Gaa na ọdịnaya

Josephine Chukwunonye

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Josephine Chukwunonye
mmádu
Ụdịekerenwanyị Dezie
Mba o sịNaijiria Dezie
Obodo maka egwuregwuNaijiria Dezie
Aha enyereJosephine Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya19 Maachị 1992 Dezie
Ebe ọmụmụAnambra State Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye otu egwuregwu bọọlụ Dezie
Ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụicheonye na-agbachitere Dezie
Onye nsonye òtù egwuregwuRivers Angels F.C., Washington Spirit, Nigeria women's national under-20 football team, Nigeria women's national football team, Vittsjö GIK Dezie
Ụdị egwuregwufootbọl Dezie

Script error: The function "infoboxTemplate" does not exist.Script error: No such module "Check height".

Josephine Chiwendu Chukwunonye (amụrụ 19 Maachị 1992) bụ onye egwuregwu bọọlụ Naịjirịa na-agba Kungsbacka na Damallsvenskan na maka otu egwuregwu bọọlụ ụmụ nwanyị Naịjirịa . Ọ gbaburu bọọlụ na mpaghara Rivers Angels afọ asaa na Washington Spirit na Otu Egwuriegwu boolu Nke Umunwaanyi.

Ọrụ klọb

[dezie | dezie ebe o si]

Ka ọ gbachara afọ asaa na Rivers Angels n'asọmpị ụmụnwaanyị Naịjirịa, n'ọnwa Jun afọ 2015 ka a mara ọkwa na Chukwunonye ga-esonye na otu Egwuriegwu boolu Nke Umunwaanyi Washington Spirit . A bịanyere aka na ya n'otu oge ahụ Hayley Raso mba Australia, na ọkwa ahụ na-abịa ụbọchị tupu otu egwuregwu bọọlụ ụmụ nwanyị Naịjirịa gbagoro Australia na asọmpi iko mba ụwa nke FIFA 2015 . Chukwunonye kwuru n'oge ahụ, "Obi dị m ụtọ isonye na ezinụlọ Washington Spirit; ọ bụ ihe ọṅụ na nrọ mezuru m, ọ na-amasị m iso nnukwu ndị egwuregwu dịka Crystal Dunn, bụ onye m zutere n'asọmpi U20 World Cup na 2012. . Obi dị m ụtọ iso onye nchịkwa Parsons rụkọọ ọrụ n'ihi na amaara m na ọ ga-ewepụta ihe kacha mma n'ime m." Chukwunonye bụ onye mba Naịjirịa nke abụọ na squad, sonyere Francisca Ordega . [1] [2] Mgbe ọ gbasịrị egwuregwu abụọ maka otu ahụ, a tọhapụrụ ya na Disemba 2015. [3]

Na March 2016, ma Chukwynonye na onye mba Naijiria ibe ya bụ Ngozi Okobi bụ ndị otu Sweden Vittsjö GIK bịanyere aka na ya. Ha na-agbakọbu ọnụ na squad nke Washington Spirit, na mgbe ha na-akwaga Vittsjö GIK, ha na ndị mba Naijiria abụọ ọzọ sonyeere, Nkem Ezurike na Ifeoma Dieke . Chukwynonye kwuru "Obi dị m ụtọ ịbanye na ezinụlọ Vittsjo; ọ bụ ihe ọṅụ na nrọ mezuru m, ọ na-agụsi m agụụ ike igosi onwe m ma nyekwa ike m niile iji kwalite klọb ahụ n'ebube". [4]

Ọrụ mba ụwa

[dezie | dezie ebe o si]

Chukwunonye nọchitere anya Naijiria n'ọkwa ndị obere na asọmpi iko mba ụwa nke FIFA U-17 na 2012 FIFA U-20. N'ọkwa dị elu ọ so na ndị otu Naijiria na asọmpi iko mba ụwa nke FIFA nke 2011 na 2015 yana asọmpi ụmụ nwanyị Africa na mbipụta 2010, 2012 na 2014, merie asọmpi ahụ ugboro abụọ ( 2010 na 2014 ). [5]

Nkwanye ugwu

[dezie | dezie ebe o si]

Mba ụwa

[dezie | dezie ebe o si]
Naijiria
  • Asọmpi ụmụnwaanyị Afrịka (2): 2010, 2014
Rivers Angel
  • Asọmpi umunwanyi Naijiria (1): 2010
  • Iko ụmụ nwanyị Naijiria (5): 2010, 2011, 2012, 2013, 2014

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. ↑ "Nigerian defender Josephine Chukwunonye set to join Spirit after the Women's World Cup". Washington Spirit. Retrieved 30 June 2015.
  2. ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
  3. ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
  4. ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
  5. ↑ "FIFA player stats". FIFA. Retrieved 29 June 2015.

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]
  • Josephine Chukwunonye – FIFA competition record (archived)
  • Josephine Chukwunonye na Soccerway

Templeeti:Navboxes colour