Jim Kosek

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Jim Kosek
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNjikota Obodo Amerika Dezie
Aha enyereJim Dezie
Ebe ọmụmụWest Pittston Dezie
Ọrụ ọ na-arụweather presenter Dezie
ebe agụmakwụkwọPennsylvania State University Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1985 Dezie

Jim Kosek bụ ónyé America na-ahụ màkà ihu igwe na telivishọn na-arụ ọrụ ugbu a dị ka onye isi na-ahụ Màkà ihu igwe na WAND na Decatur, Illinois. A maara Kosek nke ọma màkà ụdị ngosi ya, nke gụnyere mkpu na-ada ụda, mmegharị gabigara oke, njikọ na omenala a ma ama, na mkpu yiri nke ónyé na-eme ihe ọchị Sam Kinison.[1][2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Jim Kosek gụrụ meteorology na Mahadum Penn State, mgbè ọ gụsịrị akwụkwọ, ọ chọtara ọrụ na AccuWeather na 1985. Ọ bidoro dị ka ónyé na-ahụ màkà ihu igwe, mànà ọ malitere ime ihe dị ịtụnanya site n'ébé afọ 1990s gaa n'ihu. Business Insider akọwaala ya dị ka "Bill O'Reilly nke ihu igwe", site na The Washington Post dị ka "Al Roker zutere Sam Kinison," na Jimmy Kimmel dị ka ihe yiri "Glenn Beck kwesịrị ekwesị" ónyé na-ahụ màkà ihu igwe.[1][2][3] Ụbọchị ikpeazụ ya na Accuweather bụ ụbọchị iri na otu n'ọnwa Jenụwari, 2012.[4]

Ọ malitere ọrụ dị ka Chief Meteorologist màkà KTVX ABC 4 na Salt Lake City, Utah n'ubochi irí na asatọ n'ọnwa Jenụwarị, 2012, wee kwụsị ọrụ ya n'ogè ọkọchị nke afọ 2014. Dan Pope nọchiri ya bụ ónyé laghachiri na KTVX.[5] Mgbè KTVX gasịrị, Kosek bidoro igosi ihu igwe na KCTV na Kansas City, Missouri.[6]

Ọ sonyeere WGCL-TV na Atlanta n'ubochi mbu n'ọnwa Disemba, 2014, wee laghachi n'ọkwa Chief Meteorologist. Ụbọchị ikpeazụ Jim na WGCL bụ ụbọchị iri abụo na atọ n'ọnwa Juun, 2017, mgbè ụlọ ọrụ ahụ hapụrụ ya.[7] N'ọnwa Disemba nke afọ ahụ, ọ sonyeere WLTZ na Columbus, Georgia dị ka ónyé isi na-ahụ màkà ihu igwe nke ụlọ ọrụ ahụ ma nọrọ n'ọkwa ahụ ruo n'ọnwa Ọgọst 2019.[8][9]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Al Kaprielian

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Reagan (February 5, 2010). World's most extreme weatherman. Business Insider. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "businessinsider" defined multiple times with different content
  2. 2.0 2.1 Athas, Eric (February 13, 2010). AccuWeather forecaster Jim Kosek's over-the-top antics make him a Web sensation. The Washington Post. Retrieved 2011-04-07.
  3. From Jimmy Kimmel Live!: Weatherman Jim Kosek goes crazy about Bronx zoo cobra. ABC News. Retrieved April 7, 2011.
  4. Jim Kosek Facebook Fan Page. Facebook. Retrieved on January 26, 2012.
  5. Mediabistro.com. Retrieved on January 26, 2012.
  6. "Jim Kosek", KCTV5 News. Retrieved on March 27, 2018. (in en)
  7. Ho. "CBS46 (WGCL-TV) cuts Jim Kosek and four others", AJC, June 23, 2017. Retrieved on March 27, 2018.
  8. "Former CBS46's meteorologist Jim Kosek lands new job", ajc, December 4, 2017. Retrieved on September 14, 2018.
  9. "Jim Kosek - WLTZ", WLTZ, May 30, 2018. Retrieved on September 14, 2018. (in en-US)

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]