Gaa na ọdịnaya

Hannah Idowu Dideolu Awolowo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Chief Hannah Idowu Dideolu Awolowo (a mụrụ dịka Adelana; 25 November 1915 – 19 September 2015), onye e ji HID mara,[1] bụ nwaafọ Naijira ji ego achụ nta ego, nakwa onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

A mụrụ ya n'ezinụlọ nwere obi umeala n'obere obodo Ikenne nke Ogun Steeti na Naijiria, ọ gara ụlọ akwụkwọ nke Methodist High School na Legọs . [2] Ọ lụrụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ Obafemi Awolowo site n'ụbọchị nke iri abụọ na isii n'ọnwa Disemba afọ 1937 ruo ọnwụ ya n'afọ 1987. [3] Ọ bụ onye ama ama dịka "ọla nke uru ya enweghị atụ". Ọ bụkwa nwaanyị ọchụnta ego na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị maara ihe. Ọ rụrụ oke ọrụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Westen Naijiria . Ọ nọchitere anya di ya na njikọ aka e mere n'etiti NCNC na AG, nke a kpọrọ United Progressive Grand Alliance (UPGA), mgbe a na-ekpe ya ikpe ma mgbe ọ nọ na nga.

Atụmatụ ndị ahụ bụ na ọ ga-azọ ntuli aka ahụ, ma ọ bụrụ na o merie, ọ ga-agbada ka di ya chịa na ntuli aka mmechi. Iji mezuo ebumnuche ya nke ị bụ onye isi ala na Rịpọbliik nke abụọ, ọ gara ebe niile di ya gara na-eme mgbasa ozi. Ọ chikọtakwara otu ụmụ nwanyị nke otu ahụ ma na-anọ mgbe niile na kọmitii ọgbakọ niile. Nwanyị ọchụnta ego nwere ihe ịga nke ọma, ọ bụ onye mbụ na-ekesa ngwa ahịa ndị Nigerian Tobacco Company (NTC) n'afọ 1957. Ọ bu ya bu onye mbubata ngwongwo akwa leesi na akwa ndị ọzọ na Naijiria. Na mgbakwunye na ọtụtụ itu aha ndị ọzọ, o jidere ọkwa Yeye Oodua nke Yorubaland . Ọnwụrụ́ n'ụbọchị nke iri na itoolu n'ọnwa Septemba afọ 2015, ọ nwụrụ mgbe ọ dị afọ iri itoolu na iteghete ka ọnwa abụọ fọdụrụ ka o ruo otu narị afọ. [4] [5] E liri ya n’akụkụ di ya na Ikenne n'ụbọchị nke iri na ise n'ọnwa Nọvemba afọ 2015. [6] Osote Onyeisiala Naịjirịa, Yemi Osinbajo, lụrụ nwa nwa ya, bụ Dolapo Soyode . [7]

Nrụtụaka

[dezie | dezie ebe o si]
  1. ↑ Oyetimi, Kehinde (23 November 2010). "Hannah Idowu Dideolu Awolowo(HID) clocks 95 on Thursday". Archived from the original on 17 December 2013. Retrieved 4 December 2020.
  2. ↑ Odoshimokhe, Musa. "How Awolowo met, married HID".
  3. ↑ Adeniyi, Tola (1993). Templeeti:Title case (Mrs.) H.I.D. Awolowo. Gemini Press. ISBN 978-978-31953-0-1.
  4. ↑ "Late politician's wife dies at 99". Archived from the original on 2016-11-20. Retrieved 2020-12-04.
  5. ↑ "[[:Templeeti:Title case]] 1915–2015 'Mama died singing, praying'". {{cite cite news}}: URL–wikilink conflict (help)
  6. ↑ "Hannah Idowu Dideolu Awolowo: Buried in grand style".
  7. ↑ "[[:Templeeti:Title case]]". {{cite cite web}}: URL–wikilink conflict (help)