Josky Kiambukuta

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Josky Kiambukuta Londa
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịDemocratic Republic of the Congo Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya14 Febụwarị 1949 Dezie
Ebe ọmụmụGombe-Matadi Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya7 Maachị 2021 Dezie
Ebe ọ nwụrụKinshasa Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-abụ abụ, odee egwu Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1965 Dezie
ngwa egwuolu egwụ Dezie

Joseph Kiambukuta Londa, onye a maara dị ka Josky Kiambukuta, (14 Febụwarị 1949 - 7 Machị 2021) bụ onye Congo na-eme ihe nkiri, onye na-agụ egwu, onye na-ede egwu nakwa onye na-arọpụta egwu.[1] Dị ka onye otu TPOK Jazz[2], ọ gụrụ egwu n'akụkụ Franco n'oge ha kachasị ewu ewu n'etiti afọ 1960 ruo ngwụsị afọ 1980.

Mmalite ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Joseph Kiambukuta Londa na Gombe-Matadi n'ụbọchị Valentine nke afọ 1949, nye Bernard Bakiansuni na Albertine Londa.[3]

Ọrụ egwu[dezie | dezie ebe o si]

Ọrụ egwu mbụ[dezie | dezie ebe o si]

Kiambukuta sonyeere otu Dr. Nico, African Fiesta Sukisa n'afọ 1969.[4][5] N'oge ọ nọ n'òtù ahụ, o dekọrọ otu n'ime egwu mbụ ya, "Sadi Naboyi Masumu". Afọ abụọ ka e mesịrị, n'afọ 1971, ọ hapụrụ iji mepụta otu egwu ya Orchestre Continental ya na ndị ọzọ na-eto eto gụnyere Wuta Mayi na Bopol Mansiamina .[5] O dekọrọ ma depụta egwu ọzọ, “Nakobondela”, n'oge ya na ndị otu ahụ.

TPOK Jazz[dezie | dezie ebe o si]

Kiambukuta sonyeere TPOK Jazz n'afọ 1973. A maara Kiambukuta maka olu ya dị iche iche, site na ụda dị elu ruo na bass miri emi, dịka mkpa ọ dị. A na-eto ya maka ịdee ọtụtụ egwu maka ndị otu ahụ, gụnyere “Chandra”, “Fariya”, “KSK” na “Bimansha”.

Josky mechara hapụ otu ahụ, ya na Ntesa Dalienst n'afọ 1985. Ha abụọ malitere ọrụ naanị ha ma na-arụkọ ọrụ ugboro ugboro. N'oge mmalite ọrụ naanị ya, ya na Dalienst na Serge Kiambukuta, nwa nwanne nna ya wepụtara abọm. O sonyekwara na abọm Koffi Olomide mbụ.

Kiambukuta laghachiri TPOK Jazz n'afọ 1987. N'afọ sochirinụ, o wepụtara abọm nke abụọ ya "Mata Kita Bloqué", nke nwere egwu a kpọrọ aha ya.

Bana OK[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe Franco nwụsịrị n'afọ 1989, TPOK Jazz gara n'ihu na-egwu egwu ruo afọ anọ. Otú ọ dị, n'afọ 1994, esemokwu manyere ndị otu ahụ kewaa. Kiambukuta, ya na Simaro Lutumba, Ndombe Opetum na ndị otu egwu ndị ọzọ gara n'ihu mepụta otu egwu ọhụrụ: Bana OK . A kọrọ na Kiambukuta kwagara France ma bụrụ onye bi na Paris.[6]

Ọrịa na ọnwụ[dezie | dezie ebe o si]

A kọrọ na Kiambukuta lara ezumike nká site na egwu n'ihe dị ka n'afọ 2009. A kọkwara na ọ nọ na-arịa ọrịa, ruo ọtụtụ afọ tupu ọnwụ ya. Ọ nwụrụ n'ụlọ ọgwụ Kinshasa na 7 Machị 2021 mgbe ọ dị afọ 72.[7]

Discography nke naanị ya[dezie | dezie ebe o si]

  • Mehida (1983)
  • Mata Kita Bloqué (1988)
  • So.Pe.Ka (1988, ya na Mayaula Mayoni, Madilu System na Malage de Lugendo)
  • Chandra (1989)
  • Destin / La Sincérité (1989)
  • Dernier Avertissement (1999)
  • Oui Ça Va (2003)
  • Double Vie (2005)
  • Chiffre 3 (2005, na Madilu System)

Leekwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Franco Luambo Makiadi
  • Sam Mangwana
  • Simaro Lutumba
  • TPOK Jazz
  • Ndepụta nke ndị egwu Afrịka

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Ngaira. "Kenya: 'Sauti Ya Simba' Takes Final Bow", AllAfrica.com, 14 January 2011. Retrieved on 5 March 2011.
  2. Stewart (1992). Breakout: profiles in African rhythm. University of Chicago Press. ISBN 978-0-226-77406-0. Retrieved on 5 March 2011. 
  3. Josky Kiambukuta : 50 ans de carrière musicale ! (fr-FR). Eventsrdc.com (2018-01-27). Retrieved on 2022-01-25.
  4. Messager. LES QUATRE VOIX MARQUANTES DE L’AFRICAN-FIESTA SUKISA (fr). MBOKAMOSIKA. Retrieved on 2022-01-25.
  5. 5.0 5.1 Joseph Londa Kiambukuta alias Josky 1949 - 2021 - Univers Rumba Congolaise (fr-FR). www.universrumbacongolaise.com/. Retrieved on 2022-01-25.
  6. Josky Kiambukuta Lives In Paris, France. Archived from the original on 2014-04-14. Retrieved on 2022-06-07.
  7. Patrick Ilunga (8 March 2021). Veteran Congolese singer Josky Kiambukuta dies in Kinshasa. Retrieved on 21 March 2021.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]