Inna Modja

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Inna Modja
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịMali Dezie
Aha ọmụmụInna Bocoum Dezie
Aha enyereInna Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya19 Mee 1984 Dezie
Ebe ọmụmụBamako Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaFrench language Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee, onye na-abụ abụ, model Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2009 Dezie
agbụrụ Dezie
so naWorld Economic Forum Annual Meeting 2022 Dezie
ụdị olucontralto Dezie
ngwa egwuolu egwụ Dezie
ụdịpop music, rapping Dezie
akara ndekọWarner Music Group Dezie
webụsaịtịhttp://www.innamodja.com/ Dezie

Inna Bocoum, Amakwaara dị ka Inna Modja (amụrụ n'abalị iri na iteghete nke ọnwa Mee , afọ 1984), bụ amala Malian- French, bụ nwanyị na-abụ abụ n'emekwa ihe ngosi nlereanya mma. "Modja" pụtara "ọjọọ, adịghị mma" na Fulfulde . [1] [2]

Oge nwata na oge uto[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya na Mee 19, 1984, na Bamako, Mali, na ezinụlọ Fula, Ma bụrụ onye nke isii n'ime ụmụ asaa, Inna Bocoum bu nne ya gụrụ ya aha a, bụ onye nyere ya aha a bụ Inna Modja, nke pụtara "Inna dị njọ" ma ọ bụ. "Inna adịghị mma" na Fulfulde. Mgbe ọ dị afọ isii, ndị mụrụ ya debara aha ya n'òtù ukwe. N'ụlọ, nna ya gbara ya ume ka ọ nwee ọganihu site n'ịkpọrọ́ ya ụfọdụ ndekọ masịrị ya (ndị nwere nka dị ka Ray Charles, Ella Fitzgerald, Otis Redding, Sarah Vaughan )ọ nwekwara mkpali mmụọ ya site na ụmụnne ya ndị tọrọ ya, bụ ndị gbanwere na Thrash Punk, na Rap, Oge Heavy Metal nke ndị 80 ma ọ bụ 90, na mgbakwunye Blues, Soul and Disco . Mgbe ọ dị afọ iri na ụma, ọ ka na-atụgharị n'etiti Hard Rock na egwu ịhụnanya. Ọ na-eleta onye agbata obi ya mgbe niile, Salif Keita, bụ onye na-akpọ ya òkù ka o sonye na Rail Band nke Bamako, otu ndị agadi nwoke na-efegharị efegharị ( Bossa Nova na Jazz ), n'etiti ndị ya onwe ya gbara akwụkwọ.

Ọ na-ekwu okwu megide ibi úgwù nwanyị, ebe ya onwe ya na ụmụnne ya nwanyị anọ bụ ndị ebere úgwù na-enweghị nkwado nne na nna ha, ihe omume ọ gụrụ banyere ya n'otu egwu ya. Ebe ọ bụ na a wara ya ahụ. Ọ na-ekwukwa okwu megide ime ihe ike megide ụmụ nwanyị, nke o gosipụtara na vidiyo nke egwu ya bụ "La Valse de Marylore".

2009: Ọrụ mmalite na ụbọchị ọ bụla bụ ụwa ọhụrụ[dezie | dezie ebe o si]

Site n'ahụmahụ ndị a, Inna Modja mụtara ime nsokwunye na ụda ukwe dị iche iche, dị ka Swing ma ọ bụ Disco. O dabere na ụda Pop na Soul. Mgbe ọ pụtachara na ihe nkiri TV pụrụ iche Fête de la Musique mepụtara nke France 2 na- abụ abụ duet tinyere Jason Mraz na egwu ya " Lucky ", Inna Modja megheere Sliimy n'ọtụtụ ihe ngosi ya. Ọ wepụtara otu egwu mbụ ya, "Mista H", nke agụnyere na album mbụ ya "Everyday is a New World", nke ewepụtara n'ọnwa Ọktoba, 2009. Ọ kwadoro ya site na ngosipụta na ọtụtụ ihe ngosi TV, gụnyere "Vivement Dimanche" na " Taratata ".

2011–ka ọ dị ugbu a: Mgbanwe ịhụnanya[dezie | dezie ebe o si]

O guhachiri site n'otu ohuru ya bụ"French Cancan (Monsieur Sainte Nitouche)" na Jun 2011ngwa ngwa , ọ ghọrọ otu n'ime nnukwu egwu oge okpomọkụ kpụ ọkụnonu, bụ Summer hits nke 2011 na France wee bụrụ nke anọ na SNEP French Singles Chart . Ọ gbasoro ihe ịga nke ọma a tinyere "La Fille du Lido", nke abụọ na albọm ya nke abụọ bụ "Love Revolution" nke ewepụtara n'onwa Nọvemba 7. O sonyere na Téléthon bụ kwa afọ, nke baara Association France megide Myopathy uru. Vidio egwu maka otu nke atọ, "I am smiling" (Febrụwarị 2012), bụ nke sitere na vidiyo sitere na ndị na-akwado ya.

O nyere ntunye mkpuchi nke "Souris Puisque C'est Grave" na albọm mkpuchi nke Alain Chamfort bụ̀ Elles & Lui (2012), wee gbazinye olu ya na otu ọrụ ebere "Je Reprends Ma Route", iji ritere otu ahụ uru nke"Les Voix de". nwa".

Na 2018 o Sonyere na nke nlegharị anya, na mkpali mmụọ nke Laurent Ruquier , nke Claude Bolling 's Les Parisiennes .

Ihe ngosi[dezie | dezie ebe o si]

Albọm[dezie | dezie ebe o si]

Afọ Aha Ọnọdụ Asambodo
FRA BEL
2009 Everyday Is a New World
56
-
2011 Love Resolution
28
98
FRA: ọla edo
2015 Motel Bamako
55
-

Ndị bụ naanị otu[dezie | dezie ebe o si]

Afọ Naanị otu Ọkwa chaatị kacha elu Album
BEL<br id="mwdA"><br><br><br></br> (WA)



</br> [3]
IKE



</br> [4]
FRA



</br> [5]
SWI



</br> [6]
2009 Mister - - - - Kwa ụbọchị Bụ Ụwa Ọhụrụ
2010 Life - - - - Ịhụnanya mgbanwe
2011 Cancan French (Monsieur Sainte Nitouche) 6 55 4 60
"La fille du Lido" - 86 82 -
2012 I Am Smiling - 83 - -
2014 Forgive yourself - - 129 - Motel Bamako
I Want your Sex(Inna Modja Na Woodboyz) - - - -
2015 "Tombouctou" - - 147 -

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

 

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  1. Les mutilations sexuelles feminines Etat des lieux
  2. The actual word in the Fula language (Fulfulde) is moƴƴa, being a negative form from the root moƴƴ- (good). "Modja" is a Francified transcription.
  3. Wallonia peaks
  4. [[[:Àtụ:BillboardURLbyName]] Canadian peaks]
  5. French peaks
  6. Swiss peaks