Gaa na ọdịnaya

Karabo Khakhau

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Karabo Khakhau
mmádu
Ụdịekerenwanyị Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie

Karabo Lerato Khakhau bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị South Africa na-eje ozi dị ka onye otu Free State Provincial Legislature maka Democratic Alliance kemgbe Mee, na afọ 2019. Mgbe ọ dị afọ iri abụọ na otu n'oge a họpụtara ya, ọ ghọrọ onye kachasị nta n'ime ndị omeiwu mpaghara. Khakhau bụbu onye isi oche nke kansụl nnọchiteanya ụmụ akwụkwọ nke Mahadum Cape Town.

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

Khakhau si Welkom na Free State. Ọ gụrụ akwụkwọ na Welkom-Gimnasium.[1] O nwere nzere bachelọ na sayensị mmekọrịta mmadụ na ibe ya na Mahadum obodo Cape Town .[2]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị

[dezie | dezie ebe o si]

Khakhau sonyeere Democratic Alliance na afy 2016.[1] N'ọnwa Ọktoba, na afo 2017, òtù ụmụ akwụkwọ DA meriri ihe ka ọtụtụ n'ime oche itoolu n'ime iri na ise na kansụl nnọchiteanya ụmụ akwụkwọ nke Mahadum Cape Town. A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi oche nke SRC n'oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị.[3]

Mgbe ntuli aka mpaghara nke e mere na 8 Mee na afọ 2019, a họpụtara Khakhau na Free State Provincial Legislature ka nkwado pati ahụ na mpaghara ahụ na-eto.[4] A ṅụrụ ya iyi dị ka onye otu ndị omeiwu na 22 Mee, na afọ 2019. N'ihi ya, ọ ghọrọ onye kachasị nta, ebe ọ bụ na ọ dị nanị afọ iri abụọ na otu mgbe ọ malitere ọrụ.[5]

Ebenside

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1 2 Madisa, Kgothatso (15 June 2019). "Equality drives Karabo Khakhau". SowetanLIVE. Retrieved 11 September 2020.
  2. ↑ Maputla, Tswelopele (23 May 2019). "#BlackGirlMagic: These female parliamentarians are only in their 20s". SowetanLIVE. Retrieved 11 September 2020.
  3. ↑ Van Damme, Phumzile. "DASO UCT wins SRC election". Democratic Alliance. Retrieved 11 September 2020.
  4. ↑ Ngatane, Nthakoana (21 May 2019). "Meet the Free State's youngest MPL, Karabo Khakhau". Retrieved 11 September 2020.
  5. ↑ "Youngest member of legislature sworn in". Bloemfontein Courant. Retrieved 11 September 2020.

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]
  • Karabo Lerato Khakhau at People's Assembly