Internally Displaced Person Camp in Lagos

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Ogige ndị a chụpụrụ n'ime obodo na Lagos dị n'ógbè Ibeju Lekki nke Lagos Steeti,Fededral Gọọmentị guzobere ya na nkeji iri na ise nke afọ 2016 iji lekọta ndị mbịarambịa na ndị a chụrụ n'ime steeti ahụ yana ije ozi dị ka ebe njikọta.

E guzobere ụlọ ọrụ ahụ na mmekorita ya na Web of Hearts, nke bụ nzukọ na-abụghị nke gọọmentị nke dị na Lagos Steeti. Ọ bụ Hajiya Hadiza Sani Kangiwa, onye bụ Honorable Federal Commissioner, National Commission for Refugees, Migrants, and Internally Displaced Persons, nyere ụlọ ọrụ ahụ iwu.

Dị ka Hajiya Kangiwa si kwuo n'oge ọrụ a bụ iji rụọ ọrụ dị ka akụkụ nke mmemme Assisted Volunteer Return and Reintegration (AVRR). Anyị guzobere ya na mmekorita ya na Web of Hearts onye anyị na ya bịanyere aka na Memorandum of Understanding n'oge na-adịbeghị anya iji rụọ ọrụ dị ka ebe njem ebe a ga-enye ndị mbịarambịa na-alaghachi ọrụ ndụmọdụ, ntụziaka, njikọta ezinụlọ, nnweta nkà, ọzụzụ, ebe obibi nwa oge na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ọzọkwa, onye isi nchịkwa nke Web of Hearts, Bose Aggrey kwenyere na ebe ahụ ga-akpali ndị Naijiria nọ na mba ọzọ ịlaghachi n'ụlọ.[1][2]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Our Reporter. FG establishes IDP centre in Lagos. thenationonlineng.net. The Nation. Retrieved on 24 June 2017.
  2. Information Nigeria. FG Establishes IDP Centre In Lagos. informationng.com. Information Nigeria. Retrieved on 24 June 2017.