Ifeoma Malo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ifeoma Malo
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereNgozi, Ifeoma Dezie
aha ezinụlọ yaMalo Dezie
Ọrụ ọ na-arụoka mmuta Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Ibadan, University of Massachusetts, Harvard University, Harvard Law School, University of Massachusetts Boston Dezie

Ngozi Ifeoma Malo bụ ọkàiwu nọ na Nigeria nwetara mmeri nke Eisenhower Fellowship na 2015. Ọ bụ onye ibe Desmond Tutu, African Leadership fellow nakwa Crans Montana New Leaders fellow. N'afọ 2015, o jere ozi dịka onyeisi ndị ọrụ n' ọkachamara na-ahụ maka nkà na ụzụ banyere usoro ọkụ, ụkpụrụ na mmekọrịta na Prọfesọ. Chinedu Nebo, onye bụbu Minista nke na-ahụ maka ọkụ n'ala Naijiria. Ọ bụ ugbu a onyeisi oche nke Clean Tech Hub and Energy Innovation Centre, Abuja.

Agụm akwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

O nwetara akara ugo mmụta bachelor na Mahadum nke Ibadan na 2000 wee nwee ọkwá atọ dị elu: Iwu si na Mahadum Harvard , Mkpebi Nkwekọrịta na Teknụzụ, na Mahadum Massachusetts . [1]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ifeoma rụrụ n' Ashoka , ọfịs nke West Africa. Ọ rụrụ dị ka onye na-arụkọ ọrụ n'ụlọ ọrụ ahụike ọha na eze nke Boston nakwa dịka onye prọfesọ na-akụzi ihe na Mahadum Massachusetts Boston. Mgbe ọ nọ na Boston, ọ na-eje ozi dịka onye ndụmọdụ n' ụlọ ọrụ Global Biotechnology nke a na-akpọ Genzyme Corporation .

Na Naijiria, ọ rụrụ ọrụ dịka onye isi ọgụgụ isi n' ụlọ ọrụ George Goli and Okagbue, emesị a bụrụ onye isi nchịkwa na Njikọ Nlekọta na Njikọ Nkwekọrịta. Emesiri họpụta Ifeoma ka ọ bụrụ onye inyeaka pụrụ iche nye Minista nke Ego na Nigeria nakwa tupu ya agaa dịka onye ndụmọdụ ọkachamara siri ike nke Prọfesọ Chinedu Nebo, onye bụbu Minista nke ọkụ na Naijiria. O jere ọrụ dika onyeisi ndụmọdụ na Onyeisi oche nke Iwu Nigerian Electricity Regulaory Commission . [2]

Ihe nrite na nkwanye ugwu[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2013, a họpụtara ya dika otu n'ime ndi Naijiria nwetara Desmond Tutu Fellowship Program . [3] A họọrọ Ifeoma dịka onye ibe nke Eisenhower Multi National Program na U.S n'afọ 2015. [4] Ọ bụkwa onye ibe nke African Leadership Forum na Crans Montana New Leaders. [1]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Staff Writer (13 April 2015). Nigerian, Ngozi Ifeoma Malo Nominated As An Eisenhower Fellow For 2015 - The Trent.
  2. Eisenhower Fellows. Archived from the original on 2018-10-18. Retrieved on 2019-03-11.
  3. Six Nigerian Professionals selected for the 2013 Archbishop Tutu Leadership Fellowship Programme. Goodnews Nigeria. Retrieved on 30 September 2016.
  4. Nebo’s Aide Among 23 Fellow On World Energy. The Tide. Retrieved on 30 September 2016.