Idrissa Timta

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Idrissa Timta
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereIdrissa Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1942 Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya30 Mee 2014 Dezie
nwaMuhammad Timta Dezie
Ọkwá o jiEmir of Gwoza Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Ahmadu Bello Dezie

Shehu Mustapha Idrissa Timta (1942 - May 30, 2014) bụ onye isi ọdịnala Naịjirịa nke jere ozi dịka Emir nke Gwoza nke atọ site n'ọnwa Ọktọba afo 1981 ruo mgbe ọ nwụrụ n'ọnwa Mee afo 2014. [1] Egburu ya na mwakpo ndị Boko Haram na- eyi ọha egwu n'abali iri atọ ọnwa Mee , afo 2014. [2]

A mụrụ ya n'afo 1942, nwa nke Emir nke Gwoza nke abụọ, Idrisa Timta. [2] Ọ gara ụlọ akwụkwọ elementrị Muslim, Gwoza, ruo afo 1948 ma gaa Senior Primary School na Bama, Nigeria, site na afo 1952 ruo afo 1960. [1] Ọ gaziri ụlọ akwụkwọ Provincial Secondary School (nke bụzi Government College Maiduguri ugbu a) site na afo 1960 ruo 1964. Ọ kụziri ihe nwa obere oge wee debanye aha ya maka igụ akwụkwọ na Mahadum Ahmadu Bello dị na Zaria, ebe ọ gụrụ akwụkwọ gbasara iwu Sharia . Timta malitere ọrụ ya dị ka onye nyocha nke ụlọ ikpe mpaghara maka usoro ikpe ikpe nke North-Eastern State n'oge gara aga. E buliri ya na Okwa ibụzi Onye isi ndị nyocha ụlọ ikpe mpaghara, ọkwá ọ nọrọ ruo mgbe ọ ghọrọ emir na afo 1981.

A họpụtara ya ịbụ Emir nke Gwoza nke atọ, otu okpuru ọchịchị ime obodo dị na Steeti Borno ka ọdi ugbu a, n’ime ọnwa Ọktọba afo 1981. [1] [2] E buliri Timta n'ọkwa ibụ emir nọ na ogo nke abụọ na nhazi ọkwá n,afo 1987. N'ọnwa Jenụwarị afo 2014, Gọvanọ nke Borno Steeti Kashim Shettima gara n'ihu ibuli Timta elu na ọkwa onye ọchịchị ọdịnala mbụ na nhazi ọkwa.

N'abali iri na atọ nke ọnwa Eprel, afo 2014, Timta katọrọ otu Boko Haram na- eyi ọha egwu, nke na-enye nsogbu na mpaghara Gwoza n'ebe ndị ọzọ fọdụrụ na Borno State. [1] Ọ katọrọ nnupụisi nke otu ahụ, ime ihe ike na mmetụta ọjọọ nkea nwere ne-ebe mmekọrịta mmadụ na ibe ya na akụ na ụba Gwoza. [2] N'okwu ahụ, Timta kwuru, "ndị anyị ahụla ọgụ ka ukwuu na ogbugbu ọtụtụ ndị mmadu nke ndị nnupụisi ahụ n'ime ọnwa anọ gara aga. Mwakpo a emebiela ndụ mmadụ na nke akụ na ụba na mpaghara ahụ dum. . . Ọ bụ ihe nwute ikwu na ndị nnupụisi ahụ egbochiela ndị m ịga ahịa, bụ ndị na-egbu mmadụ mgbe n'otu ọ masịrị ha. Timta rịọrọ gọọmentị Naịjirịa ka ha gbochie mwakpo ndị Boko Haram ọzọ.

N'abali iri atọ nke ọnwa Mee, 2014, Timta na ndị isi ọdịnala abụọ ọzọ na-aga Gombe, Nigeria, maka olili nke Emir nke Gombe Shehu Abubakar, onye nwụrụ n'ọrịa kansa n'abali iri abụọ n'asaa nke ọnwa Mee. [1] Ndị na-eyi ọha egwu Boko Haram wakporo ụgbọ ala na ndị nche ndị so Timta n'ọgba agha mere na elekere itoolu nke ụtụtụ n'okporo ụzọ Gombi-Garkida-Biu dị nso na Biu, Nigeria [2] [3] Egburu Timta na mwakpo ahụ, ya na onye ọkwọ ụgbọ ya na ndị uwe ojii abụọ, bụ ndị kpuchitere ndị isi ọdịnala ndị ọzọ n'oge nruchi ahụ. Ndị eze ọdịnala abụọ ndị ọzọ so Timta na-aga olili ahụ n'ụgbọ ala ha - Emir nke Askira Abdullahi Ibn Muhammadu Askirama na Emir nke Uba Ali Ibn Ismaila Mamza II - gbanahụrụ mwakpo ahụ. [4]

Nwoke a, onye gbara afọ iri asaa na abụọ, hapụrụ nne ya gbara Narị afo, ụmụ nwanyị anọ, na ụmụ iri abụọ na asatọ. [2]

Gwoza Emirate Council dị na Steeti Borno họpụtara onye nọchiri ya, Muhammad Timta, dị ka onye Emir nke anọ nke Gwoza n'ọnwa Juun afo 2014, ka izu ụka abụọ gacahra emere mwakpo ahụ. [3] E nyere ya akwụkwọ ozi nhọpụta sitere n'aka gọọmentị Steeti Borno n'abali iri na atọ nke ọnwa Juun, afo 2014.

Ntughari[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 Olanrewaju. "Tears as slain Emir of Gwoza is buried", The Sun (Nigeria), 2014-06-01. Retrieved on 2014-06-23.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 2.5 Marama. "Boko Haram attacks three Emirs, kills one", Vanguard (Nigeria), 2014-05-31. Retrieved on 2014-06-23.
  3. 3.0 3.1 Otuchikere. "Muhammad Timta Becomes New Emir Of Gwoza Tomorrow", Leadership (Nigeria), 2014-06-12. Retrieved on 2014-06-23.
  4. "The Killing of the Emir of Gwoza", The Guardian (Nigeria), 2014-06-23. Retrieved on 2014-06-23.