Ifo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ifo
local government area of Nigeria
aha otutuhome of harmony Dezie
mba/obodoNaijiria Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaȮra Ogun Dezie
dị na mpaghara ogeUTC+01:00 Dezie
nhazi ọnọdụ6°49′0″N 3°12′0″E, 6°46′55″N 3°15′7″E Dezie
ụlọ ọrụ nke onye isi gọọmentị nwereChairman of Ifo local government Dezie
Executive òtùsupervisory councillors of Ifo local government Dezie
òtù omebe iwuIfo legislative council Dezie
Asụsụ ọ na-asụAsụsụ Yoruba Dezie
Koodu ọkpụkpọ obodo+(234) Dezie
Ifo Post Office, Ifo-Ogun State

Ifo bụ ógbè Gọọmentị Obodo na Steeti Ogun ,nke Naịjirịa . Isi ụlọ ọrụ ya dị n'obodo Ifo nke odidi nke ugwu ya na owuwa anyanwu ya bụ / 6.81667°N 3.20000°E / 6. 81667; 3.20000.O nwere mpaghara nke km² narị ise na iri abụọ na otu nke ọnụ ọgụgụ mmadụ narị puku isii na iri itoolu na asatọ na narị asato na iri atọ na asaa nke ọnụ ọgụgụ ịsị n'isi n'afọ 2006 "Adebami-Tella". Koodu post nke mpaghara ahụ bụ 112.[1]

Ụgbọ njem[dezie | dezie ebe o si]

Ifo na Lagos dị nso site na ụzọ ụgbọ okporo ígwè nke a rụchara n'afọ 1899, nke dị kilomita iri asaa na asaa ( mi iri anọ na asatọ). Okporo ụzọ jikọtara ya na Lagos tinyere Abeokuta, Ilaro, Shagamu, Itori, na Ketou.

Asụsụ[dezie | dezie ebe o si]

Asụsụ bụ isi asụsụ Ifo bụ asụsụ Egba.

Obodo ndị dị nso[dezie | dezie ebe o si]

Obodo ukwu ndị dị nso gụnyere Igbusi, Ilepa, Oniale, Pakoto, Kajola, Seriki, Coker, Ibogun, Matogun, Lambe, Alagbole, Ajuwon na Akute, ha niile mejupụtara mpaghara mmepe nke ha na ndị ọchịchị ọdịnala ha (ndị Oba na ndị Baale). Mpaghara ndị a jikọrọ ọnụ mejupụta Ifo Division. Ngalaba Ifo nwere nnukwu ụlọ ogbe ụlọ ọrụ mmepụta ihe nwere ọtụtụ ụlọ ọrụ mmepụta . Obodo Ifo n'onwe ya bụ ebe e nwere ngalaba nke ọtụtụ ụlọ akụ Naijiria. Ifo bụ ahịa na-eto ngwa ngwa nke obodo Ogun, n'ihi ntunye nke mmụba nke ndị mmadụ si n'obodo ndị gbara Ifo gburugburu bụ ndi nwere mmasị site na ịdị nso obodo ahụ na Ogun.

Okpukpe[dezie | dezie ebe o si]

Ndị bi na Ifo gụnyere ndị na-ekpe ọtụtụ okpukpe, gụnyere Iso Ụzọ Kraịst, Islam, na ofufe ọdịnala.

Agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

N'ime Ifo dị ka nnukwu obodo, e nwere ihe karịrị ụlọ akwụkwọ praịmarị ọha na eze ise na ụlọ akwụkwọ sekọndrị iri. E nwekwara ọtụtụ ụlọ akwụkwọ ndị ọra akara, ụlọ akwụkwọ praịmarị na nke sekọndrị, na ụlọ akwụkwọ ogo dị elu abụọ abụọ

Ụlọ akwụkwọ mpaghara gụnyere:

  • The prime scholars school, Ifo
  • Bookers International School, Ifo
  • Rex-Age transnational School
  • Emili-Obadina Memorial school, Ajowa.
  • Community primary school, Agosi
  • The Nations Talents school, Ifo.
  • Astute college
  • Rabbi Comprehensive College
  • Government Primacy School 1,2,3
  • Abekoko Grammar School
  • Nawair u Deen Grammar School
  • Ifo High School
  • Adenrele High School
  • Don Phillips group of schools
  • Estad group of schools olose ifo
  • Leah primary school
  • Temperance comprehensive college
  • Methodist high school
  • Government Technical College olose
  • Oke pata Senior govt College
  • Martins montessori college
  • Toaz primary School
  • Step Up group of school
  • Pakoto High School
  • Solu Senior Grammar School
  • Ireti Olu Model college, Ifo.
  • Access model college
  • Ifo City Polytechnic Ifo
  • Ar nur International College, Ifo
  • Adnaps group of schools
  • Double crown group of schools
  • New Life Secondary School Ifo
  • Ajuwon High School, Iju Ajuwon
  • Breakthrough Academy, Awo Akute
  • God's Grace School
  • Ifo college of technology, Tecno-Bus/stop

Mahadum Olabisi Onabanjo bụ mahadum ọha na eze dị na mpaghara Ibogun nke obodo ahụ.

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Post Offices- with map of LGA. NIPOST. Archived from the original on 2009-10-07. Retrieved on 2009-10-20.