Habiba Msika

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Habiba Msika

  Habiba Msika, nke a na-akpọkwa Messika (حبيبة مسيكة), (a mụrụ n'afọ 1903 Testour - Febụwarị 21, 1930 Tunis), bụ onye na-agụ egwu, onye na-agba egwu na onye na-eme ihe nkiri na Tunisia. A mụrụ ya Marguerite Msika, ọ bụ nwa nwanne nwanyị nke onye na-agụ egwu Leila Sfez.

Ọ rịgooro ngwa ngwa n'ọkwa nke a ma ama n'okpuru aha Habiba ("onye a hụrụ n'anya"). Ihe nlereanya nke onye nweere onwe ya, na onye nwe ọdịnihu ya, onye na-agụ egwu na onye na-eme ihe nkiri, nke ndị Tunisia na-efe ofufe, Msika bụ ihe omume mmekọrịta mmadụ na ibe ya n'oge ya. Ihe nkiri The Fire Dance nke Salma Baccar na-ekwu maka ọrụ ya.[1]

Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya na mpaghara ndị Juu nke Tunis n'ezinụlọ dara ogbenye. Nne na nna ya, Daida na Maïha, rụrụ ọrụ na ahịa waya.

Ọ mụtara ịgụ na ide n'ụlọ akwụkwọ nke Israelte Alliance, nke ọ hapụrụ mgbe afọ asaa gasịrị, site n'enyemaka nke nwanne nne ya, nkuzi abụ, nkuzi egwu na Arabic oge ochie na onye na-ede egwu a ma ama bụ Khemaïs Tarnane na onye na'egwuregwu Egypt bụ Hassan Bannan.

Ọ lụrụ nwa nwanne nne ya Victor Chetboun mana mmekọrịta ha dị mkpirikpi.

E mere emume izizi ya n'obí eze La Marsa, ebe ọ zutere onye ọ hụrụ n'anya: Minista de la Plume.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1920, ọrụ ya malitere; ọ ghọrọ ihe nnọchianya mmekọahụ ma malite ihe omume nke "ndị agha nke abalị", aha njirimara maka ndị na-akwado ya, ọtụtụ n'ime ụmụ agbọghọ nke Tunisia.[2]

Ọ bụ n'oge a ka ya na onye ọ hụrụ n'anya gara Paris, ebe site na ya ọ zutere Pablo Picasso na Coco Chanel.

N'ọnwa Machị afọ 1925, ọ gụrụ Romeo na Romeo na Juliet na ụlọ ihe nkiri Ben Kamla .

Ọnwụ[dezie | dezie ebe o si]

N'ụtụtụ nke ọnwa Febụwarị 20, afọ 1930, onye bụbu onye ọ hụrụ n'anya Eliyahu Mimouni banyere n'ụlọ ya n'okporo ámá Alfred Durand-Claye na Tunis, wee gbaa ya ọkụ. Ọ gbara ọkụ nke ukwuu, ọ nwụrụ n'echi ya, n'oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, Mimouni sochiri ya. E liri Msika n'ebe ili ozu nke Borgel na Tunis.[3]

Ili Habiba Msika n'ebe ili ozu nke Borgel

Edemsibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Hillauer (2005-01-01). Encyclopedia of Arab Women Filmmakers. American Univ in Cairo Press. ISBN 9789774249433. 
  2. (1999) African Cinema: Postcolonial and Feminist Readings. Africa World Press. ISBN 9780865436978. 
  3. Jacobs (2001-01-01). The Rough Guide to Tunisia. Rough Guides. ISBN 9781858287485. 

Ebe e si nweta ya[dezie | dezie ebe o si]

  •  
  •  

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]