Joseph Amedokpo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Joseph Amedokpo
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịTogo Dezie
Aha enyereJoseph Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya12 Disemba 1946 Dezie
Ebe ọmụmụVogan Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ese Dezie

Joseph Amedokpo bụ onye mba Togo na-ese ihe. A mụrụ ya na Vogan, Togo (West Africa), n'afọ 1946, wee kwaga Lagos, Nigeria, mgbe ọ dị afọ asatọ, ebe ọ natara agụmakwụkwọ ya na ọzụzụ nka, ma-nweta ohere agụmakwụkwọ n' efu na Yaba Trade Center ebe ọ gụrụ nka osise ihe site na 1966 ruo 1968.

Amedokpo na-ese ihe site na iji mmanụ dị na mpaghara na akwa ya bụ akpa ntụ ọka a na-emegharị emegharị, ndi asara asa ma gbatịa ya. Ụlọ ọrụ ya bụ akụkụ nke ogige ezinụlọ ya; elu ụlọ na-echebe ya pụọ na anyanwụ Afrịka na mmiri ozuzo oge. O nwetala nkwanye ùgwù na Europe na United States.

N'ọnwa Nọvemba afọ 2008, a họpụtara Amedokpo dị ka otu n'ime mmadụ ano ndị na-ese ihe maka atụmatụ Dell's Product RED dị ka akụkụ nke ọgụ zuru ụwa ọnụ megide ọrịa obirinajaocha. Ndị ọzọ na-ese ihe ahọpụtara gụnyere Siobhan Gunning, Bruce Mau na Mike Ming.

N' oge di ugbu a Joseph Amedokpo enweghị ego ọ bụla ịzụta ọgwụ, iri nri n'ụzọ ziri ezi ma ọ bụ ikwado ezinụlọ ya. Onye ọrụ nke rere ihe okike ya, nyere ya naanị euro iri ise kwa ọnwa isii. Na mbido, e nyeghị ya ohere ịgụ nkwekọrịta ya. Joseph Amedokpo enweghị ịnyịnya ígwè ma ọ bụ ụgbọala, ma ọ bụ ọkụ latrik n'ụlọ ya. Ụbọchị ụfọdụ, ọ nweghị ego ịzụta ngwaahịa ndị dị mkpa iji rụọ ọrụ n'ụzọ ziri ezi; ọ bụ iwu na ọ ga-agbaziri ụmụ ego.

Edemsibia[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]