Libraries in China

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Libraries in China
obere ụdị nkeÓbá akwukwo Dezie
N'ime Ọbá akwụkwọ mba China
Otu akụkụ ọbá akwụkwọ mba China
Otu ọba akwụkwọ na Mahadum China

Ọbá akwụkwọ mbụ dị na China malitere n'oge nke usoro ndị eze Shang (nke a bụ na narị afọ nke iri na isii ruo nke iri na otu BC) dị ka ndị ọgụgụ isi a maara dị ka Shi (ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme) na Wu (ndị na -ajụ ase) si na irụ ọrụ aka pụta wee malite ọrụ pụrụ iche maka okike na ịgbasa omenala. N'ime akwụkwọ ọrụ ndị a jisiri ike bụ "akwụkwọ iwu obodo, usoro ọmụmụ nke ndị ikwu alaeze, ọkwa ewepụtara na iwu dị iche iche, na ndekọọ ihe omume dị mkpa na ihe ndị sitere n'okike. Maka nkwenye na ntụnyere n'ọdịnihu, ha wuru ụlọ maka nkwakọba ihe iji debe ndekọ na mgbasa ozi dị iche iche.

Iji gboo mkpa nke ihe na agbagwoju anya karịa na iji hụ na ọ dị mfe iji rụọ ọrụ, ha malitere ịchịkọta na nhazi ndekọ ndị ahụ n'usoro n'usoro. Ya mere, ọbá akwụkwọ mbụ nke China malitere otua. Ọtụtụ ụdị mgbasa ozi dị iche iche nke juputara na ozi na ihe ọmụma nke pụtara ihe na etiti ọha mmadụ mere ka enwe echiche maka ichekwa na nchịkọta ihe ndị ahụ niile . N'ezie n'ezie, ọba akwụkwọ na ebe ndebe akwụkwọ izizi ndị mbụ sitere nkwekọrịta na nchịkọta nke ọma, usoro, na njikọta na ihe ọmụma" [1]

N'mbụ na akụkọ ihe mere eme nke China, ndị ọkà mmụta nwere ọtụtụ ọba akwụkwọ nke onwe tinyere na ndị agbụrụ ma ọ bụ usoro ndị eze wuru ọba akwụkwọ ebe ha n'edebe ihe ochie, edemede ka ha si achi tinyere akụ ha. Agbanyeghị nka, enweghị Ọbá akwụkwọ ọgbara ọhụrụ nke mbụ na China ruo ngwụcha narị afọ nke iri na itoolu; ọbụlagodi mgbe ahụ, ọrụ ọbaakwụkwọ ji nwayọ too mgbe ahụ. Na afọ 1949 ọbá akwụkwọ ọha na China dị iri ise na ise, ha kacha dị na nnukwu ododo ndị nwere ụlọ ọrụ azụmaahịa ma dị n'ụsọ oké osimiri. [2]

N'ịgbaso ntọala nke obodo China, gọọmentị na ndị isi agụmakwụkwọ gbalịsiri mbọ ike ịzụlite ọrụ ọbá akwụkwọ wee mee ka ha dị na obodo niile. Iwu Nhazi Akwụkwọ Mba nke afọ 1957 nyere ikike ka e guzobe ụlọ ọba akwụkwọ mba abụọ, otu na Beijing ( Ọbá akwụkwọ mba China ) na nke ọzọ na Shanghai (Ọbá akwụkwọ Shanghai), na mpaghara itoolu nke nwere njikọ. N'agbanyeghị nke ahụ, ọbá akwụkwọ ka dị ụkọ, ebe nke dị adị abataghị mmadụ ma n'eme naanị obere ihe. Mgbe obodo Chona nwere nghọta ma hụ na enweghị ọba akwụkwọ zuruoke ma dị nnukwu na akpọha chi aka elekere azu ma na egbochi mbọ iweta ọgbara ọhụrụ, ndị isi gọọmentị na mbido afọ 1980 nwere mmasị pụrụ iche na mmepe ọrụ ụlọ ọba akwụkwọ. Ha chọpụtara na ntinye ego na igba mbọ pụrụ iche na nke a bidoro rụpụta nnukwu ihe.

Ihe karịrị ụlọ akwụkwọ mmụta ka elu iri anọ ndị China hiwerekwara ngalaba agụm akwụkwọ maka ọrụ ọba akwụkwọ ma ọ bụ ngalaba sayensị ozi. Enwere ihe karịrị ọba akwụkwọ ọhaneze puku abụọ na narị atọ n'ime mpaghara nnukwu ogbe na China nke nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ nwee akwụkwọ nde narị abụọ na iri ise na isii. Na obere mpaghara obodo ndị nọ n'okpuru ọkwa nnukwu mpaghara obodo, enwere ebe ọdịbendị puku iri ise na atọ ndị nke nwere obere ọba akwụkwọ ma ọ bụ ụlọ ịgụ ihe.

Ná ngwụsị afọ 2004, China nwere ọbá akwụkwọ ọha nke n'ọnụ ọgụgụ ya bụ puku abụọ, narị asaa na iri nke nwere nchịkọta akwụkwọ karịrị nde narị anọ. Na afọ 2011 enwere ọba akwụkwọ ọhaneze dị puku abụọ, narị itoolu na iri abụọ na ise na n'ọnụ ọgụgụ na China. [3] N'ime ụlọ akwụkwọ mahadum ma ọ bụ kọleji, nchịkọta akwụkwọ nke Mahadum Peking na ọba akwụkwọ mahadum Zhejiang karịchasịrị. Netwọk ọbá akwụkwọ nke mba ahụ gụnyekwara ọba akwụkwọ nyocha sayensị, ọba akwụkwọ ndị otu azụmahịa, gbakwunyere ọba akwụkwọ na ụlọ ịgụ ihe ndị nke dị na ụlọ ọrụ gọọmentị, ngalaba ndị agha, ụlọ akwụkwọ praịmarị na nke sekọndrị, obodo, na ụlọ ọrụ ndị ọzọ.

Ọbá akwụkwọ mba[dezie | dezie ebe o si]

Ọbá akwụkwọ mba ahụ, National Library of China, [4] nwere nchịkọta akwụkwọ bara ụba, akwụkwọ akụkọ dị iche iche, maapụ, mbipụta, foto, ihe odide, microforms, teepu, na ihe e dere na ọla, okwute, ọkpụkpụ, na mbe dị iche iche.

Ọbá akwụkwọ mba China, nke nwere nchịkọta akwụkwọ karịrị nde iri abụọ na isii, bụ ọbá akwụkwọ kacha ukwuu na Eshia. Ọbá akwụkwọ nke a nwere nchịkọta akwụkwọ China kacha ukwuu n'ụwa niile. N'ime nchịkọta ọbá akwụkwọ ahụ, enwere ihe karịrị ọkpụkpụ eji agba afa puku iri atọ na ise, ọkpụkpụ na mbe nke ejiri mkpụrụedemede China oge ochie de ihe na ya. Ọbá akwụkwọ nke a nwekwara mpịakọta nke akwụkwọ otu nde na narị isii ejiri ụzọ ọdịnala mee nke, ihe karịrị akwụkwọ puku iri na isii sitere na Dunhuang Grottoes, mpịakọta nde iri na abụọ nke akwụkwọ asụsụ mba ọzọ, na ọtụtụ ọba data eletrọnik . [5]

Ọbá akwụkwọ ahụ malitere ịnabata ntinye nke akwụkwọ gọọmentị mba na afọ 1916, wee bụrụ ebe nchekwa data mba; ma wee malite ịnabata ntinye nke akwụkwọ eletrọnịkị nke sitere n'ime obodo China na afọ 1987. Ọ bụkwa ebe esi enweta ISSN ( International Standard Serial Number ) na Network Information na China. Ka ọ dị ugbu a, National Library of China etolitela ma nwee ọbá akwụkwọ dijitalụ tinyere njikọ ha na ihe dị ka ọba akwụkwọ iri itoolu ndị ọzọ na gburugburu mba ahụ, na-agbakọ mbọ ọnụ n'ịkwalite mmepe na itinye n'ọrụ mgbasa ozi dijitalụ nke China.

Akụkụ nke abụọ nke Ọbá akwụkwọ dijitalụ nke China nke atọrọ ntọala ya na njedebe nke afọ 2004, ka ezubere na a ga emechaa ma tinye ya n'ọrụ na ọnwa Ọktoba n'afọ 2007. Ọbá akwụkwọ a nke agbasara aka wee zube ga -enwe ike gboo mkpa nchekwa akwụkwọ maka afọ iri atọ sochirinụ. Ọbá akwụkwọ Dijitalụ nke a ga -eme ka ọ bụrụ nnukwu ụlọ nchịkọta akwụkwọ ọgụgụ China kacha ukwuu n'ụwa na ntọala akụ dijitalụ, yana ntọala ọrụ netwọkụ kachasị elu na China.

Ọbá akwụkwọ ndị ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

Ọbá akwụkwọ ọchịchị obodo Shanghai, otu n'ime ọba akwụkwọ ọha kacha ibu na mba ahụ, nwere ihe karịrị nde asaa. N'ime nkea, ọfọrọ nke nta ka akwụkwọ n'asụsụ mba ọzọ rụo otu nde. Ọbá akwụkwọ Shanghai, nke amaara nke ọma n'ụlọ na mba ofesi, bụ ọbá akwụkwọ mpaghara China kacha ukwuu. N'ime mkpokọta ya, ihe karịrị otu nde, na narị asaa bụ akwụkwọ ochie bụkwara ihe kacha baa uru, gụnyere akwụkwọ puku abụọ na puku ise ndị nke dị ochie na -adịghị ahụkebe na mpịakọta otu narị na asaa puku asatọ, ọtụtụ n'ime ha bụ naanị mbipụta dị n'ụwa niile. Akwụkwọ kacha ochie malitere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ otu puku na narị ise gara aga.

ọba akwụkwọ na Mahadum Wuhan, China

Ọbá akwụkwọ mahadum Peking weghaara mkpokọta ọbá akwụkwọ mahadum Yanjing nke bụ otu n'ime ọba akwụkwọ mahadum kacha mma na mba ahụ na afọ 1950 ya n'etiti afọ 1980- ebe enwere ihe karịrị akwụkwọ nde atọ, otu ụzọ n'ụzọ anọ n'ime ha bụ akwụkwọ dị n'asụsụ mba ọzọ. Ọ bụ otu n'ime Ọbá akwụkwọ ọgbara ọhụrụ ọhụụ na China. Ndị Kansụl Steeti kwadoro ka ọ bụrụ ngalaba izizi nke nchekwa akwụkwọ mgbe ochie nke mba, nke ga etolitela ka ọba akwụkwọ nyocha bara ụba, nke ọgbara ọhụrụ. [6]

Nnukwu ọba akwụkwọ dị na mpaghara[dezie | dezie ebe o si]

  • Ọbá akwụkwọ Anhui安徽省图书馆
  • Ọbá akwụkwọ ukwu na Beijing
  • Ọbá akwụkwọ Chongqing重庆市图书馆
  • Ọbá akwụkwọ Fujian福建省图书馆
  • Ọbá akwụkwọ Gansu甘肃省图书馆
  • Ọbá akwụkwọ Guangdong广东省图书馆
  • Ọbá akwụkwọ nke Guangxi Zhuang Autonomous Region广西壮族自治区图书馆
  • Ọbá akwụkwọ Guizhou贵州省图书馆
  • Ọbá akwụkwọ Hainan海南省图书馆
  • Ọbá akwụkwọ Hebei河北省图书馆
  • Ọbá akwụkwọ Heilongjiang黑龙江省图书馆
  • Ọbá akwụkwọ Henan河南图书馆
  • Ọbá akwụkwọ mpaghara Hubei湖北省图书馆
  • Ọbá akwụkwọ Hunan湖南省图书馆
  • Ọbá akwụkwọ nke mpaghara Mongolia Kwurula内蒙古自治区图书馆
  • Ọbá akwụkwọ Jiangxi江西省图书馆
  • Ụlọ akwụkwọ Jilin吉林省图书馆
  • Ọbá akwụkwọ 辽宁省图书馆
  • Ọbá akwụkwọ Nanjing南京圖書館
  • Ọbá akwụkwọ nke Ningxia Hui Autonomous Region宁夏回族自治区图书馆
  • Ọbá akwụkwọ Qinghai青海省图书馆
  • Ọbá akwụkwọ Shaanxi陕西省图书馆
  • Ọbá akwụkwọ Shandong山东省图书馆
  • Shanghai Library上海市图书馆
  • Ọbá akwụkwọ Shanxi山西省图书馆
  • Ọbá akwụkwọ Sichuan四川省图书馆
  • Ọbá akwụkwọ Tianjin天津市图书馆
  • Ọbá akwụkwọ Tibet Autonomous Region西藏自治区图书馆
  • Ọbá akwụkwọ nke Xinjiang Uygur Autonomous Region新疆自治区图书馆
  • Ọbá akwụkwọ Yunnan云南省图书馆
  • Ọbá akwụkwọ Zhejiang浙江省图书馆

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ọbá akwụkwọ etiti Hong Kong
  • Nhazi ọkwa ọba akwụkwọ China (CLC)
  • Ebe ndebe ihe na ndị mmadụ Republic of China
  • Ụlọ akwụkwọ Ọbá akwụkwọ Boone
  • Omenala nke ndị mmadụ Republic of China
  • Mmụta na ndị mmadụ Republic of China

Ntụrụaka[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. Hua, Xie Zhuo (1996). Libraries and the development of culture in China. "Libraries & Culture", No. 3/4, pp. 533.
  2. Zhixian Yi. History of Library Developments in China. IFLA. IFLA. Retrieved on 5 March 2021.
  3. Statistical Communiqué on the 2011 National Economic and Social Development. stats.gov.cn. National Bureau of Statistics of China (22 February 2012). Archived from the original on 6 August 2012. Retrieved on 5 September 2012.
  4. Official site of the National Library of China. Users can search database of books, periodicals, and statistical yearbooks.
  5. Benzin. "National Library Of China – Largest In Asia", Red Duck Post, 11 September 2017. Retrieved on 5 March 2021.
  6. Lib.pku.edu.cn. (2017). Overview and History | Beijing University Library. [online] Available at: http://www.lib.pku.edu.cn/portal/bggk/bgjs/lishiyange [Accessed 16 Mar. 2017].

Àtụ:Loc[1]

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]