Ikpuchi ihu n'oge ọrịa coronavairọs 2019-20 nke gazuru ụwa niile

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Ihe gọọmenti chọrọ ka a na-eme?[dezie | dezie ebe o si]

Ikpuchi ihu n'oge ọrịa coronavairọs 2019-20 gazuru ụwa niile bụ nke ọtụtụ ndị ọrụ ahụike na gọọmenti kwurula ihe dị iche iche banyere ya. Isiokwu a bụ nke butere ọtụtụ nrụrịta ụka n'etiti ndị ọrụ ahụike na gọọmenti dị iche iche. Ha ekweteghị n'otu ụzọ e si eyi ihe mkpuchi ihu n'ụwa niile.

Ihe kpatara ya[dezie | dezie ebe o si]

Ụfọdụ ihe kpatara ndị ọrụ ahụike na China ji ekpuchi ihu ha, tumadị ndị ahụ zuru okè, bụ ndị a:[1] Nkesa ọrịa na-egosighị mgbaàmà(mbute ọrịa site n'aka ndị na egosibeghị mgbaàmà). Ọtụtụ ndị mmadụ nwere ibute ọrịa ma ha anaghị egosi mgbaàmà ọbụla maọbụ obere mgbaàmà. Enweghị ike inye ohere n'etiti mmadụ na ibe ya n'ebe ndị mmadụ nọ oge ọbụla Ọnụahịa-na uru na-adabaghị̀ (enwetaghị uru). Ọ bụrụ na naanị ndi bu nje na-ekpuchi ihu, e nwere ike inye ha iwu i ji were hụ na ha na-ekpu ya. Onye ebughị nje nwere ike ọgaghị erite ihe ọbụla maka ikpu ya. Ọ ga-edi mgbaka ahụ so ya, ego o ji zụrụ ya nakwa ozize na ekwurekwu ọ ga-anata n'aka ndị mmadụ . Onye ọkachamara nje vairọs na Mahadum nke Leeds a kpọrọ Stephen Griffin na-ekwu na " I yi ihe mkpuchi ihu ga-eme ka ndị mmadụ belata ka ha si emetụ aka n'ihu ha, nke bụ ụzọ a na-esikarị ebute nje a ma ọ bụrụ na-edebeghị aka ọcha nke ọma."[2]

Ụdị ihe mkpuchi ihu dị iche iche e nwere[dezie | dezie ebe o si]

Ihe mkpuchi ihu eji awa ahụ nwere ohere, enwere ike itufu, bụkwa nke na-etinye nkewa n'etiti ọnụ na imi onye kpu ya na ụmụ nje ga-emebi gburugburu ezi. bụ mkpuchi ihu eji akwa nkịtị kwaá bụ nke na-ekpuchi ọnụ na imi, a na-ejikarị akwa cotton mee. Ọdị iche na mkpuchi ihu ndị na-awa ahụ na ìgwè eji ekute ume, n'ihi na ọ nweghị iwu megidere otu esi ekpu ya. Ka ọ dị ugbu a, e nwere obere nnyocha ma ọ bụ ntụziaka na írè ha ka ihe mkpuchi ihu maka nkesa ọrịa na-efé efè maọbụ ụmụ irighiri mmiri na-emebi ikuku.

Ihe mkpuchi e ji awa mmadụ ahụ bụ ihe a na-ekpu otu ugboro nke na-ebute nkewa n'etiti onye kpu ya na ihe nwere ike imetọ ya ahụ ebe ọ nọ, Ihe mkpuchi ihu nke a bụ nke a rụrụ i ji were mee ka ọkpụrụkpụ ihe dị mmiri mmiri na-apụta mmadụ n'ahụ nwere ike ibu nje na bakteria ghara ịba onye kpu ya n'imi na ọnụ ma o kpuru ya nke ọma. O na-egbochikwa asọ mmiri onye kpu ya na ihe nwere ike ịpụta ya n'imi,[3] Emeghị ihe mkpuchi ihu e ji awa mmadụ ahụ ka o gbochie ụmụ kịrịkịrị ihe dị n'ikuku si n'ahụ onye kwara ụkwara, zee uzere ma ọ bụ ihe ndị ọzọ. Ọ naghịkwa egbochi nje na ihe ndị ọzọ dị ka ya n'ihi na ọ naghị arapara n'ahụ onye kpu ya. Ejighị akwa a kpara akpa were rụ ụdị ihe mkpuchi ihu a. E mere ihe e ji rụ ya mgbaze.[4] [5]

Ihe mkpuchi ihu N95 bụ nke nwere respiretọ na-ayọchapụ kịrịkịrị ihe dị n'ikuku nke ruru ọkwa N95 n'ịyọpụ ihe dị n'ikuku nke Ụlọ mmụta na-ahụ maka Nchekwa na Ahụ ike ndị ọrụ (National Institute for Occupational Safety and Health). Ọ na-ayọpụ pacenti 95 nke ihe dị n'ikuku. Ọ dị ka igwe respiretọ na-ayọpụ ihe nke na-eme ka onye kpu nwee nchekwa ebe ihe dị n'ikuku dị ma e wepụ gas na vepọ.[6] Dị ka nke e ji awa mmadụ ahụ, N95 abụghị akwa a kpara akpa. ihe e ji rụ bụ polipropaịlịn.[7] [8] Nke dị ka ya bụ nke ndị otu jikọrọ mba Yurop na-egbu bụ FFP2 respiretọ. [9] [10]

Ihe Otu na-ahụ maka Ahụike kwuru[dezie | dezie ebe o si]

Otu na-ahụ maka ahụike e kwuola ka ndị mmadụ jiri nku aka ha ma ọ bụ tishiu na-ekpuchi ọnụ ha mgbe ha na-akwa ụkwara ma ọ bụ eze uzere, ma tufuo tishiu ahụ ozigbo. [11] [12] Ihe mkpuchi ihu nke e ji awa mmadụ ahụ bụ nke e kwuru na ndị a na-ele anya na ha bu nje ga na-ekpu ya,[13] [14] [15] maka na i kpu ya ga-egbochilata ka ụmụ kịrịkịrị ihe si n'imi na ọnụ apụta mgbe a na-ekwu okwu, eze uzere ma ọ bụ na-akwa ụkwara. [16]

Ihe Otu na-ahụ maka Ahụ ike Mba Ụwa kwuru[dezie | dezie ebe o si]

Ndụmọdụ ndị Otu na-ahụ maka Ahụ ike Mba Ụwa nyere ndị mmadụ banyere COVID-19 kwadoro ndị mmadụ ikpu ihe mkpuchi ihu n'ọnọdụ ndị a: [17]

  • Ọ bụrụ na ahụ dị gị, i ga-eyi ihe mkpuchi ihu naanị mgbe i na-eleta onye ọ dị ka o nwere nje korona.
  • Yiri ihe mkpuchi ihu ma ọ bụrụ na ị na-akwa ụkwara ma ọ bụ na-eze uzere.
  • Ihe e ji ekpuchi ihu di ire naanị mgbe onye kpu ji ihe nhicha aka e ji mmanya ọkụ rụo akwọ aka mgbe obula maobu ncha na mmiri.
  • Ọ bụrụ na i yiri ihe mkpuchi ihu, ị ga-amatarịrị ka e si eyi ya ma na-etufu kwa ya nke ọma.

Ikpuchi ihu na iwu so ya dịka o si dị na mba na gburugburu Afrika[dezie | dezie ebe o si]

  • Binin: Bido n'Eprel 8, ndị ọchịchị Binin bidoro ịhụ na onye ọbụla na-eyi ihe mkpuchi ihu iji kwụsị mgbasa nje coronavairos. [18]
  • Cameroon: Onye Isi akụkụ obodo Cameroon kwuru na ikpuchi ihu bụ iwu iji belata mgbasa ọrịa nje coronavairọs. [19]
  • Mba Kongo: Ikpuchi ihu bụzi iwu ugbu a na gburugburu niile n'isi obodo. [20]
  • Ethiopia: Kansụl ndị Minista akwadola iwu e ji machi i kwe mmadụ n'aka ma mekwaa ka ikpuchi ihu ebe ndị mmadụ nọ bụrụ iwu. [21]
  • Guinea: Onye isi ala mba Guinea bụ Alpha Conde ekpebiela ime mkpuchi ihu ka ọ bụrụ iwu. [22]
  • Kenya: Ikpuchi ihu bụ iwu. Gọọmenti agwala ndị Kenya ka ha gbaa mbọ hụ na ha dowere iwu abiaghị mmadụ nso nke e mere ka a mara na ọ bụ otu n'ime ụzọ e si egbochi mbufe ọrịa. [23]
  • Liberia: Bido n'Eprel 21, ọ bụ iwu ikpuchi ihu n'ebe ndị mmadụ nọ. [24]
  • Morocco: Ikpuchi ihu bụ iwu. [25]

References[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Why healthy Chinese wearing face masks outdoors?". NHC.gov.cn. Chinese Center for Disease Control and Prevention. 23 March 2020. Archived from the original on 10 April 2020.
  2. "How to avoid touching your face so much". BBC News. 18 March 2020.
  3. "N95 Respirators and Surgical Masks (Face Masks)". U.S. Food and Drug Administration. 11 March 2020. Retrieved 28 March 2020.
  4. "Not Enough Face Masks Are Made In America To Deal With Coronavirus". NPR.org. 5 March 2020. Retrieved 10 April 2020.
  5. "Chinese mask makers use loopholes to speed up regulatory approval". Financial Times. 1 April 2020. Retrieved 10 April 2020.
  6. "Respirator Trusted-Source: Selection FAQs". U.S. National Institute for Occupational Safety and Health. 12 March 2020. Retrieved 28 March 2020.
  7. |Zie, John (19 March 2020). "World Depends on China for Face Masks But Can Country Deliver?". Voice of America.
  8. Feng, Emily (16 March 2020). "COVID-19 Has Caused A Shortage Of Face Masks. But They're Surprisingly Hard To Make". NPR.
  9. "Comparison of FFP2, KN95, and N95 and Other Filtering Facepiece Respirator Classes" (PDF). 3M Technical Data Bulletin. 1 January 2020. Retrieved 28 March 2020.
  10. Strategies for Optimizing the Supply of N95 Respirators: Crisis/Alternate Strategies". U.S. Centers for Disease Control and Prevention. 17 March 2020. Retrieved 28 March 2020.
  11. "Advice for public". World Health Organization. Retrieved 8 February 2020.
  12. Home. "Novel Coronavirus". HPSC.ie. Health Protection Surveillance Centre of Ireland. Retrieved 27 February 2020
  13. "Severe Respiratory Disease associated with a Novel Infectious Agent". Government of Hong Kong. Retrieved 1 February 2020.
  14. "Updates on Wuhan Coronavirus (2019-nCoV) Local Situation". MoH.gov.sg. Ministry of Health of Singapore. Retrieved 1 February 2020.
  15. "Advice on the use of masks in the community, during home care and in health care settings in the context of the novel coronavirus (2019-nCoV) outbreak". World Health Organization. Retrieved 21 February 2020.
  16. "2019-nCoV: What the Public Should Do". US Centers for Disease Control and Prevention. 4 February 2020. Retrieved 5 February 2020.
  17. "Coronavirus disease (COVID-19) advice for the public: When and how to use masks". World Health Organization. World Health Organization. 2020. Retrieved 6 April 2020.
  18. Benin Police Enforce Mask Wearing In Bid To Stop Virus,Barron's, 8 April 2020.
  19. Cameroon City Makes Wearing Mask Mandatory in Fight Against Coronavirus,VOA News, 7 April 2020.
  20. Tasamba, James (19 April 2020). "Rwanda, DR Congo make mask wearing mandatory".
  21. Samuel, Gelila (12 April 2020). "Ethiopia Outlaws Handshakes, Obliges Masks in Public Places".
  22. Masilela, Brenda (14 April 2020). "Guinean president makes masks compulsory in bid to curb the spread of coronavirus".,IOL
  23. Muraya, Joseph (5 April 2020). "Kenya: Masks Now Mandatory in Public Places, Kenya Declares".,All Africa
  24. Senkpeni, Alpha Daffae (21 April 2020). "Will You Wear Mask? Liberia's Lawmakers Want Compulsory Wearing of 'Protective Device' In Public".,Front Page Africa
  25. Eljechtimi, Ahmed (6 April 2020). "Morocco makes face masks compulsory due to coronavirus". Reuters. Retrieved 11 April 2020.