Kibuka (akụkọ ifo)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Kibuka, nke a makwaara dịka Kibuuka، bụ onye otu balubaale maọbụ pantheon nke chi n'okpukpe nke ndị Baganda, ndị bi na Uganda nke oge a. A na-eche na ọ bụ chi agha.[1][2]

Ngosịpụta[dezie | dezie ebe o si]

Kibuka na-enyekarị ndị eze Baganda ndụmọdụ n'oge agha, ọrịa, nakwa ọdachi ndị ọzọ dịka ọnwụ Dịka ụfọdụ akwụkwọ si kwuo, Kibuka, dịka nwanne ya nwoke nke okenye Mukasa, bụ onye na-anwụ anwụ ma ọ rịgooro n'ọkwa chi.[3][4]

Ezinụlọ[dezie | dezie ebe o si]

Kibuka bụ nwanne nwoke obere nke Mukasa, chi nke ọganihu, ọmụmụ, na owuwe ihe ubi.[3] Ha abụọ bụ ụmụ Wanema, na ụmụ ụmụ Musisii, onye e gosipụtara dịka onye na-egosipụta ala ọma jijiji ahụ.[1]

Akụkọ ifo[dezie | dezie ebe o si]

Ọnwụ nke Kibuka[dezie | dezie ebe o si]

Dịka otu akụkọ ifo si kwuo, nna ya, Wanema, zigara Kibuka, iji nyere otu n'ime ndị eze Baganda, Nakibinge, aka, onye nọ n'etiti agha ya na ndị Bunyoro. Kibuka nyere aka chepụta atụmatụ iji merie ha, ọrụ ya bụ ịwakpo ndị agha Bunyoro site na igwe ojii. Mmeri dị nso maka ndị agha Baganda. Otu ụbọchị, ndị agha kpọtara ndị a dọọrọ n'agha n'ogige ha nʼagbanyeghị na Wanema na Kibuka dọrọ ha aka ná ntị ka ha ghara ime otú ahụ. Otu n'ime ndị a a dọọrọ n'agha bụ nwanyị nke mechara gbapụ ma kọọrọ ndị agha Bunyoro ihe ọ hụrụ nʼogige ahụ, gụnyere ọnọdụ Kibuka n'oge mwakpo. N'echi ya, ndị agha Bunyoro lụsoro ndị ndịda Baganda agha na nchọpụta nke ebe Kibuka nọ, otu n'ime ndị na-agba ụta gbayere akụ nke merụrụ Kibuk ahụ n'obi.[1][4]

E nwere ọtụtụ nsụgharị banyere ihe mere ọzọ. N'otu nsụgharị, Kibuka debere onwe ya n'elu osisi dị na Mbale Hill, Mpigi wee nwụọ n'ebe ahụ, ghọọ chi. N'ụdị ọzọ, ndị agha Bunyoro weghaara ọta ya ma mesịa nweta abumọnụ nke ọrịa na-efe efe. N'ihi ya, ndị agha weghachiri ọta ahụ n'aka Eze Nakibinge, onye liri ozu na ihe onwunwe Kibuka ma wuo ụlọ nsọ iji sọpụrụ ya. Kemgbe ahụ ọ ghọrọ chi agha. N'otu nsụgharị ọzọ, a hụghị ozu Kibuka.[3]

Edemsibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 Lynch (2010). African Mythology, A to Z (in en). Infobase Publishing. ISBN 978-1-4381-3133-7.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  2. Asante (2008-11-26). Encyclopedia of African Religion (in en). SAGE Publications. ISBN 978-1-5063-1786-1. 
  3. 3.0 3.1 3.2 Kagwa (1934). The Customs of the Baganda (in en). Columbia University Press. ISBN 978-0-231-93278-3.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":1" defined multiple times with different content
  4. 4.0 4.1 Roscoe (1907). "95. Kibuka, the War God of the Baganda.". Man 7: 161–166. DOI:10.2307/2788113. ISSN 0025-1496.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":2" defined multiple times with different content