Kimanaueze

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Kimanaueze, mgbe ụfọdụ a na-akpọ ya Na Kumanauezi ma ọ bụ Na kimanauze Kia-Tumbī Ndala, bụ dike ọdịbendị na akụkọ ifo Ambundu maọbụ Mbundu nke ndị ya bi na Angola ugbu a.[1][2] E nwere ike iji aha Kueimanaze na-arụtụaka dịka dike lụrụ nwa nwanyị nke Anyanwụ na Ọnwa, maọbụ kwa nna nke dike ahụ. Kimanaueze nke obere bụ nna onye dike ọdịbendị Ambundu ọzọ, Sudika-mbambi, na nwanne ya nwoke, Kabundungdulu.[3]

Ngosịpụta[dezie | dezie ebe o si]

A naghị egosi Kueimanaze nke okenye n'ụzọ pụtara ìhè na akụkọ ọdịnala Ambundu. Otú ọ dị, a maara na ọ bụ anụ ọhịa nwere ọtụtụ isi, Makishi, gburu ya mgbe Kimanaueze nke obere na-apụ maka azụmahịa.[3] Ka oge na-aga, Sudika-mbambi ga-egbu Makishi iji bọọ ụbọ nna nna ya.[4]

A na-egosi Kimanaueze nke obere dịka onye nwere oké ọchịchọ, nke a na-ekwu na ọ bụ n'ihi omume ya mgbe ọ chọrọ ịlụ ada anyanwụ na ọnwa.[5]

Edemsibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Entry details | Our Mythical Childhood Survey. www.omc.obta.al.uw.edu.pl. Retrieved on 2021-03-23.
  2. Smith (1940). "The Function of Folk-Tales". Journal of the Royal African Society 39 (154): 64–83. ISSN 0368-4016. 
  3. 3.0 3.1 Lynch (2010). African Mythology, A to Z (in en). Infobase Publishing. ISBN 978-1-4381-3133-7.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":1" defined multiple times with different content
  4. Sudika-Mbambi Descends to Earth (en). Oxford Reference. Retrieved on 2021-03-23.
  5. Radin (8 March 2015). African Folktales (in en). Princeton University Press. ISBN 978-1-4008-7294-7.