Grace Kwami

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Grace Salome Kwami (1923), bụ onye Ghana na-ese ihe na onye nkuzi.[1]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Kwami na 1923 na Worawora, obodo dị na mpaghara Volta nke Ghana (Gold Coast n'oge ahụ).[2] Ọ debara aha ya na Basel Mission's Women Teachers' Training College na Agogo. Ọ gara n'ihu na Kumasi College of Arts (nke bụzi Kwame Nkrumah University of Science and Technology) n'afọ 1951, ebe ọ gụrụ nka.[1]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Sayensị na Teknụzụ Kwame Nkrumah, National Museum were ya n'ọrụ ebe ọ rụrụ ọrụ dị ka onye na-ese ihe site na 1954 ruo 1957. O mechara rụọ ọrụ dị ka onye nkuzi na Mawuli School na Tamale Teachers' Training College site n'afọ 1957 ruo afọ 1978.[1]

Ihe ngosi[dezie | dezie ebe o si]

Nkà Kwami bụ n'ihe ọkpụkpụ, eserese na ọla. A na-edozi ọrụ ya na nchịkọta ma gosipụta ya na National Museum of Ghana, Volta Regional Museum, na Ghana Museums and Monument Board.[1]

Ndụ onwe ya[dezie | dezie ebe o si]

Kwami lụrụ Robert Kwami na 1954. Ọ bụ nne onye na-ese ihe Atta Kwami.[3][4] Ọ nwụrụ na 2006.[5]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 SPLA | Grace Salome Kwami (en). Spla. Retrieved on 2021-03-20.
  2. (1997) The Arts of Africa: An Annotated Bibliography : With Omissions from 1986 Through 1991 (in en). African Studies Association Press. ISBN 978-99928-28-47-2. 
  3. Kwami (1995). A GALLERY BROCHURE FOR YOUNG PEOPLE. Smithsonian Institution. 
  4. Aidoo (1981-01-16). The Mirror: Issue 1410, January 16 1981 (in en). Graphic Communications Group. 
  5. Grace Kwami Sculpture (en). library.si.edu (2015). Retrieved on 2021-03-20.