Ijeoma Egbunine

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ijeoma Egbunine
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereIjeoma Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya30 Disemba 1980 Dezie
Ebe ọmụmụLagos Dezie
Ọrụ ọ na-arụboxer Dezie
ụdị egwuregwuboxing Dezie

Ijeoma Egbunine, onye ana etu aha, "The Praise" (amuru na ubochi 30 na onwa December na afọ 1980 na obodo Lagos na Nigeria) bu nwanyi na eti "ọ"kp"ọ" tulu ugo mmeri nke WBE na WIBF na uwa nile. Ona enweta nkwado iti "ọ"kp"ọ" na aka Henry Okafor, onye nke n"ọ" na otu "Team Praise" na obodo Marietta nke di na Georgia di na obodo United States.

Biography[dezie | dezie ebe o si]

Ijeoma Egbunine meriri site na nkwekọrita ndi nyocha nile na egwuriegwu iti ọkpọ ukwu nke mbu ya nke ya na Janaya Davis tiri na December 2004. Davis juru inabata nkpebi a, wee si na ndi kwadoro egwuriegwu ahu mere ka ya ghara imeri. Ihe ndi okwuru atọghi Egbunine ọchi, mere ka Egbunine si na ya ga egosi ya ihe ya ji we kara ya oge ọzọ ha ga eti ọkpọ. Egbunine kupuru Davis, bu onye obodo Atlanta, na round nke abụọ na February na afọ 2005 mgbe ha zukọtara na iti  ọkpọ nke abuọ. Dika esi wee kọọ ya, "Na round nke abụọ, onweghi onye nime ha abuọ ji nwayọ tutu ọbara ha abụọ na agbọzi di ka mmiri ọkụ. Na ọkara nkeji na round nke abụọ, Egbunine  jiri aka nri wee kụtuo Davis mere ka odaa n'ala. Davis nwara ike ya ikunite ugboro abụ ma na okweghi ya. Mgbe ojisiri ike bilie kwụrụ ọtọ, Jim Korb bu onye nchikwa wee kwụsi egwuriegwu ahu-Jose Santiago.