Ijeoma Umebinyuo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ijeoma Umebinyuo
MúrúLagos, Nigeria
OrüOnye edemede akwụkwọ ukwe

Ijeoma Umebinyuo bụ onye edemede akwụkwọ ukwe nke amụrụ na Lagos di na obodo Naijiria. Akwụkwọ ukwe nke mbụ odepụtara na asụsụ bekee bụ nke ana akpọ "Ajụjụ nke aga ajụ Ada" nke atughariri na asụsu Portuguese, Turkish, Spanish, Russian na French.[1]

Akuko Ndụ ya[dezie | dezie ebe o si]

Umebinyuo bụ nwa afọ ịgbo nke amụrụ ma zụọ na obodo Naijiria. Nna Umebinyuo mara iwu ka obido debe akwụkwụ mgbe ọ gbara afọ asaa. Umebinyuo bidoro debe akwụkwọ ukwe mgbe ọ gbara afọ iri.[2] Nwata nwoke nke ana akpọ Adede bụ onye kwalitere ihụnanya nke Umebinyuo nwere maka ide akwụkwụ ukwe.[3]

Ihe O Ritere[dezie | dezie ebe o si]

Na afọ 2016, ndi otu Writivism depụtara na Umebinyuo bụ onye nke mbụ na ọnụ ọgụgụ nmadụ iri na njikọta Sub-Saharan Africa.[4]

Ihe Nkwalite[dezie | dezie ebe o si]