Huveane

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Huveane, nke a makwaara dịka Huve ma ọ bụ Huwe, bụ chi aghụghọ na chi okike na akụkọ ifo Pedi na Venda. N'ime ụfọdụ nsụgharị nke akụkọ ifo, a na-egosikwa Huveane dịka mmadụ mbụ n'ụwa.[1][2]

Akụkọ ifo[dezie | dezie ebe o si]

Dịka chi Okike[dezie | dezie ebe o si]

N'otu akụkọ ifo metụtara ngosipụta ya dịka chi okike, a kọwara Huveane na o ji ụrọ mepụta nwa ọhụrụ. O zoro nwa ya n'anya onye ọ bụla ọzọ nọ n'obodo ya, gụnyere ndị mụrụ ya. ma zoo nwa ahụ nʼosisi nwere oghere. Nne na nna ya mechara chọpụta, ọ bụ ezie na ha enweghị nsogbu na ya, ma hapụ Huveane ka ọ gaa n'ihu na-azụlite nwa ọhụrụ ahụ. Otú ọ dị, ndị obodo ahụ ekwenyeghị n'otu mmetụta ahụ. Ha kwenyere na Huveane ji anwansi kee nwa ahụ, na-eduga ha ịtụ egwu na Huveine nwere ike iji ike ya megide ha. Ndị obodo ahụ nwara igbu ya mana ha enweghị ihe ịga nke ọma ebe ọ bụ na Huveane nwere ike ịkọ ọdịnihu ma nwee ike izere mgbalị ha niile.[1]

N'akụkọ ifo ọzọ, nke metụtara nchọpụta nke mmekọahụ, a sịrị na Huveane gbapụrụ n'ụwa n'ihi nkọgheri nke sitere na nchọta. Huveane gbagara n'anyanwụ, nke na-anọchi anya eluigwe, site n'ịmepụta nzọụkwụ iji gaa ije. O wepụkwara ihe nzọụkwụ ahụ ka ọ na-arịgo elu, na'ahụ na ụmụ mmadụ enweghị ike iso ya.[2][3]

Dịka chi aghụghọ[dezie | dezie ebe o si]

Omume Huveane dịka chi aghụghọ nwere ike isite n'ọtụtụ akụkọ ifo ebe ọ na-eme ihe ọchị na ezinụlọ ya na ndị obodo ya.[1][2][4] N'otu akụkọ ifo, o zuru nri nna ya ma hapụ nsị ehi n'elu efere efu. Mgbe nna ya jụrụ ihe mere nri ahụ, o mere ka a ga-asị na nri a gbanwere ka bụrụ nsị ehi site na anwansi a na-amaghị ama.[1]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndepụta nke akụkọ ifo Afrịka

Edemsibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Lynch (2010). African Mythology, A to Z (in en). Infobase Publishing. ISBN 978-1-4381-3133-7.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  2. 2.0 2.1 2.2 McElroy (2020-04-07). Superstitions: A Handbook of Folklore, Myths, and Legends from around the World (in en). Book Sales. ISBN 978-1-57715-191-3.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":1" defined multiple times with different content
  3. HUVEANE - the Basotho God of Creation (African mythology). Godchecker - Your Guide to the Gods. Retrieved on 2021-02-15.
  4. Myths and Legends of the Bantu: Chapter XI: The Tricksters Hlakanyana and Huveane. www.sacred-texts.com. Retrieved on 2021-02-15.