Kamal Shaddad

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Kamal Shaddad
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịSudan Dezie
Aha enyereKamal Dezie
aha ezinụlọ yaShaddad Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1935 Dezie
Ebe ọmụmụAl-Ubayyid Dezie
Ọrụ ọ na-arụprofessor, sports journalist, sports executive Dezie
Ọkwá o jiSudan Football Association, Sudan Football Association, Sudan Football Association Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of London, University of Khartoum Dezie

Kamal Shaddad (amụrụ 1935) bu ọkammụta nke sayensi na mba Sudan, onye nta akụkọ na onye nchịkwa egwuregwu. Ọ bụ onye isi oche nke Sudanese Football Association ihe karịrị afọ iri abụọ n'etiti 1988 na 2021.

Mmalite Ndụ na agụmakwụkwọ Ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Kamal Hamid Shaddad na El-Obeid, North Kurdufan, Sudan, n'afọ 1935.[1] Shaddad nwetara akara ugo mmụta nsọpụrụ ya na [[w:|Mahadum Khartoum] na ngalaba Akwụkwọ Akụkọ, wee nweta akara ugo mmụta masta ya na otu mahadum ahụ.[2] Ka nke ahụ gasịrị, Shaddad nwetara nzere PhD ya na Mahadum London n'afọ 1970.[3] Ọ bụụrụ ọkammụta na ngalaba filọsọsị na Mahadum Khartoum,[4] and head of the department.[5]

Ọrụ Agbam bọọlụ Ya[dezie | dezie ebe o si]

Ọrụ nta akụkọ na ngalaba agbam bọọlụ[dezie | dezie ebe o si]

Shaddad malitere ọrụ ịgba bọọlụ ya dịka otu n'ime ndị òtù egwuregwu bọọlụ Abu Anja, Omdurman, ka ọgbachara afọ iri ise. O nweghi ike ịga n'ihu n'ọrụ agbam bọọlụ ya n'ihi ahụike, ya mere ọ gafee n'ịrụ ọrụ ịbụ onye nta akụkọ egwuregwu.[1] Shaddad rụrụ ọrụ na ngalaba nta akụkọ egwuregwu n'ọtụtụ ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ mgbasa ozi, gụnyere al-Ayyam na al-Zaman (Times). Ọ nọọrọ n'isi na ngalaba egwuregwu nke akwụkwọ akụkọ nzisa ozi al-Sahafa na Àtụ:III bụ ndị amaara dịka akwụkwọ akụkọ (Echiche Ọha). O bipụtakwara akwụkwọ akụkọ al-Motafari (The Spectator).[3]

Kọmitii Olympic nke Sudan[dezie | dezie ebe o si]

A họpụtara Shaddad dịka onye osote onye odeakwụkwọ nke Kọmitii Olympic Sudan n'afọ 1981 na 1982,[6] wee bụrụ onyeisi oche nke Kọmitii Olympic nke Sudan n'etiti afọ 1988 na 1997.[3] A họpụtakwara ya dịka onye òtù Ọfis Ezege nke Association of National Olympic Committees nke Africa n'etiti 1989 na 1993 dị ka onye nnọchiteanya nke Kọmitii Olympic na mpaghara 5, nke gụnyeburu Sudan. Ijipt , Etiopia, Kenya, Uganda, Somalia na Tanzania.[6] A họpụtara Shaddad dị ka onye so na kọmitii bọọlụ maka 2012 Summer Olympics na London,[6] wee họrọ ya dịka onye òtù Court of Arbitration for Sports na Switzerland n'afọ 2003.[7]

Òtù Egwuregwu Bọọlụ Sudan[dezie | dezie ebe o si]

Ahọpụtakwara Shaddad ka ọ bụrụ odeakwụkwọ wee mechaa bụrụ onye isi nke Kọmitii Ọzụzụ nke Sudanese Football Association n'etiti afọ 1962 na 1967.[7] O mechara bụrụ onye nchịkwa òtù egwuregwu bọọlụ, wee duo ọtụtụ klọb ndị Sudan, wee bụrụ onye nchịkwa nke òtù egwuregwu bọọlụ mba Sudan n'etiti afọ 1964 na 1967. N'oge ahụ, Sudan meriri n'asọmpi ma rite nrite ọlaọcha na 1965 Arab Games na Cairo, ebe Ijipt ritere ọla edo, [3] wee nweta ihe nrite ọla edo n'asọmpi Enyi na Enyi nke akụkụ East Africa na Khartoum n'afọ 1967.[8] O nwekwaara ike iduga òtù egwuregwu bọọlụ Klọb Al-Hilal iji ruo asọmpi 1987 African Cup of Champions Clubs nke mbụ na akụkọ ntolite ya.[1]

Shaddad malitere ọrụ nchịkwa ya na ụlọ ọrụ nchịkwa egwuregwu bọọlụ mba Sudan na Nọvemba 1979 mgbe a họpụtara ya odeakwụkwọ maka Sudanese Football Association (SFA), ruo July 1982. N'ime oge a Sudan meriri na nke mbụ ha Iko CECAFA n'afọ 1980.[1]

Shaddad ghọrọ onyeisi oche nke SFA nke mbụ ya, site n'afọ 1988 ruo 1992, wee gaa n'ihu maka ọchịchị àgbà nke abụọ ruo afọ 1995.[3] Ọ laghachiri na ịbụ onyeisi oche nke Sudan Federation mgbe ọ na-anọghị ruo afọ isii n'ime oge nke Omar Al-Bakri Abu Haraz weere ọnọdụ onyeisi oche nke SFA. Shaddad ruzuru ọrụ ya n'isi n'ịchịkwa agbam bọọlụ Sudan site n'ịlaghachi ọzọ ma bụrụ onye isi SFA na àgbà ọchịchị atọ sokọrọ ọnụ ruo afọ 2010, mgbe o merichara ntuli aka nke Sudanese Football Association n'afọ 2001.[1] N'oge ọchịchị ya, [Al-Merrikh SC] meriri African Cup Winners'Cup nke afọ 1989, wee kepụta òtù egwuregwu bọọlụ mba Sudan ndị na-erubeghị afọ iri na asaa na Asọmmpi FIFA mba ụwa nke ndị na-erubeghị afọ iri na asaa nke afọ 1991. [9] Ọ rụkwara ọrụ dịka onye nkuzi na International Federation of Football nakwa na African Confederation.[1] N'oge ahụ kwa, na dịka onye nta akụkọ football Sudan bụ Muzammil Abu Al-Qasim si kwuo, n'ihi esemokwu onwe onye ya na Shaddad, Abdel Halim Mohamed (1910 - 2009), otu n'ime ndị malitere [[w:|Confederation of African Football] na onye isi oche mmalite nke SFA, Shaddad họọrọ ịghara ịsọpụrụ ya n'oge ndụ ya ma ọ bụ mgbe ọ nwụsịrị n'agbanyeghị na ọ họọrọ ịsọpụrụ onye ikwu ya, Mubarak Shaddad.[10][11]

Na 25 Julaị 2010, o kwupụtara na ọ ga-alụ ọgụ maka ikike ya ịzọ ọkwa ọzọ n'agbanyeghị na ndị otu egwuregwu bọọlụ obodo na ndị ọrụ gọọmenti etiti machibidoro ya. Kọmishọna ahụ zoro aka n'iwu na-ekwu na Shaddad enweghị ike ịzọ ọkwa nke atọ na-ejideghị ọkwa egwuregwu bọọlụ mba ụwa nke ndị ministri egwuregwu ghọtara. Shaddad jụrụ mkpebi ahụ, yie egwu itinye aka na FIFA, ma katọọ ego nhọpụta karịrị akarị.[12][13] FIFA warned that Sudan could face suspension or expulsion if there was continued government interference.[14] Sudan Sports Commission gbachitere mkpebi ya, na-ekwu na irube isi na iwu Sudan na FIFA. Ntinye aka ndọrọ ndọrọ ọchịchị na bọọlụ butere ntaramahụhụ n'oge gara aga, ebe Nigeria, Kenya, na Guinea chere ihe ga-akpata ya.[12]

FIFA jụrụ nsonaazụ nke 26 Julaị 2010 nke na-agụnyeghị Shaddad n'ihi nnyonye anya gọọmentị.[15][16][17] Òtù ọ dị, n'ọnwa Ọgọst 2010, Shadad withdrew seghachịrị nhọpụta ya na nke osote ya Mutasim Jaafar Sarkhatm azụ [18] Na 29 Ọktoba 2017, a họpụtara Shaddad ka ọ bụrụ onye isi oche nke (SFA) maka 2017 ruo 2021 mgbe ọ nwetasịrị vootu iri atọ na atọ n'ime vootu iri isii na abụọ, merie onye isi oche Mutasim Jaafar, onye nwetara Vootu iri abụọ na asatọ.[19][20] Onye otu CAF (Confederation of African Football) onye na-ahụ maka ịtụ vootu bụ Suleiman Hassan Waberi na onye njikwa mmepe mpaghara FIFA bụ David Fani, lebara ya anya nke ọma n'usoro atụm vootu ahụ. [21][22] Ndị otu SFA kwụsịrị ịnabata ndị mmadụ na mbụ n'ihi nnyonye anya gọọmentị mgbe onye minista na-ahụ maka ikpe ziri ezi nke Sudan kwadoro ntuli aka nke FIFA kwadoro.[19] FIFA zara ya site n'inye SFA ikike ịgbanwe mkpebi ahụ. Mgbe a kagbughị mkpebi a, FIFA kwụsịrị ọrụ SFA. Agbanyeghị, otu ọnwa ka e mesịrị, FIFA wepụrụ mmachibido iwu ahụ site na iwu sitere n'aka Prime Minister [Bakri Hassan Saleh] ka ịkagbu mkpebi nke Ministry of Justice. Mkpebi gọọmentị nwetara nkatọ sitere n'aka ndị otu mmegide Sudan, gọọmentị machibidoro mgbasa ozi.[19] Shaddad gbalịsiri ike ijide ọ́kwá ya n'agbanyeghị n'àgbà ọchịchị ya abịaruola na njedebe [23] O guzogidere ọtụtụ mkpesa maka mmegide Ụkpụrụ omume FIFA site na ndị òtù nke ya na bọọdụ SFA.[24] FIFA ekwenyebuolarị na ụzọ a ga-eso maka ntuli aka na SFA na Al-Merrikh SC. Al-Merrikh, nke tọrọ ntọala na 1908, jigidere ọkwa ama ama na ndọrọ ndọrọ ọchịchị Sudan, ebe ọ nwetagoro ọtụtụ asọmpi na iko. Onye isi oche klọb ahụ, Adam Sudacal, onye jikọrọ Shaddad, na-achọ ntuli aka ọzọ ma nweta nkwado n'aka Shaddad. E hazikwara ụbọchị ntuli aka ma kagbuo, mgbe mmiri rikpuru nzukọ stadium, ọgbaghara dara. N'ikpeazụ, ọgbakọ izugbe nke klọb ahụ mere n'ebe ọzọ, ndị Fans na-eme ngagharị iwe megide Shaddad ma na-achọ mgbanwe. Ndị uwe ojii na-ahụ maka ihe mberede steeti tinyere aka, na-eji gas na-anya mmiri na ụta megide igwe mmadụ ahụ. [23] Emechara wepụ Shaddad n'ụlọ ọrụ wee họpụta Mutasim Jaafar Sarkhatm na 13 Nọvemba 2021. [25][26]

Ndụ onwe onye Ya[dezie | dezie ebe o si]

Shaddad lụrụ Ibtisam Hassab Al-Rasoul, ha wéé mụta nwa nwanyị, Amna Al-Rayyan. [27]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 Ghazi, Hussien (2021-05-09). بعمر الـ86.. شداد يعتزم الترشح لولاية سابعة برئاسة "الكرة السوداني" (ar).
  2. McDougall, Russell (2021-07-19). Letters from Khartoum. D.R. Ewen: Teaching English Literature, Sudan, 1951-1965 (in en). BRILL. ISBN 978-90-04-46114-7. 
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 3.4 56 عاماً في العمل الرياضي كمال شداد (ar) (2021-08-28). Archived from the original on 2023-07-15. Retrieved on 2023-12-05.
  4. Mark Otto, Jacob Thornton, and Bootstrap. كمال شداد (ar).
  5. Nordenstam, Tore (1985). Research and Development in the Sudan (in en). Khartoum University Press. 
  6. 6.0 6.1 6.2 /en/athletes/kamal-shaddad Kamal Shaddad.
  7. 7.0 7.1 كمال شداد يعود مجددا رئيسا لاتحاد كرة القدم السوداني (2019-12-22). Archived from the original on 2019-12-22. Retrieved on 2023-12-05.
  8. Friendship Cup of the East African Zone.
  9. Teams of 1991 FIFA U-17 World Championship. FIFA (1994).
  10. Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified (en).
  11. Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified (en).
  12. 12.0 12.1 SudanTribune (2010-07-26). President of Sudan football association vows to fight for re-election right (en-US).Àtụ:Dead link
  13. SudanTribune (2010-08-03). FIFA tells Sudan to re-run polls of national football body (en-US).Àtụ:Dead link
  14. "Sudan risks FIFA ban from international soccer", Reuters, 2010-07-24. (in en)
  15. FIFA gives Sudan deadline to rerun FA elections (en).
  16. FIFA extends Sudan's deadline for leadership vote (en) (2010-08-13).
  17. FIFA threatens Sudan with expulsion (2019-07-09).
  18. SUDAN FA RE-RUNS ELECTIONS (2010-08-29).
  19. 19.0 19.1 19.2 Dabanga (2017-10-30). Sudan Football Association elects new chairman (en-GB).
  20. Africa: Shaddad Returns to the Helm of Sudan Football Association (2017-11-03).
  21. Professor Kamal Shadad elected President of the Sudan Football Association. - Free Online Library.
  22. Osano, Bonface (2017-11-06). 82-year old Shaddad returns as Sudan FA boss (en-US).
  23. 23.0 23.1 Police fire tear gas and beat delegates at Al Merrikh general meeting in Sudan (en-GB) (2021-04-08).
  24. Africa's new regime of Motsepe-CAF-FIFA immediately tested with Sudan ethics complaint (en-GB) (2021-03-16).
  25. Football, CAF-Confedération Africaine du. CAFOnline.com (en).
  26. Farouq, Hassan (2022-06-17). شداد يطلب إعادة انتخابات اتحاد الكرة السوداني (ar).
  27. زوجة دكتور كمال شداد ترد بخصوص مبلغ 20 الف دولار استلمتها من اتحاد الكرة (ar) (2019-07-29). Archived from the original on 2019-12-22. Retrieved on 2023-12-05.