Lana Nusseibeh

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Lana Nusseibeh
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịUnited Arab Emirates Dezie
Aha enyereLana Dezie
aha ezinụlọ yaZaki, Nusseibeh Dezie
ŃnàZaki Nusseibeh Dezie
Ọrụ ọ na-arụdiplomat Dezie
ebe agụmakwụkwọQueens' College Dezie

Lana Zaki Nusseibeh (Arabic) bụ onye nnọchi anya mba Emirati nke na-eje ozi dị ka onye nnọchianya United Arab Emirates na United Nations kemgbe Septemba 2013.[1]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Nna Nusseibeh bụ onye ndụmọdụ onye isi ala na onye ntụgharị Zaki Nussei Beh, nna nna ya bụ onye Palestine Anwar Nusseieh.[2] O nwere nzere bachelọ na masta na akụkọ ihe mere eme site na Queens' College, Mahadum Cambridge na Master's na Israel na Jewish Diaspora Studies site na School of Oriental and African Studies, Mahadim London.[3][4]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Nusseibeh bụ onye ndụmọdụ maka UNESCO na Paris site na 2000 ruo 2001, na onye nyocha na Security and Terrorism Programme nke Gulf Research Center site na 2004 ruo 2006.[5] Ọ bụ onye isi nke International Renewable Energy Agency taskforce tupu ọ malite ịrụ ọrụ n'ime UAE Ministry of Foreign Affairs site na 2009, nke mbụ dị ka onye nduzi nke Ngalaba Atụmatụ Iwu wee bụrụ onye nnọchi anya pụrụ iche na Afghanistan na Pakistan.[3] Ọ bụ osote Sherpa maka òkè UAE na G20 na onye otu UK-UAE Ministerial Taskforce.[4]

Onye isi ala Khalifa bin Zayed Al Nahyan họpụtara Nusseibeh ka ọ bụrụ onye nnọchi anya UAE na onye nnọchianya na UN na Septemba 2013, nwanyị mbụ nọ n'ọkwa ahụ.[3][6][4] A họpụtara ya dị ka otu n'ime ndị osote onye isi oche maka nnọkọ nke 72 na 2017, na-anọchite anya otu mba Asia-Pacific.[7] Ọ bụbu onye isi oche nke UN Women Executive Board na 2017.[6][8][9] Ọ bụkwa onye isi oche nke Friends of the Future nke UN.[3] Nusseibeh bụ onye otu Board of Trustees nke Emirates Diplomatic Academy.[10]

Ọ bụ onye nnọchi anya UAE na UN mgbe UAE jụrụ ịkatọ Russia na Kansụl Nchebe UN maka mwakpo ya na Ukraine na Febụwarị 2022. Nusseibeh kwuru na ntuli aka ahụ bụ "nkwupụta mbido".[11]

Onyinye na nsọpụrụ[dezie | dezie ebe o si]

  • Onyinye nke Praịm Minista UAE (Medal of Pride)[3][12]

Akwụkwọ ndị e bipụtara[dezie | dezie ebe o si]

  • Al Dabbagh (2009). "Women in Parliament and Politics in the UAE". Women, Leadership and Development in the Middle East. 

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. The Ambassador (en-US). Permanent Mission of the United Arab Emirates to the United Nations. Archived from the original on 2021-08-04. Retrieved on 2021-08-04.
  2. Dajani (20 January 2016). Sheikh Zayed's former interpreter honoured for strengthening ties between UAE and France. The National. Archived from the original on 2 April 2019. Retrieved on 15 August 2017.
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 3.4 Permanent Mission of the United Arab Emirates to the United Nations. United Nations (18 September 2013). Archived from the original on 26 January 2021. Retrieved on 15 August 2017. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "bio" defined multiple times with different content
  4. 4.0 4.1 4.2 Nusseibeh is UAE's first female Permanent Representative to UN. Khaleej Times (19 September 2013). Archived from the original on 15 August 2017. Retrieved on 15 August 2017. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "first" defined multiple times with different content
  5. New Permanent Representative of United Arab Emirates Presents Credentials. United Nations (18 September 2013). Archived from the original on 31 May 2017. Retrieved on 15 August 2017.
  6. 6.0 6.1 Downes (24 January 2017). An Emirati Woman Will Lead the UN In Female Empowerment. Emirates Woman. Archived from the original on 9 May 2020. Retrieved on 15 August 2017.
  7. UAE envoy elected as a vice-president of UN General Assembly. GDN online. Archived from the original on 2017-08-15. Retrieved on 2017-08-15.
  8. Malek (14 February 2017). UAE's UN ambassador elected as president of UN Women Executive Board. The National. Archived from the original on 15 August 2017. Retrieved on 15 August 2017.
  9. Meet the Emirati woman leading UN on women empowerment. Al Arabiya (20 January 2017). Archived from the original on 19 November 2020. Retrieved on 15 August 2017.
  10. H.E. Ambassador Lana Nusseibeh | United Arab Emirates. www.un.int. Archived from the original on 2021-01-26. Retrieved on 2021-08-04.
  11. "At U.N., Russia vetoes U.S. resolution condemning Ukraine invasion", Washington Post, 2022.
  12. Zaatari (11 January 2017). In race to be number one, excellence is a journey, Mohammad says. Gulf News. Archived from the original on 15 August 2017. Retrieved on 15 August 2017.