Gaa na ọdịnaya

Jean-Baptiste Ngnetchopa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Jean-Baptiste Ngnetchopa (a mụrụ n'afọ 1953) bụ onye mba Cameroon na-akpụ osisi. O nwetara nlebara anya mba ụwa site na usoro akwụkwọ ego sitere na Afrịka nke o piputara n' osisi. Ọ pụtala na ihe ngosi mba ụwa na ihe ngosi dị ka Africa hoy na 1991.[1]

A mụrụ Ngnetchopa n'ezinụlọ ndị na-akpụ osisi ọdịnala sitere n'otu obodo nke ndị Bamileke na Cameroun.[2] Mgbe ọ dị afọ iri na isii, ọ banyere n'ọrụ mmụta afọ asaa.[3]

Ọrụ Ngnetchopa agbanwenyela n'ime nyocha nke, "mmekọrịta dị n'etiti nka, ike na ego" nke na-eme ka ụwa nke ọdịbendị pop na nka nke oge a.[4] Akwụkwọ ego ya na-eji agba ojii n'elu osisi ahu iji gosipụta nkọwa a pịrị apị na nke ihe edere n' opipi ahu.[5]

Ngnetchopa ekwuola na, "Ụfọdụ ndị ọgaranya na-etinye ego ha n'ime ụlọ. Ego a na-ehi ụra ma na-adalata n'uru. Ana m arịọ ndị ọgaranya a ka ha nyefee m akụkụ nke ego a, m ga-akpụ ha ego osisi nke ha nwere ike I Ji bie ma gosi ndị ọzọ. Ego osisi a ga-enwetakwa uru. "[6][7][8]

Ihe ngosi

[dezie | dezie ebe o si]
  • Art et Argent, liaisons dangereuses, Monnaie de Paris, Paris, France.
  • Ngosipụta Virtual (The Contemporary African Art Collection)
  • Platea dell’ Umanità - 49° Biennale di Venezia
  • Giardini di Castello / Arsenale - Venice VE, Italy (The Contemporary African Art Collection)
  • Africa hoy
  • Atlantic Center of Modern Art.
  • Las Palmas Gran Canary - Spain. (The Contemporary African Art Collection)

Edemsibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. ↑ (Oxford Art Online)
  2. ↑ (Oxford Art Online)
  3. ↑ (The Contemporary African Art Collection)
  4. ↑ (Oxford Art Online)
  5. ↑ Oxford Art Online
  6. ↑ (The Contemporary African Art Collection)
  7. ↑ Njami, Simon. "Ngnetchopa, Jean-Baptiste". Oxford Art Online. Oxford University Press. Retrieved 8 December 2016.
  8. ↑ Pigozzi, Jean. "Jean-Baptiste Ngnetchopa". CAACart. The Contemporary African Art Collection. Archived from the original on 20 December 2016. Retrieved 8 December 2016.