Lagos Trade Fair Complex

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Lagos International Trade Fair Complex bụ ụlọ ahịa dị hekta narị atọ na iri ise dị n'okporo ụzọ awara awara Lagos-Badagry na-anabata ọtụtụ ndị n'azụ ahịa. E wuru ụlọ ọrụ ahụ n'afọ ndị 1970 ma mee atụmatụ ịnabata ngosi azụmahịa mba ụwa mgbe a ga-aruzu ya. N'afọ 2002, ndị na azụ ahịa ọla, tinyere ụgbọ ala na ndị ahịa ndị ọzọ si n'ahịa Balogun na Lagos Island kwagara n'ụlọ ahụ.[1] Taa, ndị ahịa dị na-anọchite anya ọtụtụ òtù azụmahịa gụnyere otu ndi azụmahịa Balogun , Ndị n'eri akụrụngwa ụgbọala na ndị otu azụmahịa igwe dị iche iche bụ(ASPMDA), na ndị na-ere ọla n'okpuru ọkọlọtọ nke Association of Progressive Traders.[2]

Ọ bụ Zoran Bojović[3] meziri ụlọ ọrụ ahụ ma Energoprojeckt wuru ya na nkwado gọọmentị Naijiria, emeghere ya n'afọ 1977 iji kwekọọ na Lagos International Trade Fair mbụ. Na mmezu, ọ bụ nnukwu ọrụ nke Energoprojekt na Naịjirịa. Ụlọ ọrụ ahụ na ndị na-emepụta ya gụnyere Bojovic rụkwara ọrụ na Kano na Yola. Rem Koolhaas kwuru na Bojovic tinyere ụfọdụ n'ime ụdị ụlọ ndị a hụrụ na Kano n'ime atụmatụ nke ụlọ ahịa ahịa.[4]

Nhazi nke ụlọ ahụ nyere aka na mmepe nke ụlọ ngosi a, e nyefekwara ụlọ ngosi a nye gọọmentị etiti ebe gọọmentị steeti nwekwara ụlọ nzukọ nke ha, ụlọ nzukọ abụọ ka enyefere nye ụlọ ọrụ Naijiria na nke mba ụwa. Ihe owuwu ndị ọzọ dị n'ime ụlọ ahụ bụ ogige ntụrụndụ na ọdọ mmiri aka mere nke dị n'akụkụ ogige ahụ, ọtụtụ chalets, ụlọ ọrụ mgbasa ozi, ụlọ ahịa na ebe mmemme.[5]

Kemgbe ọtụtụ afọ, akụrụngwa dị n'ime ụlọ ahụ bu nke n'echekwaghị nke ọma. E nyere ụlọ ọrụ onwe onye ụlọ ọrụ ahụ ikike n'afọ 2007 mana ewepụrụ nkwado ahụ n'afọ 2018.[6]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Lagos Trade Fair Complex - Crisis Looms At International Centre for Commerce", Vanguard (Lagos), May 28, 2018.
  2. Osagie. "Africa's Biggest Jewelries Market Sited At Lagos Trade Fair Complex", Thisday (Lagos), February 18, 2013.
  3. Sekulić. Constructing Non-aligned Modernity: the Case of Energoprojekt.
  4. ARCHITECTURE:Toward a Concrete Utopia-Architecture in Yugoslavia 1948-80, Part I.
  5. Sekulić (9 June 2017). "Energoprojekt in Nigeria". Southeastern Europe 41 (2): 200–229. DOI:10.1163/18763332-04102005. 
  6. "Lagos Trade Fair complex, another wasting asset", Punch Newspapers.

3.247