Josef Kumbela
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Democratic Republic of the Congo |
aha enyere | Josef |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1958 |
ọrụ ọ na-arụ | onye nhazi ndu ihe nkiri |
Joseph Kumbela (amụrụ n'afọ 1958) bụ onye na-eme ihe nkiri na onye na-emepụta ihe nkiri si Democratic Republic of the Congo. O ritere ihe nrite maka ime ihe nkiri ya.
Ndụ na Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Joseph Kumbela n'afọ 1958. Ọ bi na Switzerland kemgbe afọ 1980. Ọ malitere ọrụ ya dị ka onye na-eme ihe nkiri na France na USA. Na onyinye FESPACO na 1993 ọ meriri ihe nrite maka onye na-eme ihe nkiri kacha mma maka arụmọrụ ya na ihe ọchị Gito l'ingrat (Gito onye na-enweghị ekele) nke Leonce Ngabo nke Burundi duziri. Na ihe nkiri a, Gito, nwa akwụkwọ si Burundi na onye na-emepụta ejiji nwere nkà na Paris, kpebiri ịlaghachi n'ụlọ. N'iji diplọma ya n'aka ma jupụta na atụmatụ banyere ọrụ ya, ọ hapụrụ onye ibe ya, Christine na-ekwe nkwa ịkpọbata ya na Burundi mgbe e mesịrị. Ọ pụghị ịchọta ọrụ, mana ọ zutere onye ọ hụrụ n'anya n'oge ọ bụ nwata. Mgbe ahụ Christine rutere n'ebughị ụzọ dọọ aka ná ntị ma chọpụta ihe na-eme. Ụmụ nwanyị abụọ ahụ jikọtara ọnụ iji kụziere Gito ihe.[1]
Josef Kumbela edeela ma duzie ọtụtụ ihe nkiri dị mkpirikpi kemgbe 1994 site na iji ụlọ ọrụ mmepụta ya dị na Geneva. Ihe nkiri ya nke afọ 1998 L'étranger venu d'Afrique (Onye mbịarambịa si Africa, ma ọ bụ Feizhou Laowai) bụ ihe nkiri Afrịka mbụ e sere na China. Ọ na-ele anya n'ịhụnanya dị n'etiti Lulu, nwa akwụkwọ Africa, na nwanyị China, ma gosipụta esemokwu ọdịbendị.
Ihe nkiri
[dezie | dezie ebe o si]Afọ | Aha ya | Ọrụ | Ihe edeturu |
---|---|---|---|
1998 | Onye mba ọzọ si Africa - FEIZHOU LAOWAI | Onye nduzi, Onye edemede | 13 nkeji. Ihe na-atọ ọchị |
1996 | Ihe ndị e ji ede akwụkwọ ozi | Onye nduzi | Ihe nkiri na-atọ ọchị nke nkeji iri |
1996 | Kaadị ụtụ isi | Onye nduzi, onye na-eme ihe nkiri | Ihe nkiri na-atọ ọchị nke nkeji asaa |
1994 | Nkume ojii | Onye nduzi, Onye edemede | Ihe nkiri na-atọ ọchị nke nkeji iri abụọ na asaa |
1992 | Gito, onye na-enweghị ekele | Onye na-eme ihe nkiri | minit 90. Ihe na-atọ ọchị |
N'etiti Abụọ | Onye nduzi | minit 90. Ihe nkiri na-atọ ọchị | |
1990 | N'anya Agwọ | Onye na-eme ihe nkiri | Ihe nkiri na-akpali akpali nke nkeji iri itoolu |
Ebensidee
[dezie | dezie ebe o si]
- ↑ GITO L'INGRAT. Cine Trois Mondes. Archived from the original on 2020-11-06. Retrieved on 2012-03-19.