Grace Oyelude

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Grace Oyelude
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereGrace Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya16 Novemba 1931 Dezie
Ebe ọmụmụKano Dezie
Ọrụ ọ na-arụnurse Dezie
ebe agụmakwụkwọSt Thomas's Hospital Medical School Dezie
mmeriNwaanyị Naịjirịa Dezie

Grace Atinuke (a mụrụ n'ụbọchị nke 16 nke onwa Nọvemba n’afọ 1931) ka a maara bụ Miss Nigeria nke izizi n’afọ 1957. [1] [2] [3] [4]

Mbido ndụ[dezie | dezie ebe o si]

Oyelude bu onye a mụrụ na Kano nye James Adeleye Olude na Marthan Dantu nke Isanlu dị na Kogi Steeti, ma zụlite na mpaghara ugwu nke Naijiria. Ọ gara ụlọ akwụkwọ praịmarị na nke sekọndrị n'etiti afọ 1940 na 1952 na Kano. 

Miss Nigeria[dezie | dezie ebe o si]

Miss Nigeria bidoro n'afọ 1957 dika asọmpi foto. Ndị na-asọ mpi ahụ gosipụtara foto nke ha n'isi ụlọ ọrụ Daily Times dị na Legọs ebe edepụtara ndị ruru agba nke ikpeazụ. E mechara kpọọ ndị ruru agba nke ikpeazu i soro asọmpi na-egosi ka ọ na-eme na Lagos Island Club . N'oge ahụ, asọmpi Miss Nigeria agụnyeghị asọmpi i gwu mmiri. Oyelude na-arụbu ọrụ na UAC mgbe ọ nọchitere mpaghara ugwu ahụ. Mgbe o meriri n'asọmpi ahụ, ọ gara Ịngland ebe ọ gụrụ Nọọsụ. N’ime ọnwa ole na ole a nabatachara ya n'ụlọ akwụkwọ ndị nọọsụ dị na Ashford, e chiri ya Miss Nigeria. 

Ọrụ nọọsụ[dezie | dezie ebe o si]

Oyelude ghọọrọ onye State Registered Nurse n'afọ 1961 were bụrụ onye ruru ọkwa midwaịfụ SCM (NRM) n'afọ 1962 mgbe ọ gụsịrị ọzụzụ na St. Thomas' Hospital,dị na Lọndọn . [5] Ọ gara Royal College of Nursing,nke Ịngland n'afọ 1971 [6] were nweta diplọma nke Nọsịn na nchịkwa ụlọ ọgwụ (DNHA). N’ụlọ akwụkwọ na-ahụ maka njikwa na nchịkwa ndị mmadụ na Gana, ọ gụsịrị akwụkwọ maka diplọma ọzọ.

Na United Kingdom, Oyelude rụrụ ọrụ n'ọtụtụ ụlọ ọgwụ gụnyere Paddington General Hospital, otu n'ime ụlọ ọgwụ ndị dịbu na St Mary's Hospital, London . Mgbe ọ laghachiri Naịjirịa, ọ rụrụ ọrụ na nnukwu ụlọ ọgwụ dị na Kaduna n’agbata afọ 1964 na 1965. Ọ rụrụ ọrụ dịka siniọ nọsịn sista-in-chaj ụlọ nọsịn mbụ ndị Kaduna (nke bụzi ụlọ ọgwụ ọkachamara nke Barau Dike,na Kaduna) site n'afọ 1965 ruo 1977. Mgbe agha obodo Naịjirịa bidoro n’afọ 1967, ọ kwagara n’ụlọ ọgwụ izugbe dị na Markurdi. Oyelude duuru otu ndi si na mpaghara ugwu; otu nke nyeere ụlọ ọgwụ aka ị dị njikere ị gwọ ndị merụrụ ahụ n'agha. Na mbido afọ 1970, ọ rụrụ ọrụ dịka onye isi na-elekọta ma na-atụzi ọrụ nọọsụ na ụlọọgwụ nkuzi nke Mahadum nke Ahmadu Bello, mgbe ọ batara na Institute of Health,nke Mahadum nke Ahmadu Bello. O ji aka ya laa ezumike nká na ọkwa ahụ n'afọ 1985. Ọ bụkwa onye nnyocha ule nke ezi nke Nursing and Midwifery Council of Nigeria. Ọ bụ onye isi oche nke Kwara State Health Management Board site n'afọ 1980 ruo 1983. [7]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Oyelude ji ọkwa ọchịchị ya bụ Iyaolu of Isaluland na Iyalode of Okunland . O nwere ọtụtụ ụmụ ụmụ. [6]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]