Jacci Gresham

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Jacci Gresham
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNjikota Obodo Amerika Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1961 Dezie
Ebe ọmụmụFlint Dezie
Ọrụ ọ na-arụtattoo artist Dezie

Jacci Gresham (amụrụ n'afọ 1951) bụ nwanyị ojii mbụ a ma ama na-egbu egbugbu na United States. Ọ si Flint, Michigan, US.[1][2] Ọ bi na New Orleans kemgbe afọ 1976. Ụlọ ahịa ya, Aart Accent Tattoos & Body Piercing, bụ azụmahịa egbugbu na-aga n'ihu na Louisiana.[3] N'oge mmeghe ya, ọ bụ otu n'ime naanị ụmụ nwanyị ise na-egbu egbugbu na United States, na naanị nwanyị na-egbu egbu na New Orleans.[1] N'afọ 2011, a kwanyeere ya ùgwù dị ka ónyé ọsụ ụzọ nke ndị na-ese egbugbu.[4]

Mbido ndụ na ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Gresham nwèrè mmasị ise ihe mgbè ọ bụ nwata. Na kọleji, ọ gụrụ ihe owuwu na injinia. Mgbè ọ gụsịrị akwụkwọ, ọ malitere ịrụ ọrụ maka General Motors na-emepụta atụmatụ ala màkà ndị na-ere ụgbọ ala. Mgbe ọ dị afọ irí abụọ na isé, mgbè ọ na-arụ ọrụ na ụlọ ọrụ injinia, ọ zutere Ajit "Ali" Singh. Ha abụọ mechara gaa New Orleans na-achọ ọrụ, mànà ha enweghị ihe ịga nke ọma. N'oge ahụ, e nwèrè naanị ụlọ ahịa egbugbu abụọ na New Orleans. N'elu nchọpụta a, Gresham na Singh meghere ihe bụ ụlọ ahịa egbugbu nke atọ na New Orleans. Mgbè ha meghere ụlọ ahịa a, Gresham enweghị ahụmịhe, ọbụnakwa egbugbu nke ya. N'ikpeazụ, ụlọ ahịa abụọ dị ugbu a emechiela, na-eme ka Aart Accent bụrụ nke kacha ochie na New Orleans.[1]

Jacci Gresham n'ihu ụlọ ahịa ya dị nso na Rampart Street

Afọ 1950 - Afọ 1970[dezie | dezie ebe o si]

N'etiti afọ 1950s na 1970, ụmụ nwanyị na ụlọ ọrụ egbugbu dị ụkọ. Ụmụ nwanyị na-enweta nnabata n'ime ụlọ ahịa egbugbu naanị ma ọ bụrụ na ha na-eme mkpapụ ma ọ bụ lụọ otu n'ime ndị na-egbu egbugbu. Na mbido afọ 1970, Jacci Gresham ghọrọ ónyé ọsụ ụzọ nke ụmụ nwanyị na-egbu egbugbu nke nyéré áká kwadebe ụzọ màkà ịrị elu nke ụmụ nwanyị ndị ọzọ na-ese egbugbu na-abanye na ụlọ ọrụ ahụ.[5]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 Riess. The oldest tattoo shop in New Orleans (en). Gambit. Archived from the original on 2018-02-04. Retrieved on 2018-02-03.
  2. DeMello (2014). Inked: Tattoos and Body Art around the World. Santa Barbara, California: ABC-CLIO, 234. 
  3. Simon. "Making Their Mark", Baltimore Sun, May 29, 2008. Retrieved on March 31, 2017.
  4. Aart Accent Tattooing-Jacci. Tattoo.com. Archived from the original on November 14, 2017. Retrieved on March 31, 2017.
  5. Thompson (2015). Covered in ink : tattoos, women, and the politics of the body. ISBN 978-0-8147-8599-7. OCLC 951103392.