Joseph Ahaneku

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Joseph Ahaneku
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereJoseph Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1 Ọktoba 1962 Dezie
Ọrụ ọ na-arụacademic Dezie
onye were ọrụMahadum Nnamdi Azikiwe Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Ibadan Dezie
Onye òtù nkeNigerian Academy of Science Dezie
Ihe nriteFellow of the Nigerian Academy of Science Dezie

Joseph Eberendu Ahaneku (amụrụ n'Ọktoba 1, 1962) bụ onye nkuzi na onye ndụmọdụ Chemical Pathologist nke Mahadum Nnamdi Azikiwe, Awka, Nigeria .  Ahaneku bụ onye isi nke Mahadum Nnamdi Azikiwe, Awka ka pụchara apụ (Monday 26 May 2014 - May 2019). [1][2]Ọ si Nnarambia Ahiara Ahiazu Mbaise, Imo State, Nigeria.[3]

Agụmakwụkwọ Ya[dezie | dezie ebe o si]

Joseph malitere agụmakwụkwọ ya na St. Joseph's Primary School Eke-Nguru na steeti Imo ebe ọ natara asambodo ya na ụlọ akwụkwọ praịmarị. Ọ gara Mbaise Secondary School, Aboh-Mbaise, ebe ọ nwetara asambodo akwụkwọ sekọndrị ya.  [citation needed] Ọ gara Mahadum Ibadan ebe ọ nwetara nzere Degree mbụ ya (BSc) ma mesịa PGD ya na Mahadum College Hospital. [citation needed]N'ebe ahụ ka o nwetakwara nzere MSc ya. O mechara mechaa PhD ya na Ibadan ya na Institute of Biology London, Cboi.   

Ọrụ Ya[dezie | dezie ebe o si]

Ahaneku sonyeere Nnamdi Azikiwe University Teaching Hospital, Nnewi n'afọ 1991 dị ka onye nkuzi 1.  N'afọ 1992, ọ ghọrọ onye ndụmọdụ na-ahụ maka ọrịa kemịkal. N'afọ 1992, ọ ghọrọ onye nkuzi dị elu.  N'afọ 1994, ọ ruru ógó Ọkammụta.  N'afọ 1997, ọ bụ osote onye isi oche nke Nigerian Association of Clinical Chemists.  Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye nyocha maka Ngalaba Biochemistry na Cell Biology na onye nyocha mba ọzọ nke Ngalaba Biocemistry nke Saga Medical School, Saga Japan.  Site n'afọ 1995 ruo afọ 1996 ọ bụ onye isi nchọpụta sayensị na Ọkammụta nke Ngalaba nke Abụọ nke Physiology nakwa dị ka onye nnyocha na-abịaru abịaru nke South-West Medical Research Foundation, San Antonio, Texas.  Ọ bụụrụ onye ọrụ na onye isi ngalaba maka Ngalaba nke Chemical Pathology na sub-dean nke School of Postgraduate Studies, Mahadum Nnamdi Azikiwe, Awka.  Site n'afọ 2001 ruo afọ 2003 ọ bụ onye isi oche nke ndị nlekọta nke ụlọ ọrụ O.M Okonkwo Foundation na Demlaz Group of Companies na onye isi nke Mbaise Frontline Circle, bụkwa onye isi nchịkwa nke JG ventures and Rental Services.[4][5]

Nkwanye ùgwù[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1992, ụlọ ọrụ sayensị na teknụzụ nke Japan nyere ya fellowship na onyinye.  E nyekwara ya ihe nrite n'afọ 1994 maka ịkwalite sayensị na Japan Society for the Promotion of Science (JSPS).  O nwetara fellowship na onyinye nke abụọ n'afọ 1997.  N'afọ 1996, e nyere ya onyinye Pfizer Health Research Foundation (Japan). 

Akwụkwọ ndị O bipụtara[dezie | dezie ebe o si]

O bipụtara ihe karịrị akwụkwọ sayensị iri ise na abụọ.

Ndụ Ezinụlọ Ya[dezie | dezie ebe o si]

Joseph Ahaneku lụrụ Ọkammụta Dr. (Oriaku.) Gladys I. Ahaneku, MNI ma nwee ụmụ ise aha ha bụ; Chibueze Ahaneku, Chinaza Ahaneku، Chimeremeze Ahaneku, Chukwumaijem Ahaneku na Chijindu Ahaneku.[6]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Ahaneku takes over as UNIZIK’s new VC (en). News Express Nigeria Website. Retrieved on 2020-05-26.
  2. Report (2019-05-07). Nigeria: Unizik 13th Convocation - Buhari to Inaugurate 17 Projects (en). allAfrica.com. Retrieved on 2020-05-31.
  3. Eleven jostle to replace Ahaneku as UNIZIK VC (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2019-01-07). Retrieved on 2020-05-31.
  4. NGP KYG: Professor Joseph Eberendu Ahaneku. kyg.nigeriagovernance.org. Retrieved on 10 April 2018.
  5. PROF. AHANEKU JOSEPH E. | Staff Nnamdi Azikiwe University. unizik.edu.ng. Retrieved on 10 April 2018.
  6. How former VC Unizik, Prof Joseph Ahaneku met, married his then student Prof Gladys Ahaneku (en-US). Odogwu Blog (2021-12-30). Retrieved on 2022-02-17.