Ite mmanya/nkwu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
mmanya nkwụ nọ na ite

Ndị Igbo na Naijiria bụ ndị eji ite nkwụ wee mara . E ji mmanya ọcha /nkwụ eme emume niile na emume ọdịnala nile a na-eme n'ala Igbo .E ji ite nkwụ /mmanya mara ndi Igbo. Ọ bụ ndị ji ya mere aka ọrụ ji ya eri jụ afọ site na n'ihe ha tetara na nkwụ na nkwo. Dika omenaala, nwoke Igbo na-ete nkwụ /mmanya ọcha. Mmanya ọcha, nkwụ ma ọ bụ ngwo na aba na anya ma na-egbukwa egbu, ọ na-esite na ọmụ nkwụ dị iche iche apụta. A na-ewepụta mmanya ọcha ahụ site na ifuru osisi nkwụ. Mmanya nkwụ na-arụ ọrụ dị mkpa n'ọtụtụ emume na ala Igbo.[1]

Ndi eji ite mmanya wee mara bụ ndị Enugu Ezike, Ikeduru na ndị Udi, ebe esi eweta mmanya ngwo n'uju bu Ugwuoba na Oba. Otu o sila dị, ndị Enugwu bụ ndị a ma ama dịka ndị na-akụ nkwụ kacha mma. Iji maa atụ, ndị Udi bụ ndị amara maka 'aneke achime'. Nke a bụ aha jikọtara mmanya nkwụ ha n'ihi oke mma ya. Ndị Akpugo na ndị Agbani nke Nkanu Enugu na-agbanyekwa mmanya ọma n’ụba. Ọ bụ na Akpugo ka ndị Enugwu na-agakarị zụta oke nkwụ ha ji eme emume. A na-ere mmanya a n’ahịa Oboo na ahịa Orie Mba, ha niile dị n’ugo.

Nwoke Igbo na ama ụdị nkwụ site na ị detụ ya ire. Ogwuduani bụ mmanya nkwụ sitere na nkwụ dara ada, ana-ahapụ nkwu a ka ọ nọrọ ihe dị ka izu atọ ma ọ bụ anọ tupu usoro ịpị aka ya amalite. N’aka nke ọzọ, na-akụ nkwuenu n’ọbụ aka ya na-adaghị. Ihe nkwụ mmanya na-arị elu na nkwụ na eriri ya. Isị mmanya a ka ihe kacha mma n’ihi na ọ na-atọ ụtọ mgbe ụfọdụ n’ọnụ. Enwere ike inye ya nne nke na-enye nwa ara ka ọ bawanye mmiri ara ya. Ka o sina dị, ndị agadi na-ahọrọ ogwuduani n’ihi na ọ ka ike.

abọ foto[dezie | dezie ebe o si]


Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. J. C Onuora (2015). Usoro Omumu Igbo Maka Sekondri Nta. 25 Awka Road, Onitsha: Patmonic Printers & Publishers Ltd. ISBN 978-978-48032-4-3.