Igbo cuisine

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Igbo cuisine
Abacha (Salad Africa)

Nri ndị Igbo bụ nri dị iche iche eji mara ndị Igbo na ndịda ọwụwa anyanwụ nke Nigeria . Ihe oriri ha agụnyere ụdị nri di iche iche, otu esi esi ha, na ụdị akwụkwọ nri dị iche iche anụ,nakwa mkpụrụosisi ndị mejupụtara nri omenala ha. Nri Igbo, dị ka ọ dị n'omenaala niile, enweela ihe mgbanwe site n' gburugburu ha, mmekọrita ndi agbata obi ha nakwa akụkọ eji mara ha.

E nwere ọtụtụ erimeri eji mara ndị Igbo mana nke kacha pụta ihe ndi igbo na South-East na South-South na-eri bụ Abacha bụ nke a makwaara nke ọma dị ka Salad Africa. Abacha bụ nri na ewu ewu n'ala igbo niile di n'ọdịda anyanwụ nke Nigeria. Ọ bụ site n'akpụ akwọrọ,echere n'anwụ, mmanụ nri,akanwụ,yabasị eberiri eberi,nnu, ose kpọrọ nkụ,isha akwọrọ akwọ,ụtazi ebere ebe, magị na ụgba. E nwere ike iri abacha dika ihe eji ejide agụụ maọbụ nri zuru oke. A na-eji azụ ọkpọọ/asa maọbụ kpọmo wee rie ya (anụ ahụ ehi).

Nri sekpụ ntị na nri ndị igbo bụ ofe ha. Ofe ndị akacha mara bụ ofe Ọha, onugbo, Egwusi na NsalaIsi ihe ndi Igbo bu nri ya. Achịcha ndị a na-adọrọ mmasị bụ Oha, Onugbu, Egwusi na Nsala (white soup) . Ji bụ nri ndi igbo na-erikari , a na-esi ya esi maọbụ sụọ ya asụ were ofe rie ya.

Ihe oriri ndị kacha pụta ihe[dezie | dezie ebe o si]

  • Nri ji ma'obu akpu na ofe Ọha [1]
  • Nri ji ma'obu akpu na ofe Egwusi
  • Nri ji ma'obu akpu na ofe Nsala
  • Nri ji ma'obu na ofe Onugbu
  • Nri ji ma'obu akpu na ofe Ọkrọ
  • Ji Akwukwo nri
  • Nkwobi
  • Abacha
  • Ọkpa
  • Akịdị na ji
  • Anyụ
  • Ede na akwukwo nri
  • ụkwa

Ebe nsi nweta[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ ndị dị n'èzí[dezie | dezie ebe o si]