Juliana Shonza

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Juliana Shonza

Juliana Daniel Shonza (amụrụ n'abalị iri abụọ na atọ n'ọnwa Eprel n'afọ 1987) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Tanzania na onye otu Chama Cha Mapinduzi (CCM) na-achị. Ọ bụ osote minista nke ozi, ọdịbendị, nka na egwuregwu ugbu a. Ọ bụ onye omeiwu otu oge ebe a họpụtara ya ka ọ bụrụ oche pụrụ iche maka ụmụ nwanyị.

Mmalite na agụmakwụkwọ ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Juliana Daniel Shonza na ọnwa 23 Eprel nke afọ 1987 na mpaghara Songwe . Ọ gụsịrị akwụkwọ na Kibasila Secondary School na afọ 2005 na Dakawa high school na afọ 2008.[1] Bachelor mbụ ya na Sociology site na afọ 2008 ruo na afọ 2011 na nzere masta na Sociology sitere na afọ 2013 ruo na afọ 2015 na Mahadum Dar es Salaam na Mahadume Dodoma.[1]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya[dezie | dezie ebe o si]

Shonza tinyere aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị mgbe ọ nọ na Mahadum Dar es Salaam dị ka osote onye isi oche nke National Youth Council of Chadema .[1] N'afọ 2013 ọ kwagara Chama Cha Mapinduzi ebe a họpụtara ya ka ọ bụrụ osote odeakwụkwọ nke mkpali na isi ụlọ ọrụ CCM. N'oge ntuli aka nke afọ 2015, a họpụtara Juliana Shonza dị ka onye otu ndị omeiwu Tanzania site na oche ụmụ nwanyị pụrụ iche iji debe maka afọ 2015 ruo na afọ 2020.

N'afọ 2017, Onye isi ala John Magufuli họpụtara ya dị ka osote minista na Ministry for Information, Culture, Arts and Sports n'oge mgbanwe ndị o mere na 9 Ọktoba 2017.[2] Ọ na-eje ozi na kansụl n'okpuru Minista Dr. Harrison Mwakyembe.[3]

Ebesidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 "JULIANA SHONZA : Nilihama Chadema baada ya kugundua Natumika", Mwananchinews, 29 November 2015. Retrieved on 2017-10-09. (in Swahili) Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  2. "Tanzania: Efficiency Focused Reshuffle", Tanzania Daily News (Dar es Salaam), 2017-10-09. Retrieved on 2017-10-09.
  3. Gerson Msigwa. "unveiled". Retrieved on 2017-10-09.

Àtụ:Chama Cha Mapinduzi