Jo da Silva (Ome Ihe Nkiri)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Jo da Silva
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Ebe ọmụmụSouth Africa Dezie
Jo da Silva
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Ebe ọmụmụSouth Africa Dezie

Jo da Silva, bụ onye na- eme ihe nkiri na onye na- eme nkwupụta Televishion nke South Africa. A maara ya nke ọma maka ọrụ ya na ihe nkiri ama ama bụ Gabriël, Operation Delta Force 3: Clear Target na Arsenaal . [1]

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

Da Silva gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Wits na 1990 site na nzere na nka ime ejije nkiri [2] O nwekwara diplọma nke nkuzi na mmụta gbasara ihe nkiri. [2]

Da Silva lụrụ onye na-eme ihe nkiri South Africa bụ Eckard Rabe site na 1996 ruo 2007. [3] Di na nwunye ahụ nwere otu nwa nwanyị, bụ Caitlin. [3] Na 2010, ma Da Silva na Rabe gosipụtara agwa ọrụ na soapie nke South Africa, 7de Laan. [3]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Da Silva malitere ọrụ ya na ihe nkiri wee gaa n'ihu ruo ọtụtụ afọ n'ihe nkiri nkwago. Ọ pụtara n'ihe nkiri Soap opera bụ Isidingo nke o gosiri agwa dị ka'Natasha Wallace'.

Emechaa o gosipụta agwa dị ka 'Gita McGregor' na nhazi telivishọn 7de Laan . [4] Maka ọrụ ya dị ka Gita McGregor, a họpụtara Da Silva dị ka nwanyị ike pụtara ìhè" na nnabata Royalty Soapie Awọd na 2013. [5] N'afọ 2015, a họpụtara ya maka onyinye nturu ugo Royalty Soapie ọzọ na ngalaba "nwanyị ike pụtara ìhè" maka ọrụ ya na 7de Laan. [6] A họpụtara Da Silva na udi nke "Onye ihe nkiri Soapie kacha mma" maka ọrụ ya na 7de Laan na 2016 nke awọ dụ Huisgenoot [7] Tempo . Da Silva hapụrụ 7de Laan na 2016, ma-kwaga Cape Town ka ya na nwa ya nwanyị nọrọ oge na ịrụ ọrụ nke onwe ya. [8]

E wezụga ọrụ ndị a, Da Silva sonyekwara ihe nkiri telivishọn gụnyere Gabriel, Arsenaal, Madam & Eve, Suburban Bliss na Egoli . Malite na 2007, ọ gosipụtara dị ka 'Olivia Fitzgerald' na nhazi ihe nkiri telivishọn ama ama bụ Erfsondes . [9]

Mgbe ọ hapụchara ogologo oge ezumike na ụlọ ihe nkiri, ọ mechara laghachi na ogbo site n'ịrụ ọrụ abụọ na ihe nkiri bụ Present Laughter nke Noël Coward dere. E gosipụtara ihe omume a na Ụlọ ihe nkiri nọ na Bay. Emechaa ọ gosipụta n'ihe nkiri, Fatal Attraction, nke e gosipụtara na Ụlọ ihe nkiri nụ Bay na Pieter Toerien's Monte Casino Theatre dị na Johannesburg.

Ewezuga ime ihe nkiri, o n'emekwa mmepụta eduzi ma n'egosi ihe ngosi akwụkwọ akụkọ M-Net 'Showbuzz'. Ọ bụkwa onye ndu nwanyị n'ihe nkiri Bekee, bụ It rained last night . [10]

Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

  • 7de Laan - emume nke mbụ dị ka Gita McGregma ọ bụ
  • Arsenaal emume nke mbụ dị ka Sonja Heyns
  • Erfsondes - emume nke bụ dị ka Olivia Fitzgerald
  • Gabriël - emume nke mbụ dị ka Delia
  • Isidingo emume nke mbụ dị ka Natasha Wallace
  • Madam Na Eve emume nke abụọ dị ka Jean

Dị ka onye na-eme ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Afọ Ihe nkiri Ọrụ Ụdị Ref.
1995 Live Wire Sonya Ihe nkiri ụlọ
1998 Operation Delta Force 3:Clear Target Connie Ihe nkiri
2001 The Little Unicorn Nne Superior Ihe nkiri

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

 

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  1. Error on call to template:cite web: Parameters archiveurl and archivedate must be both specified or both omittedA Conversation with Jo da Silva. Sarafina Magazine (2020-11-25). Archived from the original on 2020-11-25. Retrieved on 2020-11-25.
  2. 2.0 2.1 Female Motivators: Jo da Silva. Motivational Speakers: Speakers, MC's, Entertainers: Professional Speakers for Africa. Speakers, MC's, Entertainers. Archived from the original on 9 November 2021. Retrieved on 29 November 2020.
  3. 3.0 3.1 3.2 "Back from the Dead", You, News24, 7 May 2010. Retrieved on 29 November 2020.
  4. Error on call to template:cite web: Parameters archiveurl and archivedate must be both specified or both omittedJo da Silva. ESAT (2020-11-25). Archived from the original on 2020-11-25. Retrieved on 2020-11-25.
  5. "Inaugural Royalty Soapie Awards", You, News24, 23 October 2013. Retrieved on 29 November 2020.
  6. "Royalty Soapie Awards Nominess Revealed!", Channel24, News24, 19 February 2015. Retrieved on 29 November 2020.
  7. "These Are All the Nominess for the 2016 Huisgenoot Tempo Awards", Channel24, News24, 10 June 2016. Retrieved on 29 November 2020.
  8. "Here's Why Gita Is Leaving the Laan", tvplus, News24, 9 May 2016. Retrieved on 29 November 2020.
  9. Error on call to template:cite web: Parameters archiveurl and archivedate must be both specified or both omittedJo da Silva career. tvsa (2020-11-25). Archived from the original on 2020-11-25. Retrieved on 2020-11-25.
  10. Female Motivators Jo da Silva. motivators (2020-11-25). Archived from the original on 2021-11-09. Retrieved on 2020-11-25.