Julienne Uwacu
Ọdịdị
Julienne Uwacu
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | Rwanda |
| Aha enyere | Julienne |
| Aha ezinụlọ ya | Uwacu |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 1979 |
| Ebe ọmụmụ | Rwanda |
| Ọrụ ọ na-arụ | onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, minister |
| Ọkwá o ji | minister of culture, minister |
| Ebe obibi | Kigali |
| Oge ọrụ ya (mmalite) | 2008 |
Julienne Uwacu bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Rwanda, onye jere ozi dị ka minista nke egwuregwu na ọdịbendị na Cabinet nke Rwanda, kemgbe ụbọchị 24 Febụwarị 2015.[1][2] Na mgbanwe nke ụbọchị 31 Ọgọst 2017, Julienne Uwacu nọgidere na-arụ ọrụ ya.[3]
A mụrụ ya na Rwanda, n'ihe dị ka afọ 1979.[1]
Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya malitere tupu afọ 2008, mgbe ọ rụrụ ọrụ dị ka osote onye isi obodo nke Nyabihu District, na-ahụ maka akụ na ụba na mmepe.[2] N'afọ 2008, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye omeiwu, na-eje ozi n'ọkwa ahụ ruo n'ọnwa Febụwarị afọ 2015. Mgbe ọ nọ na nzuko omeiwu, ọ rụrụ ọrụ dị ka "onye osote onyeisi oche nke Kọmitii Nzukọ omeiwu na-ahụ maka ihe gbasara mba ọzọ, imekọ ihe ọnụ na nchekwa".[2]
Ebenside
[dezie | dezie ebe o si]- 1 2 GOR (6 March 2015). New Minister of Sports and Culture Julienne Uwacu Sworn-in. Republic of Rwanda (GOR). Archived from the original on 1 September 2017. Retrieved on 31 August 2017.
- 1 2 3 Musoni (25 February 2015). Uwacu is new Sports and Culture minister. Retrieved on 31 August 2017.
- ↑ Kagire (31 August 2017). Women make up more than half of Kagame’s new Cabinet. Retrieved on 31 August 2017.