Karlien van Jaarsveld

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Karlien van Jaarsveld
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Aha enyereKarlien Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya21 Disemba 1985 Dezie
Ebe ọmụmụPaarl Dezie
Dị/nwunyeDerick Hougaard, Joe Breytenbach Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-abụ abụ Dezie
ngwa egwuolu egwụ Dezie
ebe e guzoberePaarl Dezie
ụdịpop music Dezie
webụsaịtịhttp://www.karlienvanjaarsveld.co.za/ Dezie

  Karlien van Jaarsveld (amụrụ n'afọ 1985) bụ onye na-agụ egwu na asụsụ Afrikaans. E wepụtara abọm mbụ ya, bụ As the Curtain Falls, n'afọ 2010. N'oge gara aga, ọ bụ onye otu egwu rock, ọ bụzi onye na-agu egwu onwe nke n'eritela ọtụtụ ihe nrite na South Africa.

Oge ọ malitere[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Karlien van Jaarsveld n'abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Disemba afọ 1985, na Paarl, South Africa, nwa mbụ n'ime ụmụ atọ. Nwanne ya nwoke, Bobby van Jaarsveld, bụkwa onye na-agụ egwu ma ọ malitere iso ya na-eme ihe n'afọ 2005 dị ka onye na-akpọ ụbọ akwara na onye na-abụ abụ. Ya na nwanne ya nwoke bụrụ abụ abụọ na abọm mbụ ya.[1]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Van Jaarsveld guzobere otu egwu rock, Revolution (Revolusie), n'afọ 2006 ma bụrụ onye isi abụ ya. N'ọnwa Ọktoba n'afọ 2008, ọ hapụrụ òtù ahụ iji malite ọrụ n'onwe ya. E wepụtara abọm mbụ ya, As the Curtain Falls, n'afọ 2010. E wepụtara abọm nke abụọ ya, Jakkals Trou Met Wolf Se Vrou (Jackal Marries Wolf's Wife), n'afọ 2011. Ahịa nke abọm ahụ ruru ọkwa platinum na South Africa. N'afọ ahụ, ọ meriri Huisgenoot Tempo Award maka egwu Afrikaans, dị ka Best Newcomer. N'afọ 2012 ọ ritere ihe nrite atọ na Ghoema Music Awards, maka Female Artist of the Year, Pop Record of the Year. N'afọ 2014 ọ meriri South African Music Award maka album Pop kacha mma na Afrikaans.[1][2]

N'ịga n'ihu na ime ihe nkiri, Van Jaarsveld pụtara na ihe nkiri Afrikaans Platteland tinyere Steve Hofmeyr, Bok van Blerk, na Lianie May. N'afọ 2015 ọ meriri mmeri oge nke asatọ nke South African version nke Strictly Come Dancing, ya na onye mmekọ ya, Devon Snell. N'afọ 2014 ọ pụtara na ihe nkiri telivishọn, Binnelanders, n'afọ 2015 ọ pụtara dị ka Cinderella na ihe nkiri.[1][2]

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

Van Jaarsveld lụrụ onye bụbu onye egwuregwu rugby nke Springbok na Blue Bull, Derick Hougaard. Ha mụrụ ụmụ ejima na ngwụcha afọ 2013. Mgbe ha gbara alụkwaghịm , ọ lụrụ Joe Breytenbach, onye bụkwabu onye egwuregwu rugby. Ha nwere nwa nwanyị na nwa nwoke.[1][3][4]

Ndepụta ihe ngosi[dezie | dezie ebe o si]

Abọm Van Jaarsveld bụ:

  • 2010: As die gordyn val
  • 2011: Jakkals Trou met Wolf se Vrou
  • 2013: Uitklophou
  • 2015: My hartjie
  • 2017: Sing vir liefde

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Everything about Karlien van Jaarsveld's age and second husband Joe Breytenbach. Answers Africa. Retrieved on 31 May 2022.
  2. 2.0 2.1 Karlien van Jaarsveld show. Sun International. Retrieved on 31 May 2022.
  3. KARLIEN VAN JAARSVELD TIES THE KNOT IN PRIVATE CEREMONY. Knysna-Plett Herald. Retrieved on 31 May 2022.
  4. DERICK EN KARLIEN AMPTELIK GESKEI. Knysna-Plett Herald. Retrieved on 31 May 2022.