Juliet Kyinyamatama Suubi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Juliet Kyinyamatama Suubi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịUganda Dezie
Aha enyereJuliet Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1988 Dezie
Ebe ọmụmụUganda Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMember of the Parliament of Uganda Dezie
Mpaghara ntuli akaRakai District Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịindependent politician Dezie
SUUBI JULIET KYINYAMATAMA
Nationality Ugandan
Citizenship Ugandan
Alma mater Uganda Christian University

University of Geneva

Years active 2011-todate
Title Member of Parliament

Juliet Kyinyamatama Suubi (amụrụ na 22 Disemba, na afọ 1988) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Uganda na onye otu ndị omeiwu. N'afọ 2011, a họpụtara ya dị ka onye nnọchi anya nwanyị distrikti na nzuko omeiwu maka distrikti Rakai, a họpụtara ọzọ maka oge nke abụọ n'ọchịchị na ntuli aka 2016 Uganda General na maka oge nke atọ n'ọkwa na ntuliaka afọ 2021 Uganda General.[1][2]

O mere mkpọsa dị ka onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nwere onwe ya mgbe ọ meriri na ntuli aka nke National Resistance Movement.[3][4]

Agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Ọ gụsịrị akwụkwọ praịmarị ya n'afọ 2001 na ụlọ akwụkwọ praịm Ronald Ruta na Lyantonde. N'afọ 2005, ọ gụsịrị akwụkwọ Uganda Certificate of Education (UCE) maka agụmakwụkwọ sekọndrị dị ala na Valley College dị na Bushenyi, ebe ọ gụsịrị ọkwa sekọndndrị dị elu nke a maara dị ka Uganda Advanced Certification of Education (UACE) n'afọ 2008.[5] N'afọ 2012 ọ gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Ndị Kraịst nke Uganda na nzere Bachelor nke Social Work and Social Administration. O nwetara asambodo na Global Health na Mahadum Geneva na afọ 2013.[6]

Ọrụ ndị ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

Aha Ọrụ Nhazi Oge Ọrụ
Onye Nlekọta Ọrụ Ọha Ndị mmekọ na ahụike 2013-2014
Onye Ọrụ Ọha na Eze Ndị mmekọ na ahụike 2012-2013
Onye omeiwu Nzukọ omeiwu nke Uganda 2011 ruo taa

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nwere onwe ya
  • Mpaghara Rakai
  • Ndepụta nke ndị otu nke itoolu nke Nzukọ Ndị Omeiwu nke Uganda
  • Ndepụta nke ndị otu nke iri nke Nzukọ Ndị Omeiwu nke Uganda
  • Ndepụta nke ndị otu nke iri na otu nke Uganda
  • Onye omeiwu
  • Nzukọ omeiwu nke Uganda

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. Parliament OF Uganda. www.parliament.go.ug. Archived from the original on 2016-11-07.
  2. Juliet Kyinyamatama Archives (en-US). The Independent Uganda. Retrieved on 2021-03-15.
  3. Parliament of Uganda. www.parliament.go.ug. Archived from the original on 2016-11-07. Retrieved on 2021-03-15.
  4. Losers in NRM polls vow to return as independents (en). Daily Monitor (8 September 2020). Retrieved on 2021-03-16.
  5. Parliament of Uganda. www.parliament.go.ug. Archived from the original on 2016-11-07. Retrieved on 2021-03-15.
  6. Parliament of Uganda. www.parliament.go.ug. Archived from the original on 2016-11-07. Retrieved on 2021-03-15.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]