Helen Nakimuli

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Helen Nakimuli
Helen Nakimuli
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Aha enyereHelen Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya2 Julaị 1985 Dezie
Ebe ọmụmụKalangala District Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye egwuregwu volleyball Dezie
Ọkwá o jimember of parliament Dezie
ebe agụmakwụkwọMakerere University Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịNational Unity Platform Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEastern Orthodoxy Dezie

Helen Nakimuli (amụrụ na 2 Julaị 1985) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye omeiwu Uganda, onye na-egwu volleyball, onye otu nke iri na otu nke Uganda maka Kalangala District.[1][2][3] Ọ bụ onye otu National Unity Platform (NUP).[1][4]

Agụmakwụkwọ na nzụlite[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Nakimuli n'obodo Lukuba, Kyamuswa sub-county na Kalangala n'aka onye ụkọchukwu Ọtọdọks, Rev. Nna Christopher Walusimbi na Maria Nalwanga Walusimbi bụbu onye kansụl mpaghara Kalangala maka Kyamuswa na Bubeke.[4][2] Nakimuli malitere agụmakwụkwọ ya na ụlọ akwụkwọ praịmarị Bukasa, Hormisdallen Primary School na Bweyogerere na Wakiso, Our Lady of Good Counsel na Gayaza maka ọkwa ya, St. Augustine secondary school na Wakiso maka ọkwa ya dị elu tupu ọ banye na Mahadum Makerere.[1][4]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị Nakimuli malitere na ụlọ akwụkwọ sekọndrị St. Augustine dị ka onye isi nwanyị.[4] O meriri Aidah Nabayiga ka ọ bụrụ onye omeiwu maka mpaghara Kalangala[5]

Ọrụ ndị ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

Nakimuli bụ onye na-egwu volleyball kemgbe afọ 1998.[1] Ọ bụ onyeisi ndị otu volleyball ụmụ nwanyị gara egwuregwu ndị omeiwu nke East Africa na Arusha, Tanzania.[1] Ọ bụ onye otu COBAP Volleyball Club.[1] O nyere aka na windo nke Kalangala iji nweta ndị ọka iwu mgbe ndị ọzọ chọrọ iwere ihe onwunwe di ha nwụrụ anwụ.[4] Nakimuli nyere enyemaka nke gụnyere nri, ncha na ihe ndị ọzọ nye ndị agadi nọ na mpaghara Kalangala.[6] Nakimuli nyere ndị ụlọ ha gbara ọkụ enyemaka.[3] Nakimuli rịọrọ minista steeti maka microfinance, Haruna Kyeyune Kasolo ka ọ tinye mpaghara agwaetiti Buvuma na Namayingo na ndepụta nke ego Emyooga[7]

Onyinye[dezie | dezie ebe o si]

Popu Ọtọdọks na Onyeisi Ndị Bishọp nke Alexandria na Africa niile, Obi ụtọ Chineke ya Theodore nke Abụọ nyere Nakimuli ihe nrite ụka iji kwado ọrụ nlereanya ya na Chọọchị Ọtọdọk, Uganda na ihe a kpọrọ mmadụ.[2][8]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Ndepụta nke ndị otu nke iri na otu nke Uganda
  2. Shamim Malende
  3. Nzukọ omeiwu nke Uganda
  4. National Unity Platform (NUP)

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 MP Nakimuli balances spikes and Parliament (en). Monitor (2021-11-28). Retrieved on 2022-04-01. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  2. 2.0 2.1 2.2 Orthodox legislators get papal recognition (en). New Vision. Retrieved on 2022-04-01. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":1" defined multiple times with different content
  3. 3.0 3.1 Islanders ask Govt for firefighting equipment (en). New Vision. Retrieved on 2022-04-01. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":2" defined multiple times with different content
  4. 4.0 4.1 4.2 4.3 4.4 Tukuletedde omwana wa Faaza eyawangula ekifo ky’omubaka Omukyala e Kalangala ku kaadi ya NUP, ne bimukwatako (en-GB). Watchdog Uganda (2021-02-20). Retrieved on 2022-04-01. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":3" defined multiple times with different content
  5. URN. Defeated Kalangala MP withdraws scholarships for 80 students (en-gb). The Observer - Uganda. Retrieved on 2022-04-01.
  6. Abakadde e Kalangala badduukiriddwa ne bikozesebwa mu maka, Covid yatuleka bubi bawanjaze (en-GB). Watchdog Uganda (2020-07-16). Retrieved on 2022-04-01.
  7. Emyooga programme to be redesigned for islanders (en). New Vision. Retrieved on 2022-04-01.
  8. Orthodox legislators get papal recognition (en). Bukedde. Retrieved on 2022-04-01.