Kopi luwak

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Kopi luwak

 

Kopi luwak (ejikwa civet coffee mara n'olu bekee) bụ ihe ọñụñụ kọfị sitere n'anụmanụ ahụ a na-akpọ édí (civet). Ọ bụ kọfị nke nwechara mkpụrụ osisi kọfị a na-agbarighị nke ọma n'ime ya, nke anụ édí n'ata nkwụ nke mba Eshia (Paradoxurus hermaphroditus) riri ma nyụpụta ya dịka nsị. A na-apịcha mkpụrụ kọfị ndị a ka ha na-agafe n'eriri afọ edi ahụ, mgbe e mesịrị nyụpụta ya na na nsị ndị ọzọ, a na-ekpokọta ha.[1] A na-achụ ma na-ejidekarị edi nkwụ mba Eshia ndị a n'ọhịa n'ebe ọdị ukwuu ma na-erekwa ha n'ahịa maka ihe a.[2]

A na-emepụta Kopi luwak karịsịa na agwaetiti Indonesia nke Sumatra, Java, Bali, Sulawesi, na East Timor. A na-achịkọta ya n'ọtụtụ ọhịa ma ọ bụ mepụta ya n'ugbo dị n'àgwàetiti ndị dị na Philippines, ebe a na-akpọ ngwaahịa ahụ kape motit na mpaghara Cordillera, kapé alamíd na mpaghara Tagalog, kapé melô ma ọ bụ kapé musang na Mindanao, na kahawa kubing na Sulu Archipelago.[3] 'Weasel coffee' bụ nsụgharị Bekee na-enweghị isi nke aha Vietnamese ya bụ cà phê Chồn .

  1. Mahendradatta, M. (2012). Comparison of chemical characteristics and sensory value between luwak coffee and original coffee from China (Coffea arabica L) and Robusta (Coffea canephora L) varieties. Makassar: Food Science and Technology Study Program, Department of Agricultural Technology, Faculty of Agriculture, Hasanuddin University. Retrieved on 21 August 2019. 
  2. Shepherd (2012). "Observations of small carnivores in Jakarta wildlife markets, Indonesia, with notes on trade in Javan Ferret Badger Melogale orientalis and on the increasing demand for Common Palm Civet Paradoxurus hermaphroditus for civet coffee production". Small Carnivore Conservation 47: 38–41. 
  3. Ongo (2020). "Metabolomics fingerprint of Philippine coffee by SPME-GC-MS for geographical and varietal classification". Food Research International 134: 109227. DOI:10.1016/j.foodres.2020.109227. PMID 32517906.