Gaa na ọdịnaya

Hauwa Ojeifo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Hauwa Ojeifo
mmádu
Ụdịekerenwanyị Dezie
Mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereHauwa Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1992 Dezie
Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaEnglish Dezie
Ọrụ ọ na-arụactivist Dezie
Ebe agụmakwụkwọUniversity of Reading Dezie
Ogo mmụtaMaster of Science Dezie

    Hauwa Ojeifo (amụrụ n'afọ 1992) bụ onye Naijiria n'ebu agha megide idakpo mmadụ na-ike na ihụkwa maka ahụike nke akọ na uche. A maara ya dị ka nwanyị Naijiria mbụ natara onyinye Queen's Young Leader Award maka ọrụ ya.[1][2]

    Mbido ndụ na agụmakwụkwọ ya

    [dezie | dezie ebe o si]

    Ojeifo gara Mahadum nke Reading di na England ebe ọ nwetara nzere Master of Science na Investment Banking na Islamic Finance.[1]

    N'oge ntorobịa na mmalite afọ ndụ agbọghọ ya, ọ lụsoro ịda mbà n'obi ọgụ. Na Febụwarị 2016, Ojeifo nwara igbu onwe ya. N'afọ 2014, e metọrọ ya n'ụzọ mmekọahụ. A chọpụtakwara na ọ na-arịa ọrịa uche na post traumatic stress disorder na obere psychosis. Iji gbanwee ahụmahụ ya siri ike ka ọ bụrụ ihe dị mma, o guzobere ntọala She Writes Woman na Eprel 2016. Site na ntọala ya, ọ na-enye nkwado maka ndị mmetọ mmekọahụ na ndị mmadụ nọ na West Africa chọrọ nlekọta ahụike uche.[3][4]

    N'ọnwa Febụwarị 2020, n'oge Naịjirịa na-achọ ime iwu mbụ ya maka ahụike akọ na uche, a maara Ojeifo ka onye gbachitere ikike nke ndị nwere ọrịa akọ na uche, na nkwarụ psychosocial n'ihu ndị omeiwu Naịjirị, nke mere ka ọ bụrụ nwanyị mbụ mere ihe dị otú a.[4]

    Onyinye e nyere ya na ihe ndị ọ rụzuru

    [dezie | dezie ebe o si]

    Ewezuga ịnata onyinye Queen's Young Leader Award maka ọrụ ya na 2018, Ojeifo enwetala ọtụtụ onyinye ndị ọzọ gụnyere ndị a:

    • N'afọ 2017, IWOW kwanyeere Ojeifo ugwu dị ka nwanyị nke ihe niile kwere omume 2017[1][5]
    • A họpụtakwara ya dị ka onye a na-asọpụrụ nke AstraZeneca Young Health Programme scholarship na nzukọ One Young World na The Hague, Netherlands[1][5]
    • N'afọ 2018, e nyere ya onyinye MTV EMA Generation Change na Bilbao, Spain.[1][5]
    • N'afọ 2019, ọ ghọrọ onye isi Obama Foundation.[1][5]

    Edensibịa

    [dezie | dezie ebe o si]
    1. 1 2 3 4 5 6 Kiunguyu (2019-09-12). Meet Hauwa Ojeifo founder of She Writes Woman, a women-led movement giving mental health a voice (en-US). This is africa. Retrieved on 2020-10-02.
    2. "'People think you can pray things away'". Retrieved on 2020-10-02. (in en-GB)
    3. Aisha Salaudeen. She was diagnosed with a mental health disorder. Now she is helping others work through theirs. CNN. Retrieved on 2020-10-02.
    4. 1 2 Geall (2020-09-24). Hauwa Ojeifo wants to change the way Nigeria views mental health (en). Stylist. Retrieved on 2020-10-03.
    5. 1 2 3 4 Hauwa Ojeifo, the 26-year-old Nigerian championing women's mental health in Africa and getting global recognition (en). Face2Face Africa (2018-11-07). Retrieved on 2020-10-02.

    Njikọ mpụga

    [dezie | dezie ebe o si]