Gaa na ọdịnaya

Grace Oyelude

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Grace Oyelude
mmádu
Ụdịekerenwanyị Dezie
Mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereGrace Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya16 Novemba 1931 Dezie
Ebe ọmụmụKano Dezie
Ọrụ ọ na-arụnurse, Nwaanyị Naịjirịa Dezie
Ebe agụmakwụkwọSt Thomas's Hospital Medical School Dezie
Ihe omume dị ịrịba amabeauty pageant winner Dezie
Asọmpi meririNwaanyị Naịjirịa Dezie

Grace Atinuke (a mụrụ n'ụbọchị nke 16 nke onwa Nọvemba n’afọ 1931) ka a maara bụ Miss Nigeria nke izizi n’afọ 1957. [1] [2] [3] [4]

Mbido ndụ

[dezie | dezie ebe o si]

Oyelude bu onye a mụrụ na Kano nye James Adeleye Olude na Marthan Dantu nke Isanlu dị na Kogi Steeti, ma zụlite na mpaghara ugwu nke Naijiria. Ọ gara ụlọ akwụkwọ praịmarị na nke sekọndrị n'etiti afọ 1940 na 1952 na Kano. 

Miss Nigeria

[dezie | dezie ebe o si]

Miss Nigeria bidoro n'afọ 1957 dika asọmpi foto. Ndị na-asọ mpi ahụ gosipụtara foto nke ha n'isi ụlọ ọrụ Daily Times dị na Legọs ebe edepụtara ndị ruru agba nke ikpeazụ. E mechara kpọọ ndị ruru agba nke ikpeazu i soro asọmpi na-egosi ka ọ na-eme na Lagos Island Club . N'oge ahụ, asọmpi Miss Nigeria agụnyeghị asọmpi i gwu mmiri. Oyelude na-arụbu ọrụ na UAC mgbe ọ nọchitere mpaghara ugwu ahụ. Mgbe o meriri n'asọmpi ahụ, ọ gara Ịngland ebe ọ gụrụ Nọọsụ. N’ime ọnwa ole na ole a nabatachara ya n'ụlọ akwụkwọ ndị nọọsụ dị na Ashford, e chiri ya Miss Nigeria. 

Ọrụ nọọsụ

[dezie | dezie ebe o si]

Oyelude ghọọrọ onye State Registered Nurse n'afọ 1961 were bụrụ onye ruru ọkwa midwaịfụ SCM (NRM) n'afọ 1962 mgbe ọ gụsịrị ọzụzụ na St. Thomas' Hospital,dị na Lọndọn . [5] Ọ gara Royal College of Nursing,nke Ịngland n'afọ 1971 [6] were nweta diplọma nke Nọsịn na nchịkwa ụlọ ọgwụ (DNHA). N’ụlọ akwụkwọ na-ahụ maka njikwa na nchịkwa ndị mmadụ na Gana, ọ gụsịrị akwụkwọ maka diplọma ọzọ.

Na United Kingdom, Oyelude rụrụ ọrụ n'ọtụtụ ụlọ ọgwụ gụnyere Paddington General Hospital, otu n'ime ụlọ ọgwụ ndị dịbu na St Mary's Hospital, London . Mgbe ọ laghachiri Naịjirịa, ọ rụrụ ọrụ na nnukwu ụlọ ọgwụ dị na Kaduna n’agbata afọ 1964 na 1965. Ọ rụrụ ọrụ dịka siniọ nọsịn sista-in-chaj ụlọ nọsịn mbụ ndị Kaduna (nke bụzi ụlọ ọgwụ ọkachamara nke Barau Dike,na Kaduna) site n'afọ 1965 ruo 1977. Mgbe agha obodo Naịjirịa bidoro n’afọ 1967, ọ kwagara n’ụlọ ọgwụ izugbe dị na Markurdi. Oyelude duuru otu ndi si na mpaghara ugwu; otu nke nyeere ụlọ ọgwụ aka ị dị njikere ị gwọ ndị merụrụ ahụ n'agha. Na mbido afọ 1970, ọ rụrụ ọrụ dịka onye isi na-elekọta ma na-atụzi ọrụ nọọsụ na ụlọọgwụ nkuzi nke Mahadum nke Ahmadu Bello, mgbe ọ batara na Institute of Health,nke Mahadum nke Ahmadu Bello. O ji aka ya laa ezumike nká na ọkwa ahụ n'afọ 1985. Ọ bụkwa onye nnyocha ule nke ezi nke Nursing and Midwifery Council of Nigeria. Ọ bụ onye isi oche nke Kwara State Health Management Board site n'afọ 1980 ruo 1983. [7]

Ndụ onwe

[dezie | dezie ebe o si]

Oyelude ji ọkwa ọchịchị ya bụ Iyaolu of Isaluland na Iyalode of Okunland . O nwere ọtụtụ ụmụ ụmụ. [6]

Nrụtụaka

[dezie | dezie ebe o si]
  1. N. Nik Onyechi. Nigeria's book of firsts: a handbook on pioneer Nigerian citizens, institutions, and events.
  2. ""Beauty Across Generations!" Miss Nigeria: '1957' Grace Oyelude & '2013' Ezinne Akudo Cover ThisDay Style". Onobello. Retrieved 26 August 2013.
  3. "Cool FM to Support Miss Nigeria's Pet Project". Daily times.
  4. Oju, Ekanem. "Hall of fame". Miss Nigeria. Archived from the original on July 28, 2013. Retrieved August 1, 2013.
  5. "Tribute to Miss Nigeria 1957 Grace Tinuke Oyelude". Nigerian Entertainment Today.
  6. 1 2 "My Reign as first Miss Nigeria".
  7. "Tribute to Miss Nigeria 1957 Grace Tinuke Oyelude". 8 July 2013. Retrieved 26 August 2013.

Njikọ dị na mpụga

[dezie | dezie ebe o si]