Karnataka State Pollution Control Board

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Karnataka State Pollution Control Board
otu
ọdịdị isi ụlọ ọrụBengaluru Dezie
webụsaịtịhttp://kspcb.kar.nic.in Dezie

Karnataka State Pollution Control Board (KSPCB) bụ ụlọ ọrụ iwu kwadoro màkà ịchịkwa mmetọ na steeti India nke Karnataka . Ụlọ ọrụ ahụ na-achịkwa ikuku, mmiri na mmetọ gbụrụ-gbúrụ ébé obibi.

Akụkọ ihe mere eme[dezie | dezie ebe o si]

E guzobere Board ahụ na mbụ dị ka Karnataka State Pollution Control Board màkà mgbochi na nchịkwa nkè mmetọ mmiri n'afọ 1974 dị ka ngalaba anọ nke Iwu Mmiri (mgbochi na Nchịkwa nke mmegide), afọ 1974. A gbanwere aha ya ka ọ bụrụ Karnataka State Pollution Control Board n'afọ 1985 mgbè ewepụtara Air (Prevention & Control of Pollution) Act n'afọ 1981.[1] Na mbụ, e nyèrè ụlọ ọrụ ahụ iwu naanị iji mezuo Iwu Mmiri. N'ikpeazụ, e nyèrè ya ikike ịmanye iwu Cess Act (Prevention & Control of Pollution) Cess Act, 1977; Water (Prevention and Control of Pollition) Cesse Rules, afọ 1978; na usoro iwu na ọkwa ndị e mèrè n'okpuru Iwu Nchedo Gbụrụ-gbúrụ Ébé Obibi, 1986.[2]

Ọdịdị ya[dezie | dezie ebe o si]

Isi ụlọ ọrụ KSPCB dị na Bangalore. KSPCB nwekwara ụlọ ọrụ mpaghara irí anọ na anọ, nwere ọ dịkarịa ala otu ụlọ ọrụ na mpaghara ọ bụla nke Karnataka.[3]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Nsogbu gburugburu ebe obibi na India

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. About Us. kspcb.gov.in. Archived from the original on 3 November 2018. Retrieved on 3 November 2018.
  2. Annual Report 2013–14: Introduction. Karnataka State Pollution Control Board. kspcb.gov.in. Archived from the original on 3 November 2018. Retrieved on 3 November 2018.
  3. List of Offices. kspcb.gov.in. Archived from the original on 4 April 2017. Retrieved on 4 April 2017.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  • Official website