Jim Ovia

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Jim Ovia
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereJim Dezie
aha ezinụlọ yaOvie Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya4 Novemba 1951 Dezie
Ebe ọmụmụAgbor Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọchụnta ego, onye ọrụ ụlọ akụ Dezie
ụdị ọrụ yabanking industry Dezie
Ọkwá o jimanager Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Louisiana at Monroe, Southern University, Harvard Business School Dezie
Ebe ọrụNaijiria Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1990 Dezie
affiliationZenith Bank Dezie
affiliation stringZenith Bank Plc, Zenith Bank Dezie
nọchiriOlusola O Oladipo Dezie

Jim James Ovia (amụrụ ya na Nọvemba 4, 1951) bụ onye ọchụnta ego nke obodo Naịjirịa na obodo Delta. Ọ tọrọ ntọala Ụlọ akụ na 1990.

Ndụ mbido[dezie | dezie ebe o si]

Jim Ovia nwere akara ugo mmụta masịta ya na nchịkwa azụmahịa na Mahadum Louisiana, Monroe, Louisiana, USA n’afọ 1979 na B.Sc. ogo na nchịkwa azụmahịa na Mahadum Southern, Baton Rouge, Louisiana, USA (1977). Ọ bụkwa onye gụsịrị na nke Harvard Business Sukulu (OPM)

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụ onye tọrọ ntọala ụlọ akụ Zenith, o so na ụlọakụ kacha uru na ụlọ oru nke na-ahụ ihe gbasara ego na Naịjirịa ruo na 2010, mgbe o rigoro dịka onye isi oche. Ọ bụ onye natara onyinye nrite nke Naịjirịa.

N'ime afọ iri abụọ nke onye ndu, o nyere aka ịkwado ụlọ akụ ahụ dịka otu n'ime ndị kachasị baa uru na Afrịka.

Ovia bụ onye guzobere "Visafone Communications Limited" na onye isi oche nke ụlọ ọrụ ndị Naịjirịa nke "software Development Initiative" (NSDI) na ndị "National Information Technology Advisory Council" (NITAC). Ọ bụ onye otu "Honorary International Investor Council" ya na "Digital Bridge Institute" (DBI). Ọ bụ Onye isi oche nke "Cyberspace Network Limited". Enyere ya nzere dọkịtoreti na-asọpụrụ, na emume nkpọkọta afọ iri ise nke Mahadum Legọọsụ [1]

Ọrụ Obiọma[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụ onye otu Kansụl na-achị nke Mahadum Legoosu Steeti , na onye otu Bọọdụ nke Trostii, Mahadum Redeemer nke mba, Legọọsụ. Ọ bụ onye otu Kansụl na-achị nke "Nigerian Investment Promotion Commission" (1999 - 2007) wee jee ozi na kọmitii nke Amerịkan International Sukulu, Legọọsụ [2001 -2003].

Ovia chịrị ọtụtụ ọgbakọ ndị na-abụghị ndị gọọmentị [NGO] n'oge dị iche iche gụnyere ịbụ onye isi oche mbụ nke otu Ịntanetị (2001-2003). Ọ bụ onye guzobere na Onye isi oche nke "Mankind United to Support Total Education" (MUSTE), otu nzukọ na-ahụ maka ọdịmma mmadụ, lekwasịrị anya n'inye agụmakwụkwọ maka ndị ụwa na-atụ n'ọnụ. Ọ bụ onye guzobere "Youth Empowerment /ICT Foundation", nke na-elekwasị anya n'ịkwalite ọdịmma mmekọrịta ọhanaeze nke ndị ntorobịa Nigeria site n'ịgba ha ume ma na-akpali ha ịnabata ozi na teknụzụ nkwukọrịta.

Nsidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Jim Ovia is one of Nigeria's most successful businessmen - here's how he makes and spends his money". www.pulse.ng. 2019-02-20. Retrieved 2019-05-15.
  2. "Jim Ovia Is A Zenith Man - Konnect Africa..." Konnect Africa. 2012-12-12. Retrieved 2017-11-10.
  3. "Jim Ovia". Forbes. Retrieved 2017-11-10.