Ikeji festival

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Ememme Ikeji bụ mmemme ụbọchị anọ nke ndị Igbo nọ n'Arondizuogu, [1] na steeti Imo, Naijiria na-eme kwa afọ, n'etiti ọnwa Maachị na Eprel iji mee mmemme owuwe ihe ubi ji ọhụrụ na omenala Igbo. Mmalite mmemme Ikeji malitere na narị afọ ise ma bụrụ emume ndị Igbo na-ejikọ agbụrụ niile n'ụwa niile ka ha na-alaghachi na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ Naijiria ka ha gbaa ama wee sonye na mmemme ahụ. [2]Ha na egosiputa ọtụtụ masquerades na-agba egwu gburugburu obodo, egwu na omume okpukperechi ọdịnala ndị Igbo. [3]

Ha enwe echiche abuo Soro na ije meburu na mmemme nke Ikeji mana echiche nke ndị Arondizuogu nabatara n'ozuzu ha kwuru na mmemme Ikeji mbụ mere na narị afọ nke iri na isii [4] na ebumnuche ya wee bụrụ naanị ekele maka chi nke ala. maka inye ha ezigbo owuwe ihe ubi ji ọhụrụ.

Ememe Ikeji bụ isi iyi na-enweta ego na Naijiria site na njem nlegharị anya dịka ndị mba ọzọ nakwa ndị Igbo niile nọ na mba ọzọ na-agaghachi na Arondizuogu iji hụ mmemme ahụ. [5]

Mmemme dị iche iche ha ji wee mara mmemme Ikeji; nke kachasị ewu ewu bụ asọmpi aha ya bụ Ito-Ebule, nke sụgharịrị "Ịtọhapụ ebule". [6] Ọ bụ mmemme kacha atụ anya ma na-eme n'ụbọchị ikpeazụ nke ememme Ikeji.ihe eji mara Ito-Ebule bụ ngosipụta nke ike mgbaasị [7] site n'aka ndị dị iche iche na-akpọpụta onwe ha ndị dibịa afa bụ́ ndị si na mpaghara nile bịa jiri obi ha nile sonye n'asọmpi Ito-Ebule. N'oge asọmpi Ito-Ebule, a na-ekekọta ebule n'osisi, a na-agwakwa ndị dibịa afa ndị batara asọmpi ka ha gaa tọpụ ebule ahụ. Na ọdịnala ndị Arondizuogu, ọ bụ naanị onye mgbaasị kacha ike n'etiti ha niile nwere ike ịtọpụ ebule ahụ nke ọma. [8] [2]

Onye mgbaasị kacha nwee ihe ịga nke ọma, onye meriri asọmpi Ito-Ebule ọtụtụ oge site n'ịtọpụ ebule ahụ nke ọma kwa afọ, bụ praịm minista Pericoma Okoye onye omenala Arondizuogu. [9]

Na nkiri Nollywood ha egosiri mmemme ndị Ikeji na movie isiokwu ya bu Eze ndị Africa.

  1. Ebe niile chakere mgbe Arọndịzuọgụ mere Ikeji (ig). BBC News Ìgbò (2019-04-16). Retrieved on 2021-01-12.
  2. 2.0 2.1 Obi-Young (2020-12-24). Ikeji, the Biggest Festival in Igboland (en-US). Folio. Retrieved on 2021-01-12.
  3. Ikeji Festival In Arondizogu (en-US). National Institute for Cultural Orientation (NICO) (2014-09-17). Retrieved on 2021-01-12.
  4. Origin, relevance of Ikeji festival (en-US). Latest Nigeria News, Nigerian Newspapers, Politics (2018-10-23). Retrieved on 2021-01-12.
  5. Ikeji Festival of Arondizuogu (Imo State, Nigeria) (en-US). Afro Tourism (2016-12-15). Archived from the original on 2021-01-14. Retrieved on 2021-01-12.
  6. Ikeji Festival, Festivals And Carnivals In Imo State :: Nigeria Information & Guide. www.nigeriagalleria.com. Retrieved on 2021-01-12.
  7. "In pictures: Wearing fancy dress for big yams in Nigeria", BBC News, 2019-04-20. Retrieved on 2021-01-12. (in en-gb)
  8. Nico. Ikeji Festival In Arondizogu – NICO (en-US). Retrieved on 2021-07-12.
  9. Perikoma: The Lion of Africa Goes Home–Ifeanyi Calistus | Ikenga Chronicles (en-US). Archived from the original on 2021-01-13. Retrieved on 2021-01-12.