Ifeanyi Odii

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ifeanyi Odii
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1975 Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọchụnta ego Dezie

Ifeanyi Chukwuma Odii (amụrụ n'abalị iri na asaa n'ọnwa Eprel n'afọ 1975) bụ onye ọchụnta ego Naijiria, onye ọrụ ebere na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ bụ onye guzobere na onye isi oche nke Orient Global Group. yana onye na-azọ ọkwa gọvanọ nke People’s Democratic Party maka Ebonyi Steeti na ntuli aka gọvanọ nke afọ 2023.[1] Odii bụ nwa afọ Isu na mpaghara ọchịchị ime obodo Onicha (LGA) nke steeti Ebonyi, Naijiria.

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Odii gara ụlọ akwụkwọ praịmarị Isu-achara na ụlọ akwụkwọ sekọndrị Isu, ha abụọ di na steeti Ebonyi maka agụmakwụkwọ ya. Odii gụrụ Business Administration na National Open University of Nigeria na-enweta nzere Bachelọ nke Sayensị (B.Sc.). Enyere ya Dọkịta nke Sayensị Degree na Strategic Business Management & Corporate Governance site na European American University na Republic of Panama.[2] Ọ gụkwara akwụkwọ site na Chief Executive program na Lagos Business School. Ọ bụ onye otu Lagos State University Governing board ekwupụtara n'afọ 2021 site n'aka Gọvanọ Lagos State, Babajide Sanwo-Olu[3][4] Ọ nọkwa na bọọdụ nke Nnamdi Azikwe University Business School.[5]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

A họpụtara Odii n'afọ 2023 ka ọ bụrụ onye na-azọ ọkwa gọvanọ nke People’s Democratic Party (Nigeria) na ntụli aka o jiri narị atọ na iri anọ na itoolu merie onye iro ya kacha nso, Chris Usulor, onye nwetara votu itoolu.[6][7][8][9]

Onyinye[dezie | dezie ebe o si]

  • N'afọ 2022, akwụkwọ akụkọ Guardian kwetara na Odii bụ otu n'ime ndị isi 50 kachasị elu nke nwere mmetụta ma nye aka na uto GDP nke Naịjirịa na 2021.[10]
  • E nyere Odii onye ọrụ ebere nke afọ.[11][12]
  • Odii meriri na Next Bull Awards na 2021 na Nigerian Investors Value Awards (NIVA) nke Business Day Newspaper na Nigerian Stock Exchange haziri.[13]

Ọrụ ebere[dezie | dezie ebe o si]

Odii haziri Ebele na Anyichuks Foundation nke ya na nwunye ya na-elekọta. Ntọala ahụ arụgoro ihe karịrị ụlọ otu narị na iri atọ maka ndị ogbenye, ụlọ ụka isii na okporo ụzọ 2.2 km (1.4 ) na Magodo, Lagos.[14][15][16] N'oge ọrịa COVID-19, ntọala ahụ nyekwara otu narị nde na iri ise naira na Gọọmentị etiti nke Naịjirịa, Gọọmentị steeti Lagos na Gọọmenti steeti Ebonyi yana ikesa ihe nrite nye ndị mmadụ.[17][16] O nyekwara ụmụ akwụkwọ na steeti Ebonyi agụmakwụkwọ n'efu[18]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndepụta ndị si Ebonyi Steeti

Ebemside[dezie | dezie ebe o si]

  1. Orient Global Group Founder, Odii, Joins Ebonyi Guber Race – THISDAYLIVE. www.thisdaylive.com. Retrieved on 2022-08-17.
  2. Okogba (2022-04-14). Dr Ifeanyi Odii, The Visionary Leader Ebonyi Deserve (en-GB). Vanguard News. Retrieved on 2022-08-17.
  3. Sobowale (2021-06-27). Sanwo-Olu names new 13-member LASU Governing Council (en-GB). Vanguard News. Retrieved on 2022-08-17.
  4. FULL LIST: Lagos-owned tertiary institutions get new governing councils (en-US). TheCable Lifestyle (2020-07-30). Retrieved on 2022-08-17.
  5. Staff (2021-10-10). UNIZIK appoints Stanley Uzochukwu, Maduka, others as board members of own Business School (en-US). Daily Post Nigeria. Retrieved on 2022-08-17.
  6. Odii clinches Ebonyi PDP guber ticket (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2022-05-31). Retrieved on 2022-06-27.
  7. PDP Bows To Court Ruling, Accepts Odii As Ebonyi Governorship Candidate (en-GB). The Whistler Newspaper (2022-06-20). Retrieved on 2022-06-27.
  8. Aliuna (2022-05-30). Business mogul, Odii emerges PDP guber candidate in Ebonyi (en-US). Daily Post Nigeria. Retrieved on 2022-06-27.
  9. Ugwu (2022-05-30). Ebonyi PDP faction elects gov candidate despite order for cancellation by national leadership (en-GB). Premium Times Nigeria. Retrieved on 2022-09-01.
  10. The Guardian's special focus and Nigeria's most impactful and award-winning CEOS in 2021: part 2 (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2022-03-22). Archived from the original on 2022-04-21. Retrieved on 2022-06-27.
  11. #IndependentAwards: Odii Recognised As Philanthropist Of The Year (en-GB). Independent Newspaper Nigeria (2022-03-05). Retrieved on 2022-06-27.
  12. Independent Newspapers Honours Distinguished Nigerians Today (en-GB). Independent Newspaper Nigeria (2022-03-05). Retrieved on 2022-08-17.
  13. Ultimus Holdings wins the 2021 NIVA Awards (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2021-04-29). Archived from the original on 2022-06-27. Retrieved on 2022-06-27.
  14. BusinessDay (2021-01-13). Ebele and Anyi Chucks Foundation hands over 100 houses for free to indigent persons during the yuletide season (en-US). Businessday NG. Retrieved on 2022-08-17.
  15. Foundation builds 110 houses for poor in Ebonyi (en-US). Punch Newspapers (2021-01-17). Retrieved on 2022-08-17.
  16. 16.0 16.1 COVID-19: Nigerian philanthropist distributes palliatives, transforms disabled child hawker (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2020-05-11). Retrieved on 2022-08-17.
  17. Omegoh (2020-04-10). COVID-19: Ebele and Anyichuks Foundation donates N150m to FG, Lagos, Ebonyi (en-us). The Sun Nigeria. Retrieved on 2022-08-17.
  18. Bankole (2022-03-27). 2023: Women groups, youths urge philanthropist to join guber race in Ebonyi (en-GB). Vanguard News. Retrieved on 2022-08-17.