge ka ịwa ahụ gasịrị.[6]
Hụkwa
[dezie | dezie ebe o si]
Ebemside
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Amadi (1995). Bishop G.M.P. Okoye : his life, his times. Lagos: Everlead Communications. ISBN 9789783336711.
- ↑ Our Founder. Daughters of Divine Love Congregation. Archived from the original on 10 August 2016. Retrieved on 27 April 2016.
- ↑ Okwu (2010). Igbo Culture and the Christian Missions, 1857-1957: Conversion in Theory and Practice. Rowman & Littlefield. ISBN 9780761848844.
- ↑ Omenka (2010). "Blaming the Gods: Christian Religious Propaganda in the Nigeria-Biafra War". Journal of African History 51 (3): 367-389. DOI:10.1017/S0021853710000460.
- ↑ Hastings (1979). A History of African Christianity 1950-1975. Cambridge University Press. ISBN 9780521293976.
- ↑ Emenyonu (2000). "Nationalism and the Creative Talent", Goatskin Bags and Wisdom: New Critical Perspectives on African Literature. ISBN 9780865436718.